Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 King Nebuchadnezzar made a gold statue, about ninety feet tall and nine feet wide, and set it up on the Dura plain in Babylon province. Eze Nebukadneza kpụrụ oyiyi ọlaedo nke ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-adị ka mita atọ. Emesịa, o debe ya nʼobosara ala Dura, nke dị nʼotu mpaghara Babilọn.
2 King Nebuchadnezzar sent for the satraps, prefects, governors, counselors, treasurers, judges, magistrates, and all provincial officials to come to the dedication of the image he had set up. Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.
3 Then satraps, prefects, governors, counselors, treasurers, judges, magistrates, and all provincial officials gathered to dedicate the statue King Nebuchadnezzar set up, and stood before the statue Nebuchadnezzar set up. Ya mere, ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile na ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, zukọtara maka ido oyiyi ahụ nke eze, bụ Nebukadneza guzobere nsọ. Ha niile guzooro ọtọ nʼihu oyiyi ahụ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.
4 Then the herald proclaimed loudly, "Peoples, nations, and languages—you are commanded: Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a,
5 When you hear the horn, flute, lyre, harp, zither, bagpipe, and all music, fall down and worship the gold image King Nebuchadnezzar set up. mgbe ọbụla unu nụrụ ụda ọja, une, ụbọ akwara, maọbụ ụda ihe egwu ọbụla, unu ga-ada nʼala kpọọ isiala nye ihe a Nebukadneza eze ji ọlaedo kpụọ.
6 Anyone who doesn't fall down and worship will immediately be thrown into a blazing fiery furnace." Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.”
7 As soon as all peoples heard the horn, flute, lyre, harp, zither, and every kind of music, all peoples, nations, and languages fell down and worshiped the golden image King Nebuchadnezzar had set up. Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere.
8 At that time certain astrologers came forward and maliciously accused the Jews. Nʼoge a, ụfọdụ nʼime ndị Kaldịa pụtara nʼihu boo ndị Juu ebubo.
9 They said to King Nebuchadnezzar, "King, may you live forever! Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
10 You, king, decreed: whoever hears the horn, flute, lyre, harp, zither, bagpipe, and any music must fall down and worship the gold image, Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ,
11 and whoever does not fall down and worship will be thrown into a blazing fiery furnace. na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.
12 Some Jews you put in charge of Babylon province—Shadrach, Meshach, and Abednego—disregard you, king. They won't serve your gods or worship the gold statue you set up." Ugbu a, e nwere ụfọdụ ndị Juu, ndị aha ha bụ Shedrak, na Mishak na Abednego, ndị i mere ka ha bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn; ha aṅaghị ntị nʼiwu eze nyere, jụkwa ịkpọ isiala nye oyiyi a i ji ọlaedo kpụọ.”
13 Furious, Nebuchadnezzar ordered Shadrach, Meshach, and Abednego brought; they were brought before the king. Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,
14 Nebuchadnezzar said, "Shadrach, Meshach, Abednego, is it true you don't serve my gods or worship the gold statue I set up? Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere?
15 Now if you're ready—when horn, flute, lyre, harp, zither, bagpipe, and every kind of music sound, fall down and worship the image I made—good. But if you don't worship, you'll be thrown at once into a blazing fiery furnace. What god can rescue you from my hands?" Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?”
16 Shadrach, Meshach, and Abednego answered the king, "Nebuchadnezzar, we don't need to answer you about this. Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a.
17 If our Father, whom we serve, can rescue us, he will rescue us from the blazing furnace and from your hand, king. Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị.
18 But if not, know this, king: we won't serve your gods or worship the gold statue you set up." Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.”
19 Then Nebuchadnezzar, furious, his expression changed toward Shadrach, Meshach, and Abednego; he ordered the furnace heated seven times hotter than normal. Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri.
20 He ordered some of his strongest soldiers to bind Shadrach, Meshach, and Abednego and throw them into the blazing furnace. Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu.
21 So these men, tied up in cloaks, trousers, turbans, and other garments, were thrown into the blazing fiery furnace. Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu.
22 Because of the king's harsh order and furnace's extreme heat, the fire's flame killed the men who lifted up Shadrach, Meshach, and Abednego. Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.
23 These three men—Shadrach, Meshach, and Abednego—fell bound into the blazing furnace. Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike.
24 Then King Nebuchadnezzar, astonished, rose in haste. He asked his advisers, "Didn't we throw three bound men into the fire?" They answered the king, "True, king." Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.”
25 He said, "Look—I see four men, unbound, walking in the middle of the fire, unharmed; the fourth looks like a son of the gods." Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.”
26 Nebuchadnezzar went to the blazing furnace's door and said, "Shadrach, Meshach, and Abednego, servants of the Most High God, come out here!" Shadrach, Meshach, and Abednego came out of the fire. Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!” Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta.
27 The satraps, prefects, governors, and king's counselors gathered and saw fire had no power over these men's bodies—hair not singed, robes unharmed, no smell of fire on them. Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha.
28 Nebuchadnezzar said, "Blessed be the God of Shadrach, Meshach, and Abednego! He sent his angel and rescued his trusting servants. They defied the king's command and were willing to die rather than serve or worship any god but their own God. Mgbe ahụ, Nebukadneza sịrị, “Otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak na Abednego nʼihi na o zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi, mgbe ha jụrụ ime ihe eze nyere nʼiwu, kama ha jiri aka ha họrọ ịnwụ, kama ife chi ọzọ nke na-abụghị Chineke nke ha.
29 I decree: any people, nation, or language that speaks anything against the God of Shadrach, Meshach, and Abednego will be cut to pieces, their houses turned to rubble—since no other god can rescue like this." Ya mere, ana m enye iwu a taa, na-asị na onye ọbụla, maọbụ mba ọbụla, maọbụ asụsụ ọbụla, onye kwuru okwu ọjọọ megide Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-etikpọkwa ụlọ onye ahụ, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. Nʼihi na o nweghị chi ọzọ nke pụrụ ịzọpụta nʼụzọ dị otu a.”
30 Then the king promoted Shadrach, Meshach, and Abednego in the province of Babylon. Mgbe ahụ, eze nyere Shedrak, Mishak na Abednego ọkwa ọzọ dị elu karịa nke ha nwere na mbụ nʼala Babilọn.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]