Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Exodus 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 These are the names of Israel's sons who came to Egypt with Jacob, each with his household: Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ndị sooro Jekọb gaa biri nʼala Ijipt, onye ọbụla nʼime ha kpọ ezinaụlọ ya.
2 Reuben, Simeon, Levi, and Judah, Ruben, Simiọn, Livayị na Juda;
3 Issachar, Zebulun, and Benjamin, Isaka, Zebụlọn na Benjamin;
4 Dan and Naphtali, Gad and Asher. Dan, na Naftalị; Gad na Asha.
5 All who descended from Jacob were seventy people; Joseph was already in Egypt. Ọnụọgụgụ ụmụ Jekọb ndị sooro ya gaa biri nʼIjipt dị iri mmadụ asaa. Ma Josef nọrịị nʼIjipt.
6 Then Joseph died, and all his brothers, and all that generation. Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara.
7 But Israel's people were fruitful, swarmed, multiplied, and grew immensely strong, till the land was filled with them. Ma ihe gaara ụmụ ụmụ Izrel nke ọma, ha mụbara, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụta ala ahụ niile.
8 Now a new king came to power in Egypt, who did not know Joseph. Ma mgbe eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị ọchịchị nʼala Ijipt,
9 He said to his people, "Look, the Israelites are more numerous and powerful than we are. ọ sịrị ndị ya, “Lee, ndị Izrel abaala ụba nke ukwuu nʼọnụọgụgụ dịkwa ike karịa anyị.
10 Come, let's deal shrewdly with them, or they'll multiply, and if war comes, they'll join our enemies, fight us, and leave the land." Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.”
11 So they set taskmasters over them to crush them with forced labor, building Pharaoh's supply cities: Pithom and Rameses. Nʼihi nke a, ha tinyere ndịisi ohu ga na eledo ha, bụ ndị ga-eji ọrụ mmanye kpagbuo ha. Ha wuuru Fero obodo Payitọm na Ramesis, ebe ọ na-echekwa ihe.
12 But the more the Egyptians oppressed them, the more the Israelites multiplied and spread out, until the Egyptians dreaded Israel's people. Ma dịka a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ na-eleghị anya nʼazụ, otu a kwa ka ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba nʼọnụọgụgụ na-agbasakwa. Nke a mere ka ndị Ijipt tụọ ndị Izrel egwu.
13 So the Egyptians ruthlessly made the people of Israel work as slaves. Ha ji oke ọrụ mekpaa ụmụ Izrel ahụ nke ukwuu,
14 They made their lives bitter with hard labor in mortar and brick and all kinds of field work. In all their harsh labor the Egyptians worked them ruthlessly. mee ka ndụ ụmụ Izrel bụrụ ndụ jupụtara nʼihe ilu. Ha nyere ha ọrụ ike nke ịkpụ brik na ụrọ, tinyere ọrụ dị iche iche nʼubi ha. Nʼime ọrụ niile ha na-arụ, ndị Ijipt mesiri ha ike nke ukwuu.
15 Then the king of Egypt said to the Hebrew midwives, one named Shiphrah and the other Puah, Mgbe ahụ kwa, eze Ijipt gwara ndị inyom Hibru na-aghọ nwa, ndị aha ha bụ Shifra na Pua sị,
16 "When you assist the Hebrew women in childbirth, watch at the birthstool: if it's a son, kill him; but if a daughter, let her live." “Mgbe ọbụla unu na-aghọ nwa ndị inyom Hibru, unu lezie anya nʼokwute e ji amụ nwa, ọ bụrụ nwoke, gbuonụ ya, ma ọ bụrụkwanụ nwanyị, hapụnụ ya ka ọ dịrị ndụ.”
17 But the midwives feared our Heavenly Father and did not do as Egypt's king commanded them; they let the boys live. Ma ndị inyom ndị a na-aghọ nwa emeghị ihe eze Ijipt gwara ha, nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke. Kama ha hapụrụ ụmụ ndị ikom ndị a ndụ.
18 So the king of Egypt called the midwives and said to them, "Why have you done this, letting the boys live?" Emesịa, eze Ijipt kpọrọ ndị inyom abụọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji nupu isi nʼiwu m nyere unu site nʼịhapụ igbu ụmụntakịrị ndị ikom Hibru a mụrụ, dịka m gwara unu?”
19 The midwives told Pharaoh, "Hebrew women aren't like Egyptian women—they're vigorous, giving birth before the midwife arrives." Ndị inyom ahụ zara Fero sị, “Ndị inyom Hibru na-adị ike karịa ndị inyom Ijipt nʼịmụ nwa. Ha na-amụpụtacharị ụmụ ha tupu anyị erute.”
20 So our Father was good to the midwives, and the people multiplied and grew very strong. Ya mere, Chineke gọziri ndị inyom ndị ahụ na-aghọ nwa. Ụmụ Izrel gara nʼihu na-amụba, ghọọ mba dị ukwuu.
21 And because the midwives feared our Father, he gave them households of their own. Chineke nʼonwe ya, nyekwara ndị inyom ahụ na-aghọ nwa ezinaụlọ nke aka ha nʼihi na ha tụrụ egwu Chineke.
22 Then Pharaoh commanded all his people, "Throw every son born to the Hebrews into the Nile, but let every daughter live." Mgbe ahụ, Fero nyere ndị ya niile iwu a, “A ga-atụnye ụmụntakịrị ndị ikom Hibru niile a mụrụ ọhụrụ nʼime osimiri Naịl, ma a ga-edebe ụmụntakịrị ọhụrụ bụ ndị inyom ndụ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]