Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Darius appointed 120 satraps over the kingdom, stationed throughout the whole kingdom, Ọ dị Daraiọs mma ịhọpụta ndịisi dị otu narị na iri abụọ, ndị ga-anọ nʼalaeze ahụ niile dịka ndị nnọchite anya eze.
2 and three officials over them, one of them Daniel, so the satraps would answer to them and the king lose nothing. O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze.
3 Daniel outshone the administrators and satraps, because an extraordinary spirit was in him, and the king planned to set him over the whole kingdom. Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile.
4 Administrators and satraps sought grounds to charge Daniel over the kingdom, but found none—no corruption—since he was faithful; no negligence or corruption was found in him. Nʼihi nke a, ndịisi ọkwa ha dị elu na ndịisi ndị ọzọ bidoro chọwa mkpesa ha ga-enye iji megide Daniel nʼihe gbasara ọchịchị. Ma ọ dịghị ihe ebubo ọbụla maọbụ omume ọjọọ ọbụla ha chọpụtara, nʼihi na ọ kwesiri ntụkwasị obi. Ọ dịghịkwa omume ọjọọ maọbụ nke aghụghọ ọbụla a chọpụtara nʼọrụ ya.
5 Then these men said, "We'll find no charge against Daniel unless we find one in his God's law." Nʼikpeazụ, ndị ikom a sịrị, “O nweghị otu anyị ga-esi chọta ihe a ga-eji boo nwoke a bụ Daniel ebubo, karịakwa nʼihe metụtara iwu ofufe Chineke ya.”
6 So the administrators and satraps went together to the king and said, "King Darius, live forever! Ya mere, ndịisi ndị a na ndị ozi ndị ahụ kpebiri jekwuru eze ahụ sị ya, “Eze Daraiọs, dịrịkwa ndụ ruo mgbe niile!
7 All the kingdom's administrators, prefects, satraps, counselors, and governors agreed the king should issue a royal statute and firm decree: whoever petitions any god or man but you, king, for thirty days, will be thrown into the lions' den. Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm.
8 Now, king, issue the decree and sign it in writing, unalterable, under the law of the Medes and Persians, which cannot be revoked. Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.”
9 So King Darius signed the document and the ordinance." Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.
10 Learning the decree was signed, Daniel went home to his upstairs room, windows open toward Jerusalem, knelt three times daily, and prayed, giving thanks before his Father as always. Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ.
11 Then these men came together and found Daniel praying and pleading for mercy before his Father. Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ.
12 They approached the king about the decree: "Did you not sign a decree that for thirty days, anyone petitioning any god or man except you, king, would be thrown into the lions' den?" The king answered, "The matter stands, by the law of the Medes and Persians, unchangeable." Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?” Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.”
13 They told the king, "Daniel, one of Judah's exiles, ignores you, king, and your signed decree—praying three times daily." Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.”
14 Hearing this, the king was deeply troubled, determined to save Daniel, and worked until sunset to rescue him. Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a.
15 Then these men gathered before the king and said, "Know, king: by law of the Medes and Persians, no decree or edict the king issues can be changed." Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.”
16 Then the king gave the command, and they brought Daniel and threw him into the lions' den. The king said to Daniel, "May your God, whom you serve continually, rescue you." Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.”
17 A stone was brought, placed over the den's mouth, and sealed by the king with his signet ring and his nobles' rings, so nothing about Daniel could change. E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe.
18 Then the king went to his palace and fasted that night; no entertainment was brought before him, and sleep fled from him. Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra.
19 Then, at the first light of dawn, the king rose and hurried to the den of lions. Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ.
20 Nearing the den, he cried out to Daniel anxiously. The king said to Daniel, "Daniel, servant of the living God, has your God, whom you serve continually, been able to rescue you from the lions?" Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?”
21 Then Daniel said to the king, "King, may you live forever! Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile!
22 My Father sent his angel and shut the lions' mouths. They haven't harmed me, because I was found innocent before him, and before you, king, I've done no wrong." Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.”
23 The king was overjoyed and ordered Daniel lifted from the den. Daniel was lifted out with no injury at all, for he had trusted in his Father. Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.
24 The king ordered the men who had falsely accused Daniel brought and thrown into the lions' den—with their children and wives. Before they reached the bottom, the lions overpowered them and crushed all their bones. Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala.
25 Then King Darius wrote to all peoples, nations, and languages living on earth: "May your peace overflow! Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa. “Ka ọ dịrị unu na mma.
26 I decree: in all my kingdom, people must tremble and fear before Daniel's God—the living God, enduring forever. His kingdom will never be destroyed; his rule never ends. “Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel. “Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ, nke na-adịgide ebighị ebi. E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi, ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ.
27 He rescues and delivers; he works signs and wonders in the heavens and on the earth; he is the one who rescued Daniel from the power of the lions." Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa. Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube nʼeluigwe na nʼụwa. Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel site nʼike ọdụm.”
28 So this Daniel thrived in the reign of Darius and of Cyrus the Persian. Ya mere, ihe gaara Daniel nke ọma nʼoge niile Daraiọs bụ eze, na nʼoge Sairọs onye Peshịa chịkwara dịka eze.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]