Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In Jehoiakim king of Judah's third year, Nebuchadnezzar king of Babylon marched on Jerusalem and besieged it. Mgbe afọ atọ gafere site na mgbe Jehoiakim bidoro bụrụ eze na-achị Juda, Nebukadneza eze na-achị Babilọn bịara buso Jerusalem agha.
2 The Sovereign Father handed Jehoiakim king of Judah over to him, with some items from our Father's house; he took them to Shinar, to his god's house, and the items into his god's treasury. Onyenwe anyị nyefere Jehoiakim, eze Juda nʼaka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma. O buuru ha niile gawa Shaịna nʼụlọ chi ya, dobe ha nʼime nʼụlọakụ chi ya.
3 The king ordered Ashpenaz, his chief official, to bring some Israelites from the royal family and nobility. Eze nyere Ashipenaz, onyeisi ndị ozi ya iwu ka ọ kpọbata ụmụ okorobịa sitere nʼezinaụlọ eze na nke ndị ọchịchị nʼala Izrel nʼije ozi eze.
4 Young men without defect, good-looking, skilled in all wisdom, well-informed, quick to understand, fit to stand in the king's palace—and to teach them Babylonian writing and language. Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa.
5 The king assigned them a daily portion of his food and wine, three years' training, then service before him. Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze.
6 Among them were Daniel, Hananiah, Mishael, and Azariah, from the sons of Judah. Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda.
7 The chief official renamed them: Daniel, Belteshazzar; Hananiah, Shadrach; Mishael, Meshach; Azariah, Abednego. Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
8 Daniel resolved not to make himself unclean with the king's food or wine, so he asked the chief official's permission not to make himself unclean. Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.
9 Now our Father gave Daniel favor and compassion in the eyes of the chief official. Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha.
10 The chief official told Daniel, "I fear my lord the king, who set your food and drink. Why should he see your faces worse than boys your age? You'd forfeit my head to the king." Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”
11 Then Daniel said to the steward the chief official had appointed over Daniel, Hananiah, Mishael, and Azariah, Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka,
12 "Please test your servants for ten days. Give us only vegetables to eat and water to drink. “Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri.
13 Then compare our appearance with the youths eating the king's food; do with your servants as you see." Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.”
14 So he agreed to this and tested them for ten days. O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.
15 After ten days they looked healthier and better fed than all the young men eating the royal food. Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ.
16 So the steward took away their assigned food and the wine they were to drink, and gave them vegetables instead. Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.
17 To these four boys our Father gave knowledge and insight in all writing and wisdom; Daniel understood all visions and dreams. Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
18 When the king's set days for bringing them in ended, the chief official brought them before Nebuchadnezzar. Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza.
19 The king spoke with them, and none matched Daniel, Hananiah, Mishael, and Azariah; so they served the king. Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ.
20 Whenever the king questioned them on wisdom and understanding, he found them ten times better than all magicians and enchanters in his whole kingdom. Mgbe ọ bụlakwa eze chọrọ ndụmọdụ banyere amamihe na nghọta, ọ na-achọpụta na ndụmọdụ ha na-enye ya na-adị mma okpukpu iri karịa ndụmọdụ nke ndị majiki ya na ndị maara ihe banyere kpakpando nọ nʼalaeze ya na-enye ya.
21 And Daniel remained there until the first year of King Cyrus. Daniel nọgidere bụrụ onye na-adụ eze ọdụ tutu ruo afọ mbụ nke Sairọs bidoro ịchị dịka eze.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]