Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 King Nebuchadnezzar, to all peoples, nations, and languages living throughout the earth: May your peace be multiplied. Mụ bụ Nebukadneza, Na e zigara mmadụ niile, mba niile, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nʼụwa ozi: Ka ọ dịrị unu na mma!
2 I am glad to declare the signs and wonders the Most High God has done for me. E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m.
3 How great are his signs, and how mighty are his wonders! His kingdom is an everlasting kingdom, and his dominion is from generation to generation. Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
4 I, Nebuchadnezzar, was at ease in my house and flourishing in my palace. Mụ onwe m, bụ Nebukadneza nọ nʼafọ ojuju na ihe ịga nke ọma nʼụlọeze m.
5 I saw a dream that frightened me; thoughts on my bed and visions in my head terrified me. Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m.
6 So I ordered all Babylon's wise men brought before me to tell me the dream's meaning. Nʼihi ya, enyere m iwu ka a kpọọ ndị amamihe niile m nwere na Babilọn ka ha bịa nʼihu m, bịa kọwaara m isi nrọ ahụ.
7 Then the magicians, enchanters, Babylonians, and astrologers entered. I told them the dream, but they could not interpret it for me. Ma mgbe ndị mgbaasị, ndị dibịa, ndị Kaldịa na ndị na-agba afa bịara, a kọọrọ m ha nrọ ahụ m rọrọ, ma ha enweghị ike ịgwa m nkọwa ya.
8 Finally Daniel came before me—named Belteshazzar after my god's name, the holy gods' spirit in him—and I told him the dream. Nʼikpeazụ, Daniel batara nʼihu m, onye aha ya bụ Belteshaza dịka aha chi m si dị, onye mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime ya. Akọọrọ m ya ihe ahụ m rọrọ na nrọ.
9 Belteshazzar, chief magician, I know the spirit of the holy gods is in you, and no mystery baffles you—tell me the visions of my dream that I saw, and their meaning. Asịrị m, “Belteshaza, onyeisi ndị nkọwa ihe niile. Amaara m na mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime gị. Amakwaara m na o nweghị ihe omimi ọbụla ga-esiri gị ike ịchọpụta ọsịsa ya. Ugbu a, nke a bụ nrọ m, kọwaara m ihe ọ pụtara.
10 The visions in my mind while in bed: I saw a tree in the middle of the earth, very tall. Mgbe m dina nʼelu akwa, nke a bụ ihe m hụrụ. E nwere otu osisi nke toro nʼetiti ụwa, ogologo ya dị ukwuu.
11 The tree grew and became strong, and its top reached to heaven, and it was visible to the ends of the whole earth. Osisi a toro sie ike, ịdị elu ya rukwara nʼeluigwe, a na-ahụkwa ya anya site na nsọtụ nke ụwa niile.
12 Its leaves were beautiful and its fruit abundant, and in it was food for all. Wild animals found shade under it, and the birds of the heavens lived in its branches, and all flesh was fed from it. Akwụkwọ ya dị mma ile anya, alaka ya jupụtakwara na mkpụrụ hiri nne, o gbokwara mkpa nri nye mmadụ niile. Ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na-abịakwa nʼokpuru ndo ya izuike. Ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe na-ebikwa nʼalaka ya. Ọ bụkwa site na ya ka a na-azụ ihe niile dị ndụ nri.
13 In my visions in bed I saw a watcher, a holy one, coming down from heaven. “Mgbe m nọkwa na-arọ nrọ ahụ, ahụrụ m otu nʼime ndị mmụọ ozi Chineke ka o si nʼeluigwe na-arịdata.
14 He shouted: Cut down the tree, chop its branches, strip its leaves, scatter its fruit. Let animals flee from under it, birds from its branches. O tiri mkpu nʼolu dị ike sị, ‘Gbudanụ osisi ukwu ahụ, gbukasịakwa alaka ya niile. Kụpụsịanụ akwụkwọ ndụ niile dị nʼelu ya. Ghasaakwanụ mkpụrụ ya niile, ka ụmụ anụmanụ si nʼokpuru ndo ya gbapụ, ka ụmụ nnụnụ site nʼalaka ya fepụ.
