Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The serpent was shrewder than any field animal our Father had made. He asked the woman, "Did God really say, 'You must not eat from any tree in the garden'?" Agwọ dị aghụghọ karịa ụmụ anụ ọhịa niile Onyenwe anyị Chineke kere. Ọ bịakwutere nwanyị ahụ sị ya, “Ọ bụ ezie na Chineke sị unu erila mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a?”
2 The woman said to the serpent, "We may eat the fruit from the trees in the garden, Nwanyị ahụ zara sị ya, “Anyị nwere ike rie mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a
3 but God said, 'Don't eat the tree's fruit in the garden's middle, or touch it, or you'll die.'" ma Chineke kwuru sị, ‘Unu erila mkpụrụ si nʼosisi dị nʼetiti ogige a, unu emetụkwala ya aka, ka unu ghara ịnwụ.’ ”
4 But the serpent said to the woman, "You will certainly not die. Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ.
5 God knows that when you eat from it, your eyes will open and you'll be like God, knowing good and evil." Nʼihi na Chineke maara na ọ bụrụ na unu erie ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-amata ezi ihe na ajọ ihe.”
6 The woman saw the tree was good for food, delightful to the eyes, and desirable for wisdom. She took its fruit, ate, gave some to her husband with her, and he ate. Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie.
7 Then the eyes of both of them were opened, and they knew they were naked; they sewed fig leaves together and made themselves coverings. Mgbe ahụ, anya ha abụọ meghere, ha chọpụtara na ha gba ọtọ. Ya mere, ha dụkọtara ahịhịa fiig, jiri ya mere onwe ha akwa.
8 They heard the sound of our Father walking in the garden in the cool of the day, and the man and his wife hid from his presence among the garden's trees. Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị Onyenwe anyị Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ.
9 But our Father called to the man and said to him, "Where are you?" Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?”
10 The man said, "I heard you in the garden and was afraid, for I was naked, so I hid." Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.”
11 Our Father said, "Who told you you're naked? Did you eat from the tree I forbade you to eat from?" Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?”
12 The man said, "The woman you put with me gave me fruit from the tree, and I ate." Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”
13 Then our Father asked the woman, "What have you done?" She said, "The serpent deceived me, and I ate." Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.”
14 So our Father said to the serpent, "Because you have done this, cursed are you above all livestock and above all wild animals; on your belly you will go, and dust you will eat all the days of your life. Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
15 And I will put enmity between you and the woman, and between your offspring and her offspring; he will crush your head, and you will strike his heel." Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
16 To the woman he said, "I will greatly increase your pain in childbirth; in pain you will give birth to children. Your desire will be for your husband, and he will rule over you." Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya, “Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu, ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị. Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị, ọ bụ ya ga-achịkwa gị.”
17 And to Adam he said, "Because you listened to your wife and ate from the tree that I commanded you, saying, 'You must not eat from it,' cursed is the ground because of you; through painful toil you will eat from it all the days of your life. Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’ “Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị, site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
18 It will produce thorns and thistles for you, and you will eat the plants of the field. Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
19 By the sweat of your brow you will eat your bread until you return to the ground, since from it you were taken; for dust you are, and to dust you will return." Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.”
20 The man named his wife Eve, because she would become the mother of all the living. Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
21 Our Father made garments of skin for Adam and his wife, and he clothed them. Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi.
22 Then our Father said, "Look, the man has become like one of us, knowing good and evil. Now, so he doesn't reach out, take from the tree of life too, eat, and live forever…" Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
23 So our Father sent him out of the garden of Eden to work the ground he was taken from. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya.
24 He drove out the man and placed cherubim and a whirling, flaming sword east of Eden's garden, guarding the way to the tree of life. Mgbe ọ chụpụrụ mmadụ, o dochiri nʼọwụwa anyanwụ nke ogige Iden ndị mmụọ ozi dị ike a na-akpọ Cherubim, na mma agha na-acha ọkụ, ka ha na-eche ọnụ ụzọ e si aba nʼebe osisi ahụ na-enye ndụ dị nche.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]