Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Exodus 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now a man from the house of Levi went and married a daughter of Levi. Nʼoge a, otu nwoke onye Hibru si nʼebo Livayị, gakwara lụọ otu nwaada onye Livayị.
2 The woman conceived and bore a son; seeing he was healthy, she hid him three months. Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ.
3 Unable to hide him longer, she got a papyrus basket, coated it with tar and pitch, put the child in, and set it among the reeds on the Nile's bank. Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto.
4 His sister stood at a distance to see what would happen to him. Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya.
5 Pharaoh's daughter went down to bathe at the Nile, her maids walking along the Nile. She saw the basket among the reeds, sent her maid to get it. Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya.
6 She opened it, saw the child—a baby boy, crying. Her heart went out to him, and she said, "This is one of the Hebrew children." Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.”
7 His sister asked Pharaoh's daughter, "Should I call a Hebrew woman to nurse the child for you?" Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?”
8 "Yes, go," Pharaoh's daughter answered. So the girl went and called the child's mother. Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ.
9 Pharaoh's daughter told her, "Take this child and nurse him for me; I'll pay your wages." The woman took the child and nursed him. Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya.
10 The boy grew; she brought him to Pharaoh's daughter, who adopted him, naming him Moses: "Because I drew him from the water." Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.”
11 In those days Moses grew up, went out to his people, saw their burdens, and saw an Egyptian striking a Hebrew, one of his relatives. Otu ụbọchị, mgbe Mosis toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya.
12 He glanced around and, seeing no one, killed the Egyptian and hid him in the sand. Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja.
13 Next day he went out, saw two Hebrews fighting, and asked the offender, "Why hit your companion?" Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?”
14 He said, "Who made you ruler and judge over us? Are you thinking of killing me as you killed the Egyptian?" Moses was afraid and thought, "Indeed, the matter is known." Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.”
15 Pharaoh heard and sought to kill Moses; he fled from Pharaoh, settled in the land of Midian, and sat by a well. Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri.
16 Midian's priest had seven daughters; they came to draw water and fill the troughs to water their father's flock. Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri.
17 When the shepherds came and drove them away, Moses got up, rescued them, and watered their flock. Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri.
18 When they returned to their father Reuel, he asked, "Why have you come back so early today?" Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?”
19 They said, "An Egyptian saved us from the shepherds, even drew us water and watered the flock." Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.”
20 "Where is he?" he asked his daughters. "Why did you leave the man? Call him to eat." Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.”
21 Moses agreed to stay with the man, who gave his daughter Zipporah to Moses in marriage. Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.
22 She bore a son; Moses named him Gershom, saying, "I have been a foreigner in a foreign land." Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.”
23 Long after, Egypt's king died. Israel's sons groaned from slavery, cried out; their cry rose to our Father from slavery. O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị.
24 Our Father heard their groaning, and he remembered his covenant with Abraham, with Isaac, and with Jacob. Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara.
25 Our Father looked on the Israelites, and he understood. Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]