Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the second year of his reign, Nebuchadnezzar had dreams; his spirit was troubled and his sleep left him. Nʼime afọ nke abụọ nke ọchịchị ya, eze Nebukadneza rọrọ nrọ dị iche iche. Nrọ ndị a mere ka obi ya gbasasịa, ụra pụkwara ya nʼanya.
2 So the king ordered the magicians, enchanters, sorcerers, and astrologers summoned to tell him his dreams. They came and stood before the king. Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị majiki, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, ndị mgbaasị na ndị ihe banyere ngagharị nke kpakpando doro anya ka ha bịa gwa ya ihe ahụ ọ rọrọ na nrọ. Mgbe ha bịara, guzo nʼihu eze,
3 The king said to them, "I dreamed a dream, and my spirit is troubled to know the dream." ọ sịrị ha, “Arọrọ m nrọ nke na-enye m nsogbu nʼobi. Achọrọ m ịma ihe ọ pụtara.”
4 Then the astrologers said to the king in Aramaic, "King, live forever! Tell your servants the dream, and we will reveal its interpretation." Mgbe ahụ, ndị ahụ na-enyocha kpakpando gwara eze ahụ okwu nʼasụsụ ndị Siria sị, “Ka gị eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, Ị ga-agwa ụmụodibo gị nrọ a ị rọrọ, anyị ga-akọwara gị ihe ọ pụtara.”
5 The king answered the astrologers, "My decree is firm: if you don't tell me the dream and its meaning, you'll be cut to pieces and your houses reduced to rubble. Ma eze zara ndị Kaldịa, “Nke a bụ ihe m kpebirila: Ọ bụrụ na unu agwaghị m ihe nrọ a na nkọwa ya bụ, aga m eme ka abọkasịa unu, tikpọkwa ụlọ unu, mee ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe.
6 But if you tell the dream and its meaning, you'll receive gifts, rewards, and great honor from me. So tell me the dream and its meaning." Ma ọ bụrụ na unu gwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ ma kọwaakwa ya, aga m enye unu onyinye dị iche iche na ụgwọ ọrụ nsọpụrụ dị ukwuu. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ na nkọwa ya.”
7 They answered a second time, "Let the king tell his servants the dream, and we will give its meaning." Ọzọkwa, ha zaghachiri, “Ka eze gwa ndị ohu ya ihe ọ rọrọ na nrọ, anyị ga-akọwakwa ya.”
8 The king replied, "I know for certain you're trying to buy time, because you see my decree is firm: Eze zaghachiri, “Ama m na ọ bụ oge ka unu na-achọ inweta nʼihi na unu amatala na ihe a ka m kpebiri ime.
9 If you don't tell me the dream, there is only one verdict for you. You have agreed to speak lying, corrupt words before me until the times change. So tell me the dream, then I'll know you can reveal its interpretation." Ọ bụrụ na unu agwaghị m nrọ ahụ naanị otu ntaramahụhụ dịịrị unu. Unu agbaala izu ịgwa m okwu ụgha na okwu nduhie na-ele anya na ọnọdụ ga-agbanwe. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ, m ga-amatakwa na unu pụrụ ịkọwara m ya.”
10 The astrologers answered the king, "No one on earth can do what the king asks. No great, powerful king ever demanded such a thing of any magician, enchanter, or Chaldean. Ndị Kaldịa zara eze, “Ọ dịghị mmadụ ọbụla nʼelu ụwa a nke nwere ike ime ihe a eze na-achọ. Ọ dịghịkwa eze, nʼagbanyeghị ịdị ukwuu ya na ịdị ike ya, nke jụtụrụla ụdị ihe dị otu a eze na-ajụ nʼaka ndị mgbaasị, ndị na-agba aja ya, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, na ndị Kaldịa.
11 The king's request is too hard; only the gods, who don't live among mortals, can reveal it to the king." Ihe a ị chọrọ ka anyị mee bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ọ bụ naanị ndị mmụọ nwere ike ịkọrọ gị ihe ị rọrọ na nrọ. Ndị mmụọ anọkwaghị nʼetiti ndị mmadụ.”
