Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Genesis 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the beginning, our Heavenly Father created the heavens and the earth. Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa.
2 The earth was formless and empty; darkness lay over the deep's surface, and the Spirit of our Father was hovering over the waters' surface. Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ.
3 Then our Father said, "Let there be light," and there was light. Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara.
4 He saw that the light was good, and he separated the light from the darkness. Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
5 He called the light "day" and called the darkness "night." There was evening, and there was morning—the first day. Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ.
6 And our Father said, "Let there be an expanse between the waters to separate water from water." Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ”
7 He made the expanse and separated the water under it from the water above it. And it was so. Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị.
8 He called the expanse "sky." So there was evening, and there was morning—the second day. Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ.
9 Then our Father said, "Let the water under the sky be gathered to one place, and let dry ground appear." And it was so. Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị.
10 He named the dry ground "land," the gathered waters "seas." And he saw it was good. Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma.
11 Then he said, "Let the land grow vegetation: seed-bearing plants, fruit trees bearing fruit with seed in it, after its kind." And it was so. Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị.
12 The land produced vegetation—seed-bearing plants by kind, and trees bearing seed-bearing fruit by kind—and our Father saw that it was good. Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
13 And there was evening, and there was morning—the third day. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ.
14 And our Father said, "Let there be lights in the sky's expanse to separate day from night, and serve as signs to mark seasons, days, and years, Chineke kwuru sị, “Ka ìhè nke na-enye ìhè dịrị na mbara eluigwe, ikewapụ ehihie site nʼabalị. Ka ha bụrụ ihe ama igosi oge dị iche iche, ụbọchị dị iche iche, na afọ dị iche iche.
15 and let them be lights in the sky's expanse, to give light on the earth." And it was so. Ka ha bụrụ ìhè na mbara eluigwe inye ìhè nʼelu ụwa.” O si otu a dịrị.
16 Our Father made two great lights—the greater light to rule the day, the lesser light to rule the night. He also made the stars. Chineke mere ìhè ukwu abụọ, nke kacha ịdị ukwu ka ọ bụrụ nke ga-achị ehihie, ma nke dị nta ka ọ bụrụ nke ga-achị abalị. O mekwara kpakpando dị iche iche.
17 He set them in the expanse of the sky to give light on the earth, Chineke debere ha na mbara eluigwe inye ìhè nʼụwa,
18 to rule the day and the night, and to separate light from darkness. He saw it was good. ịchị ehihie na abalị na ịkpa oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
19 So there was evening, and there was morning—the fourth day. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke anọ.
20 Then our Father said, "Let the water swarm with living creatures, and let birds fly above the earth, across the sky's expanse." Chineke kwuru sị, “Ka mmiri jupụta nʼihe ndị na-eku ume, ka ụmụ anụ ufe fegharịkwa nʼelu ụwa, ma nʼelu mbara igwe.”
21 So he created the great sea creatures, every living creature that moves and swarms in the water by its kind, and every winged bird by its kind. And he saw it was good. Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
22 Our Father blessed them and said, "Be fruitful, multiply, fill the waters in the seas, and let birds multiply on earth." Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.”
23 And there was evening, and there was morning—the fifth day. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise.
24 And our Father said, "Let the land produce living creatures by kind: livestock, crawling creatures, and wild animals, each by kind." And it was so. Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị.
25 He made wild animals by their kind, livestock by their kind, and every creature crawling the ground by its kind. And he saw that it was good. Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
26 Then our Father said, "Let us make humanity in our image, in our likeness, to rule the fish of the sea, the birds of the sky, the livestock, all the earth, and every creature crawling on the ground." Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.”
27 So our Father created humanity in his own image; in the image of God he created them; male and female he created them. Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.
28 Our Father blessed them and said to them, "Be fruitful, multiply, fill the earth and subdue it. Rule the fish of the sea, the birds of the sky, and every living creature that moves on the earth." Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”
29 Then he said, "I give you every seed-bearing plant across the whole earth, and every tree with seed-bearing fruit—they will be your food. Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị.
30 To every animal of the earth, every bird of the sky, everything crawling on the ground with breath of life, I give every green plant for food." And so it happened. Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.”
31 Our Father saw all he had made, and it was very good. So there was evening, and there was morning—the sixth day. Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]