Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then our Father blessed Noah and his sons, saying, "Be fruitful and multiply and fill the earth. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa.
2 Every animal of the earth, every bird of the sky, everything that crawls on the ground, and every fish of the sea will fear and dread you; they are given into your hand. Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka.
3 Every living, moving thing will be your food. As I gave you the green plants, I now give you everything. Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile.
4 But you must not eat meat that still has its lifeblood in it. “Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.
5 I will surely demand an accounting for your blood: from every animal I will demand it, and from every person—each for his brother's life—I will demand a human life. Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya.
6 Whoever sheds human blood, by humans will their blood be shed; for in the image of God, humanity was made. “Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ, nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya, nʼihi nʼoyiyi Chineke ka Chineke mere mmadụ.
7 As for you, be fruitful and multiply; swarm across the earth and multiply on it." Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.”
8 Then our Father said to Noah and to his sons with him: Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị,
9 "As for me, I am now establishing my covenant with you and with your descendants after you, “Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu,
10 and every living creature with you—birds, livestock, every wild animal of the earth—all that came out of the ark with you, every living thing of the earth. na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa.
11 I set my covenant with you: never again will all flesh be cut off by floodwaters; never again a flood to destroy the earth." Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.”
12 Then our Father said, "This is the sign of the covenant I'm making between me and you and every living creature with you, for all generations to come: Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu.
13 I have put my rainbow in the clouds as the sign of the covenant between me and the earth. Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.
14 Whenever I bring clouds over the earth and the rainbow appears in the clouds, Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe,
15 I will remember my covenant between me and you and every living creature of every kind: never again will floodwaters destroy all life. aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.
16 When the rainbow is in the clouds, I will see it and remember the everlasting covenant between me and every living creature of every kind on earth." Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.”
17 So our Father told Noah, "This is the sign of the covenant I've established between me and all life on earth." Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.”
18 Noah's sons who left the ark: Shem, Ham, and Japheth. (Ham was Canaan's father.). Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.)
19 These three were the sons of Noah, and from them the whole earth was populated. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.
20 Noah, a man of the soil, was the first to plant a vineyard. Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige.
21 When he drank some of its wine, he became drunk and lay uncovered inside his tent. Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya.
22 Ham, the father of Canaan, saw his father naked and told his two brothers outside. Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ.
23 Shem and Japheth took a cloak, laid it on both their shoulders, walked in backward, and covered their father's nakedness; their faces were backward, so they did not see their father's nakedness. Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya.
24 When Noah awoke from his wine and learned what his youngest son had done to him, Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere,
25 he said, "Cursed be Canaan! He will be the lowest of servants to his brothers." o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.”
26 He also said, "Blessed be the Father of Shem; may Canaan be Shem's servant. Ọ sịkwara, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem. Ka Kenan bụrụ ohu Shem.
27 May our Father extend Japheth's territory; may Japheth dwell in the tents of Shem, and may Canaan be Shem's servant." Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara, ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem, meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.”
28 After the flood Noah lived 350 years. Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ.
29 Noah lived a total of 950 years, and then he died. Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]