12 At this the king grew angry and furious, and ordered all Babylon's wise men destroyed. Nke a mere ka eze jupụta nʼoke iwe na ọnụma, o nyere iwu ka e gbuchaa ndị amamihe niile nke Babilọn.
13 So the decree went out to kill the wise men, and they searched for Daniel and his companions to put them to death. Mgbe e kwupụtara iwu onye eze ka e gbuo ndị oke amamihe niile, ndị agha chọkwara ebe Daniel na ndị otu ya nọ ka ha gbuo ha.
14 Then Daniel answered Arioch, the king's guard commander, with wisdom and discretion; Arioch had gone out to kill Babylon's wise men. Mgbe Ariok, onye bụ onyeisi ndị nche eze pụrụ igbu ndị ikom maara ihe na Babilọn, Daniel ji amamihe na ezi uche gwa ya okwu.
15 He asked Arioch, the king's officer, "Why such a harsh decree from the king?" Then Arioch explained it to Daniel. Ọ jụrụ onyeozi eze, bụ Ariok, “Gịnị mere eze ji nye iwu dị ike dị otu a?” Mgbe ahụ, Ariok kọwaara ihe niile nye Daniel.
16 So Daniel went in and asked the king for time, so that he might reveal the interpretation to the king. Mgbe ahụ, Daniel banyere nʼụlọeze, ịhụ ya. Ọ rịọrọ eze ka o nyetụ ya nwa oge iji kọwaakwara ya ihe nrọ ahụ pụtara.
17 Then Daniel went home and told his companions Hananiah, Mishael, and Azariah about the matter, Emesịa, Daniel lara nʼụlọ nke ya gaa kọọrọ Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ndị enyi ya ihe merenụ.
18 urging them to plead for mercy from our Father in heaven about this mystery, so Daniel and his companions wouldn't be destroyed with Babylon's other wise men. Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn.
19 Then the mystery was revealed to Daniel in a night vision, and Daniel blessed our Father in heaven. Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe,
20 Daniel said: "Blessed be the name of our Father forever and ever, for wisdom and might belong to him. Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.
21 He changes times and seasons; he removes kings and sets up kings; he gives wisdom to the wise and knowledge to those who have understanding. Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma.
22 He reveals deep and hidden things; he knows what lies in darkness, and the light dwells with him. Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya.
23 To you, the God of my fathers, I give thanks and praise, for you have given me wisdom and might, and now you have made known to me what we asked of you; you have made known to us the king's matter." Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha, nʼihi na i nyela m amamihe na ike. I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị, i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.”
24 So Daniel went to Arioch, whom the king had appointed to destroy Babylon's wise men, and said, "Don't destroy Babylon's wise men. Take me to the king, and I will give him the interpretation." Nʼihi ya, Daniel jekwuru Ariok, onye ahụ eze nyere iwu igbu ndị ndụmọdụ niile dị na Babilọn, sị ya, “Egbukwala onye ọbụla nʼime ndị amamihe Babilọn. Kama duru m gaa nʼihu eze nʼihi na ejikeere m ịgwa ya ihe ahụ ọ chọrọ ịmata.”
25 Then Arioch quickly brought Daniel before the king and said, "Among the exiles of Judah I found a man who can tell the king the interpretation." Mgbe ahụ, Ariok mere ngwangwa duru Daniel gaa nʼihu eze, sị ya, “Achọpụtala m otu onye nʼime ndị Juda a dọtara nʼagha nwere ike ịgwa eze ihe nrọ ya pụtara.”
26 The king asked Daniel, called Belteshazzar, "Can you tell me the dream I saw and what it means?" Eze jụrụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), “I nwere ike ịgwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ, na ịkọwara m ihe ọ pụtara?”