15 But leave the stump of its roots in the earth, bound with a band of iron and bronze, in the grass of the field. Let him be drenched with the dew of heaven, and let his portion be with the wild animals in the grass of the earth. Kama hapụnụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya ka ha dịrị nʼime ala, ebe e ji ụdọ igwe na ụdọ bronz kee ya gburugburu, ebe ahịhịa ndụ gbakwara ya gburugburu. “ ‘Ka igirigi nke eluigwe zoo ya nʼahụ, ka ahịhịa bụrụkwa nri ọ ga-eri, ya na ụmụ anụmanụ.
16 Let his human mind be taken away and a beast's mind be given to him, and let seven periods of time pass over him. Ka uche ya gbanwee ghọọ nke anụ ọhịa, ghara ibu nke mmadụ, afọ asaa.
17 The sentence is by the decree of the watchers, the decision by the word of the holy ones, so that the living may know that the Most High rules over the kingdom of men and gives it to whom he will and sets over it the lowliest of men.' “ ‘Nke a bụ mkpebi nke mmụọ ozi ahụ nọ na nche. Ọ bụkwa mkpebi e nyere site nʼokwu nke dị nsọ, ka ụwa niile mata na Onye kachasị ihe niile elu, na-achịkwa nʼalaeze niile dị nʼụwa. Ọ bụ ya na-ewerekwa alaeze ndị a nye onye ọbụla ọ chọrọ, ọ bụladị ndị mmadụ a na-ahụta dịka ndị dị ala karịsịa.’
18 This is the dream I, King Nebuchadnezzar, saw. Tell me its meaning, Belteshazzar, for my kingdom's wise men can't explain it, but you can—the spirit of the holy gods is in you. “Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.”
19 Then Daniel, called Belteshazzar, was stunned briefly, alarmed by his thoughts. The king said, "Belteshazzar, don't let the dream or its meaning alarm you." Belteshazzar answered, "My lord, may the dream be for your haters, its meaning for your enemies!" Mgbe ahụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), nọ nʼoke ihe iju anya nʼihi na echiche ya mere ka ọma jijiji. Ya mere, eze sịrị, “Belteshaza, atụkwala egwu nʼihi nrọ a maọbụ ihe ọ pụtara.” Belteshaza zara sị, “Onyenwe m, ka nrọ a dịrị ndị kpọrọ gị asị, ka nkọwa ya dịkwara ndị iro gị.
20 The tree you saw grew strong, its top reaching heaven, visible to all the earth, Osisi ahụ ị hụrụ nke buru ibu, tokwa ogologo ma dịkwa ike, nke elu ya na-emetụ mbara eluigwe, nke ndị niile bi nʼụwa hụrụ,
21 beautiful leaves, abundant fruit, food for all—wild animals lived beneath it, birds of the sky nested in its branches. nke nwekwara akwụkwọ ndụ dị mma, na nke jupụtara na mkpụrụ, nke na-egboro mmadụ niile mkpa nri, nke ụmụ anụmanụ ọhịa niile na-ebi nʼokpuru ndo ya, nke ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe nwere akwụ ebe obibi ha,
22 It is you, king—you have grown and become strong; your greatness has grown, reaching heaven, your dominion to the ends of the earth. osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa.
23 Because the king saw a watcher, a holy one, come down from heaven, saying: Cut down the tree, destroy it—but leave the stump of its roots in the ground, bound with a band of iron and bronze in the field's grass. Let him be drenched with the dew of heaven; his portion with the wild animals, until seven periods of time pass over him. “Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’
24 This is the interpretation, my king: the Most High's decree has come upon my lord the king, “Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze.
25 you'll be driven from people to live among wild animals, eating grass like oxen, drenched with the dew of heaven, until seven times pass over you and you know the Most High rules the human kingdom, giving it to whoever he chooses. A ga-achụpụ gị site nʼebe ndị mmadụ nọ. A ga-achụgakwa gị nʼebe gị na ụmụ anụmanụ ga-ebi nʼọhịa, Ebe ahụ ka ị ga-anọ taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe ga-ezokwasịkwa gị. Ọnụọgụgụ afọ asaa ga-agabiga tutu ruo mgbe ị nabatara na Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke mmadụ, na ọ bụkwa nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-enyefe ha.
