Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Exodus 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Moses was shepherding the flock of his father-in-law Jethro, priest of Midian. He led the flock to the far side of the wilderness and came to Horeb, the mountain of our Father. Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke.
2 There the messenger of our Father appeared to him in a fire flaming from within a bush. Moses looked: the bush was blazing but not consumed. Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ.
3 Moses said, "Let me go over and see this extraordinary sight—why the bush isn't burning up." Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.”
4 When our Father saw he had turned aside to look, he called to him from within the bush, "Moses, Moses!" Moses said, "Here I am." Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!” Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.”
5 He said, "Don't come closer. Take your sandals off your feet, for the ground you're standing on is holy." Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.”
6 He said, "I am your Father, the God of Abraham, of Isaac, and of Jacob." Moses hid his face, for he was afraid to look at our Father. Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya.
7 Then our Father said, "I have truly seen my people's suffering in Egypt, heard their cry under their slave drivers, for I know their hardships. Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, ahụla m nhụju anya nke ndị m nọ nʼIjipt, anụkwala m mkpu akwa ha, nʼihi aka ike nke ndị na-achị ha dịka ndị ohu. Nʼihi na ama m ahụhụ ha na-agabiga.
8 So I've come down to rescue them from Egypt's grip and bring them up from that land to a good, spacious land—a land flowing with milk and honey—to the place of the Canaanites, Hittites, Amorites, Perizzites, Hivites, and Jebusites. Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi.
9 Now the cry of Israel's people has reached me, and I've seen the oppression the Egyptians oppress them with. Ugbu a, akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụkwala m otu ndị Ijipt si na-emegbu ha.
10 Now go—I'm sending you to Pharaoh, to bring my people, Israel's sons, out of Egypt." Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.”
11 Moses said to our Father, "Who am I to go to Pharaoh and bring the Israelites out of Egypt?" Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?”
12 He said, "I will surely be with you. This is your sign that I have sent you: when you bring the people out of Egypt, you will worship your Father on this mountain." Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”
13 Then Moses said to our Father, "If I go to Israel's people and tell them, 'The God of your fathers sent me to you,' and they ask me, 'What is his name?'—what do I tell them?" Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?”
14 Our Father told Moses, "I AM WHO I AM." Then he said, "Tell the Israelites: 'I AM has sent me to you.'" Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’ ”
15 Our Father also told Moses, "Tell the Israelites: 'Your Father—the God of Abraham, Isaac, and Jacob—has sent me to you.' This is my name forever, and how I am remembered in every generation. Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “Onyenwe anyị, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.” Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, aha nke e ji echeta m site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
16 Go, gather Israel's elders and tell them: your Father—the God of Abraham, Isaac, and Jacob—appeared to me and said: I have surely watched over you, and seen what is done to you in Egypt, “Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt.
17 I have promised to bring you up out of Egypt's misery to the land of the Canaanites, the Hittites, the Amorites, the Perizzites, the Hivites, and the Jebusites—a land flowing with milk and honey. Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’
18 They will listen to you. You and Israel's elders must go to Egypt's king and tell him, 'the Father of the Hebrews has met us. Now please let us travel three days into the wilderness to sacrifice to our Father.' “Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’
19 But I know Egypt's king won't let you go unless by a mighty hand. Amaara m rịị na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa, tutu ruo mgbe e ji aka ike kwagide ya.
20 I will reach out my hand and strike Egypt with all the wonders I do there; then he will release you. Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.
21 I will make the Egyptians favor this people, so when you leave, you won't go empty-handed. “Aga m emekwa ka unu nweta amara nʼihu ndị Ijipt, ka unu ghara ịgba aka mgbe unu na-ala.
22 Each woman must ask her neighbor and the woman living in her house for silver and gold items and clothing, and dress your sons and daughters with them. So you will plunder the Egyptians." Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]