27 Daniel answered the king, "No wise men, enchanters, magicians, or astrologers can reveal the mystery the king asks about. Daniel gwara eze, “O nweghị onye amamihe ọbụla, onye ọbụla ya na mmụọ na-ekwu okwu, onye mgbaasị ọbụla maọbụ onye na-enyocha kpakpando ọbụla pụrụ ịgwa eze ihe omimi a ị chọrọ.
28 But our Father in heaven reveals mysteries, and has made known to King Nebuchadnezzar what will happen in the latter days. Your dream and the visions in your mind as you lay on your bed were these: Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a:
29 "As you lay in bed, O king, your thoughts turned to what would come, and the revealer of mysteries showed you what is to be. “Ihe ị rọrọ na nrọ, gị bụ eze, bụ ihe banyere ihe na-aga imezu nʼoge dị nʼihu. Onye ahụ na-ekpughe ihe nzuzo niile egosikwala gị ihe nke ga-eme.
30 But this mystery was revealed to me not because I have more wisdom than anyone else alive, but so the king may know its interpretation, and you may understand your heart's thoughts. Ma mụ onwe m, ekpugheghị ihe omimi a nye m nʼihi na m karịrị mmadụ ọbụla dị ndụ nʼamamihe, kama ọ bụ ka gị bụ eze mata nkọwa ya ma ghọtakwa ihe gabigara nʼuche gị.
31 "You watched, O king, and saw a great statue. This statue, huge and dazzling in brightness, stood before you, and its appearance was terrifying. “Eze, ihe ị hụrụ nʼọhụ bụ nke a. Ị hụrụ mmadụ a kpụrụ akpụ. Mmadụ a a kpụrụ akpụ buru nnọọ ibu. Ọ na-egbukwa nweghenweghe, bụrụkwa ihe na-eyi onye ọbụla lekwasịrị ya anya egwu.
32 The statue's head was fine gold, its chest and arms silver, its belly and thighs bronze, E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ isi mmadụ ahụ, jiri ọlaọcha kpụọ aka ya na obi ya. E jikwa bronz kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya.
33 its legs of iron, its feet partly of iron and partly of clay. Ọ bụkwa igwe ka e ji kpụọ ogwe ụkwụ ya abụọ. Ma akụkụ ụkwụ ya, nke a na-azọ nʼala ka e ji igwe a gwara ya na ụrọ kpụọ.
34 While you watched, a stone cut without hands struck the statue's feet of iron and clay, crushing them. Mgbe ị na-ele anya, a wapụtara nkume, ma ọ bụghị aka mmadụ ka e ji wapụta ya. Nkume a kụrụ mmadụ ahụ a kpụrụ akpụ nʼukwu nkume na ụrọ ya, kụpịasịa ha.
35 Then the iron, clay, bronze, silver, and gold were all broken to pieces together, becoming like chaff on a summer threshing floor. The wind carried them off, leaving no trace. But the stone that struck the statue became a great mountain filling the whole earth. Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile.
36 "This was the dream. Now we will tell the king its interpretation. “Eze, nke a bụ nrọ ahụ. Ugbu a ka anyị kọwaara gị ihe nrọ ahụ pụtara.
37 You, king, are the king of kings, to whom our Father in heaven has given kingdom, power, might, and glory. Gị onwe gị, eze, bụ eze nke ọtụtụ ndị eze ọzọ nọ nʼokpuru ya, onye Chineke nke eluigwe nyere ike ọchịchị, nʼocheeze niile, na ike na otuto;
38 Into your hand he has placed all people, the beasts of the field, and the birds of the sky, wherever they live, making you ruler over them all. You are the head of gold. nyefeekwa nʼaka gị ụmụ mmadụ niile na ụmụ anụmanụ bi nʼime ọhịa, na ụmụ nnụnụ nke igwe, e mere ka ị bụrụ eze ihe niile ndị a, gị bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.