26 The command to leave the stump and its roots in the ground: your kingdom will be restored to you once you know Heaven rules. Dịka e siri nye nʼiwu ka a hapụ ogwe osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya nʼime ala. Nke a na-egosi na ị ga-emecha nwetaghachi alaeze gị mgbe ị nabatara na Eluigwe na-achị achị.
27 So, king, accept my advice: break from your sins through righteousness, your wrongdoing through mercy to the poor, so your prosperity may continue. Ya mere, biko eze, kweere nabata ndụmọdụ m, kwụsị ime mmehie, mee ihe ziri ezi, werekwa omume ileta ndị ogbenye dochie nʼọnọdụ ajọ omume gị. Eleghị anya, ihe ga na-agara gị nke ọma.”
28 All this came upon King Nebuchadnezzar. Ma ihe ndị a niile bịakwasịrị eze Nebukadneza.
29 Twelve months later, he was walking on the roof of Babylon's royal palace. Mgbe ọnwa iri na abụọ gafesịrị ọ nọ na-agagharị nʼelu ụlọ dị nʼụlọeze nʼobodo Babilọn.
30 The king said, "Is this not great Babylon I built as a royal house by my mighty power, for the glory of my majesty?" Ma eze sịrị, “Ebe a, ọ bụghị Babilọn dị ukwu, nke m wuuru onwe m dịka ebe obibi m, site nʼike m dị ukwu na maka ebube ọchịchị m?”
31 The words were still in the king's mouth when a voice fell from heaven: "King Nebuchadnezzar, this is said to you: the kingdom has left you. Mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, otu olu si nʼeluigwe kwuo okwu, “Ihe a ka e kpebiri megide gị, eze Nebukadneza. Site taa gaa nʼihu ị gaghị abụkwa eze na-achị alaeze a.
32 You'll be driven from people, living with wild animals, eating grass like an ox. Seven periods will pass over you, until you know the Most High rules mankind's kingdom and gives it to whomever he wills." A ga-esi nʼetiti ndị mmadụ chụpụ gị, ka ị gaa soro ụmụ anụmanụ biri nʼọhịa. Ị ga-atakwa ahịhịa dịka oke ehi, afọ asaa ga-agasị tutu ruo mgbe ị ghọtara na ọ bụ Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze dị niile nke ụwa. Ọ na-enyefekwa ha nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ chịa.”
33 At once the word came true against Nebuchadnezzar: driven from people, he ate grass like cattle, his body soaked by the dew of heaven, until his hair grew like eagle feathers, his nails like bird claws. Nʼotu oge ahụ kwa, okwu ndị a e kwuru banyere Nebukadneza mezuru. E sitere nʼetiti ụmụ mmadụ chụpụ ya, ọ gakwara nʼọhịa taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ ya ruo mgbe ajị dị ya nʼahụ toro ogologo dịka nku ugo, mbọ ụkwụ na aka ya dịkwa ka mbọ ụmụ nnụnụ.
34 When the days ended, I, Nebuchadnezzar, raised my eyes to heaven, and my reason returned. I blessed the Most High, praised and honored the One who lives forever, whose rule is everlasting, whose kingdom spans every generation. Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
35 All the inhabitants of the earth are counted as nothing, and he does according to his will among the host of heaven and among the inhabitants of the earth; and no one can hold back his hand or say to him, "What have you done?" Mmadụ niile bi nʼụwa bụ ihe efu nʼihu ya. Nʼihi na ọ na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ nʼetiti usuu ndị bi nʼeluigwe, na nʼetiti ndị bi nʼụwa. O nweghị onye pụrụ igbochi ya, maọbụ onye pụrụ ịjụ ya sị ya, “Gịnị mere iji mee ihe ndị a?”
36 Then my sanity returned; my majesty and splendor returned for my kingdom's glory. My advisers and nobles sought me; I was restored over my kingdom, and surpassing greatness was added to me. Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga.
37 Now I, Nebuchadnezzar, praise, exalt, and honor Heaven's King, for all his works are right, his ways just; those walking in pride he can humble. Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]