Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 King Belshazzar held a great feast for 1,000 nobles, drinking wine in the presence of the 1,000. Eze Belshaza, kpọrọ puku ndịisi nọ nʼalaeze ya oriri, ebe ha nọ ṅụọ nnọọ mmanya dị ukwuu.
2 While tasting the wine, Belshazzar ordered in the gold and silver vessels his father Nebuchadnezzar took from Jerusalem's temple, for the king, his nobles, wives, and concubines to drink from. Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.
3 Then they brought the gold vessels taken from the temple, our Father's house in Jerusalem; the king, his nobles, wives, and concubines drank from them. Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.
4 They drank the wine and praised the gods of gold, silver, bronze, iron, wood, and stone. Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume.
5 Just then a human hand's fingers appeared and wrote on the plaster of the king's palace wall opposite the lampstand, and the king watched the hand writing. Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ.
6 The king's face changed color, his thoughts terrified him, his hips gave way, and his knees knocked. Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha.
7 The king shouted for the enchanters, astrologers, and fortune-tellers, telling Babylon's wise men, "Whoever reads this writing and tells me what it means will wear purple, a gold chain on his neck, and rule third in the kingdom." Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.”
8 Then all the king's wise men came in, but none could read the writing or tell him its meaning. Mgbe ahụ, ndị amamihe eze batara, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha pụrụ ịgụta, maọbụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara.
9 So King Belshazzar grew even more terrified, his face paler still, and his nobles were bewildered. Nke a mere, ka eze Belshaza maa jijiji karịa, ihu ya gburu maramara ma gbarụkwaa. Ọ gbakwara ndị ozi ya gharịị.
10 At the king's and his nobles' words, the queen entered the banquet hall, saying, "King, live forever! Don't let your thoughts terrify you or your face turn pale. Mgbe eze nwanyị, nụrụ olu eze na olu ndị a mara aha ha nʼala ya, ọ batara nʼụlọ oriri ahụ. Eze nwanyị sịrị, “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; ka ihe a mere ghara iwetara gị ihu mgbarụ, atụla ụjọ.
11 A man in your kingdom has the spirit of the holy gods. In your father's days he showed insight, understanding, and wisdom like the gods' wisdom. King Nebuchadnezzar your father—your father the king—made him chief of magicians, enchanters, astrologers, and fortune-tellers, Nʼihi na o nwere otu nwoke nọ nʼalaeze gị, onye mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ bi nʼime ya. Nʼoge ahụ nna gị bụ eze, a chọpụtara na nwoke a jupụtara nʼamamihe na nghọta, dịka a ga-asị na ya onwe ya bụ chi. Nna gị eze Nebukadneza mere ya onyeisi ndị amamihe niile, ndị dibịa, ndị na-enyocha kpakpando, ndị Kaldịa na ndị mgba afa niile.
12 because extraordinary spirit, knowledge, and understanding—interpreting dreams, explaining riddles, untying knots—were found in this Daniel, whom the king named Belteshazzar. Now call Daniel; he will interpret." Ebe ọ bụ na ezigbo mmụọ, mmụta na nghọta nke e ji akọwa nrọ na ihe mgbagwoju anya, na igbo mkpa dị iche iche, dị nʼime nwoke a a na-akpọ Daniel, nke eze kpọrọ Belteshaza. Ugbu a, zie ozi ka a kpọọ Daniel ka ọ kọwara gị ihe a.”
13 Daniel was brought before the king, who asked, "Are you Daniel, one of the Judean exiles my father the king brought from Judah? Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda?
14 I heard the spirit of the gods is in you—light, understanding, and rare wisdom found in you. Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe.
15 The wise men and enchanters were brought before me to read this writing and tell me its meaning, but couldn't. Ndị amamihe m, na ndị na-enyocha kpakpando abịala nʼihu m ịgụ ihe ahụ e dere nʼaja ụlọ ma ha enweghị ike ịgụta ya maọbụ ịkọwa ihe ọ bụ.
16 I've heard you can interpret and untie knots. If you read this writing and tell me its meaning, you'll wear purple, a gold chain on your neck, and rule third in the kingdom." Agwara m na i nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe e dere nʼaja ma kọwakwara m ihe ọ pụtara, aga m eyikwasị gị uwe odo odo ndị eze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo nʼolu, meekwa ka i bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze m.”
17 Daniel answered the king, "Keep your gifts; give your rewards to another. Still, I will read the king the writing and tell him its meaning. Daniel zara nʼihu eze, “Debere onwe gị onyinye gị, ma ọ bụkwanụ were ya nye onye ọzọ. Ma aga m agụrụ gị eze ihe ahụ e dere ma kọwakwara gị ihe ọ pụtara.
18 Your Majesty, the Most High our Father gave your father Nebuchadnezzar the kingdom, greatness, glory, and majesty. “Gị eze, Chineke nke kachasị ihe niile elu nyere nna gị, Nebukadneza ike ọchịchị a, na ịdị ukwu, na ebube, na ịma mma.
19 Because of the greatness he gave him, all peoples, nations, and languages trembled and feared before him. He killed whom he wished, let live whom he wished, raised whom he wished, humbled whom he wished. Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala.
20 When his heart grew proud and his spirit hardened into arrogance, he was deposed from his royal throne and his glory taken away. Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze.
21 He was driven from people, his mind made like an animal's; he lived with wild donkeys, was fed grass like an ox, and the dew of heaven soaked him—until he knew the Most High our Father rules the kingdom of men and sets over it whomever he chooses. A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa.
22 But you, Belshazzar his son, have not humbled your heart, though you knew all this. “Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile.
23 Instead, you lifted yourself against heaven's Sovereign. You had his house's vessels brought before you, and you, your nobles, wives, and concubines drank wine from them. You praised gods of silver, gold, bronze, iron, wood, and stone—gods that cannot see, hear, or know anything. But the One holding your breath in his hand, who owns all your ways—our Father—you have not honored. Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ.
24 Therefore he sent the hand that wrote this inscription. Ọ bụ nke a mere o ji zite aka ahụ ị hụrụ, nke depụtara ozi a.
25 This is the writing that was inscribed: MENE, MENE, TEKEL, PARSIN. “Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin
26 This is what it means: MENE—our Father counted your kingdom's days and ended it. “Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe.
27 TEKEL—you have been weighed on the scales and found wanting. “Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ.
28 PERES—your kingdom has been divided and given to the Medes and Persians." “Parsin, ekewala alaeze gị nyefee ya nʼaka ndị Midia na Peshịa.”
29 Then Belshazzar gave the order, and they clothed Daniel in purple, put a gold chain on his neck, and proclaimed him third ruler in the kingdom. Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ.
30 That very night Belshazzar, king of the Babylonians, was killed. Nʼabalị ụbọchị ahụ kwa ka e gburu Belshaza eze ndị Kaldịa.
31 And Darius the Mede received the kingdom, being about sixty-two years old. Nʼabalị ahụ kwa ka Daraiọs onye Midia, bidoro ịchị dịka eze. Ọ gbara iri afọ isii na abụọ nʼoge o bidoro ịchị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]