39 "After you another kingdom will arise, inferior to yours; then a third kingdom, of bronze, ruling over all the earth. “Mgbe ị chịchara alaeze ọzọ ga-ebili, ma ọ gaghị adị ukwuu dịka nke gị, mgbe nke a gasịrị, alaeze ọzọ bụ nke atọ, nke ga-adị ka bronz ga-ebilikwa, ọ ga-achị ụwa niile.
40 A fourth kingdom will be strong as iron—iron breaks and shatters everything—and as iron crushes all these, it will break and crush them. A ga-enwekwa alaeze nke anọ, nke ga-esi ike dịka igwe. Dịka igwe nke na-akụri ihe niile, ọ ga-egwepịa ma kụrikwaa ndị a niile.
41 As you saw the feet and toes—part potter's clay, part iron—it will be a divided kingdom; yet it will have some of iron's strength, just as you saw iron mixed with soft clay. Ma ebe ị hụrụ na ọbụ ụkwụ ahụ na mkpịsịụkwụ ya niile na ụfọdụ nʼime ha bụ ụrọ ọkpụ ite na ụfọdụ bụkwa igwe, alaeze nke ekewara ekewa ka ọ ga-abụ, ma ọ ga-esitụ ike dịka igwe nke dị nʼime ya, nʼihi na ị hụrụ igwe ahụ na agwakọtara ya na ụrọ apịtị.
42 As the toes were partly iron and partly clay, so the kingdom will be partly strong and partly brittle. Dịka mkpịsịụkwụ ya, nke ụfọdụ nʼime ya bụ igwe, ụfọdụ bụkwa ụrọ, na-egosi na akụkụ ụfọdụ nke alaeze ahụ ga-esi ike ma akụkụ ụfọdụ agaghị esi ike ntiwa.
43 As you saw iron mixed with soft clay, the people will mix in marriage but not hold together, just as iron does not mix with clay. Dịka otu ahụ ị hụrụ e siri gwakọta igwe na ụrọ ọnụ, otu a ka ọchịchị alaeze ndị a ga-achọ njikọta alaeze na ibe ya, ma nke a agaghị ekwe mee, dịka ọ gaghị ekwe omume bụ ịgwakọta igwe na ụrọ.
44 "In those kings' days our Father in heaven will set up a kingdom never to be destroyed, nor its rule left to another people. It will crush all these kingdoms and end them, and it will stand forever. “Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi.
45 This is what the vision meant: the stone cut from a mountain, not by human hands, broke the iron, bronze, clay, silver, and gold to pieces. Our great Father has shown the king what will happen after this. The dream is certain, its interpretation trustworthy." Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”
46 Then King Nebuchadnezzar fell facedown, bowed to Daniel, and ordered offering and incense given to him. Mgbe ahụ, eze Nebukadneza dara nʼala nʼihu Daniel nye ya nsọpụrụ. O nyekwara iwu ka eweta onyinye na ụda na-esi isi ụtọ were chụnyere ya aja.
47 The king told Daniel, "Truly your God is God of gods, Lord of kings, and revealer of secrets, since you could reveal it." Onye eze gwakwara Daniel, “Nʼezie, Chineke gị bụ Chineke kachasị chi niile. Ọ bụ ya na-achị eze niile bi nʼụwa, bụrụkwa Onye na-ekpughepụ ihe omimi niile, nʼihi na lee, i nwere ike ịkọwa ihe omimi nke a.”
48 Then the king promoted Daniel to high honor, gave him many great gifts, and made him ruler of Babylon's whole province and chief prefect over all its wise men. Emesịa eze nyere Daniel ọkwa dị ukwuu, nyekwa ya ọtụtụ onyinye dị iche iche. O mere ya onyeisi na-achị ala Babilọn niile, meekwa ya onyeisi ndị ndụmọdụ eze niile.
49 Daniel asked the king, who put Shadrach, Meshach, and Abednego over Babylon province's affairs; Daniel remained at the king's court. Ma dịka Daniel siri rịọ eze, o mekwara ka Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn, Daniel nʼonwe ya nọdụrụ nʼogige eze.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]