Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So the heavens and the earth were completed in all their vast array. Otu a ka e si rụzuo ọrụ ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị nʼime ha.
2 By the seventh day our Father had completed his work, and he rested on the seventh day from everything he had made. Nʼụbọchị nke asaa, Chineke kwụsịrị ọrụ ya nke ọ na-arụ, o zukwara ike site nʼọrụ ya niile.
3 And our Father blessed the seventh day, making it holy, because on it he rested from all the work of creation he had done. Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ mee ya ka ọ bụrụ ụbọchị dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nʼụbọchị ahụ ka ọ zuru ike site nʼọrụ nke ike ihe niile.
4 This is the history of the heavens and the earth when they were created, when our Father made earth and heavens. Nke a bụ akụkọ banyere usoro okike eluigwe na ụwa mgbe e kere ha, nʼụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị Chineke kere eluigwe na ụwa.
5 No shrub of the field yet existed on the earth, no plant of the field had yet sprouted, for our Father had not sent rain on the earth, and there was no man to work the ground, Ahịhịa ọbụla epupụtabeghị nʼọhịa, o nwekwaghị ihe ubi ọbụla sitere nʼala pupụta, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo nʼelu ụwa, o nwekwaghị mmadụ ọbụla nọ na-arụ ọrụ ubi,
6 but springs came up from the earth and watered the whole surface of the ground. ma mmiri si nʼala na-asọpụta na-asọ nʼelu ala niile.
7 Then our Father formed the man from dust of the ground, breathed into his nostrils the breath of life, and the man became a living person. Onyenwe anyị Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ.
8 Then our Father planted a garden in Eden, in the east, and put there the man he had formed. Onyenwe anyị Chineke kụrụ ubi a gbara ogige nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼIden. O tinyere mmadụ ahụ ọ kpụrụ nʼime ubi a.
9 From the ground our Father grew every tree lovely to see and good to eat, with the tree of life in the garden's center and the tree of knowing good and evil. Onyenwe anyị Chineke mere ka osisi dị iche iche si nʼala pupụta, osisi ndị dị mma ile anya na nke dịkwa mma iri eri. Nʼetiti ogige a, e nwere osisi na-enye ndụ, na osisi nke ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ.
10 A river flowed from Eden to water the garden; from there it divided into four rivers. E nwere iyi si nʼIden na-asọpụta na-asọbanye nʼime ogige ahụ ime ka ala ahụ nwee mmiri. Site nʼebe ahụ, iyi a kewara nwee ngalaba anọ.
11 The first is named Pishon; it flows around all the land of Havilah, where gold is found. Aha ngalaba nke mbụ bụ Paịshọn. Ọ sọọrọ ogologo gafee ala niile nke Havila, ebe a na-enweta ọlaedo.
12 The gold of that land is good; aromatic resin and onyx are also there. (Ọlaedo dị nʼala ahụ mara mma. Eso osisi na-esi isi ụtọ na nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ ọniks dịkwa nʼebe ahụ.)
13 The name of the second river is the Gihon; it winds through the entire land of Cush. Aha ngalaba nke abụọ bụ Gaihọn. O sitere nʼala Kush gafee.
14 The third river's name is Tigris, flowing east of Assyria. The fourth river is the Euphrates. Aha osimiri nke atọ bụ Taịgris. Ọ na-asọla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Ashọ. Aha osimiri nke anọ bụ Yufretis.
15 Our Father took the man and set him in the garden of Eden to work it and guard it. Onyenwe anyị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya.
16 And our Father commanded the man, "You are free to eat from any tree in the garden; Onyenwe anyị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a,
17 but you must not eat from the tree of knowledge of good and evil, for you will surely die the day you eat from it." ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.”
18 Then our Father said, "It is not good for the man to be alone. I will make a helper matching him." Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”
19 From the ground our Father formed every field animal and every sky bird, then brought each to the man to see what he'd name it. Whatever the man named each living creature, that was its name. Onyenwe anyị Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya.
20 The man named all livestock, birds of the sky, and all wild animals, but for Adam no helper matching him was found. Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha. Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya.
21 So our Father made the man fall into a deep sleep, and while he slept, took one of his ribs and closed the flesh over it. Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya.
22 Then our Father built a woman from the rib he took from the man, and brought her to the man. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.
23 The man said, "At last! This is bone of my bones and flesh of my flesh; she will be called 'woman,' for she was taken out of man." Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.”
24 So a man leaves his father and mother, joins his wife, and they become one flesh. Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
25 The man and his wife were both naked, and they were not ashamed. Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]