Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In Belshazzar king of Babylon's first year, Daniel dreamed and saw visions in his head on his bed. He wrote the dream, summarizing the matters. Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ.
2 Daniel said: In my night vision I saw the four winds of heaven churning the great sea. “Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri.
3 And four great beasts came up out of the sea, each different from the others. Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya.
4 The first was like a lion, with eagle's wings. I watched until its wings were torn off; it was lifted off the ground, set on two feet like a human, and given a human heart. “Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere.
5 A second beast appeared, like a bear, raised up on one side, three ribs in its mouth between its teeth. It was told, 'Get up, eat much flesh.' “Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’
6 After this I watched: another beast, like a leopard, with four bird wings on its back, four heads, and given authority to rule. “Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị.
7 After this, in my night vision, a fourth beast appeared—dreadful, terrifying, incredibly strong, with huge iron teeth. It devoured, crushed, and trampled the rest underfoot, different from every beast before it, with ten horns. “Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri.
8 While I watched the horns, another—a little horn—rose among them, and three of the first horns were uprooted before it. It had eyes like human eyes and a mouth speaking boastfully. “Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.
9 As I watched, thrones were set in place, and the Ancient of Days, our Father, took his seat. His clothing was white as snow; the hair of his head was like pure wool. His throne was flaming with fire, and its wheels were all ablaze. “Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.
10 A river of fire flowed out, streaming from before him. Thousands of thousands served him, and 10,000 upon 10,000 stood before him. The court sat, and the books were opened. Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.
11 I watched because of the boastful words the horn spoke; I watched until the beast was killed, its body destroyed and given to the burning fire. “Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ.
12 The rest of the beasts lost authority but had their lives prolonged for a set time and season. (Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge).
13 In my night vision I looked, and there before me, coming with the clouds of heaven, was one like a son of man. He approached the Ancient of Days, our Father, and was led into his presence. “Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya.
14 And he was given authority, glory, and a kingdom, so that all peoples, nations, and languages would serve him. His dominion is an everlasting dominion that will not pass away, and his kingdom is one that will never be destroyed. E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.
15 I, Daniel, was troubled in spirit, and the visions that passed through my mind alarmed me. “Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji.
16 I approached one of those standing there and asked him the truth about all this. He told me, revealing its interpretation. Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara. “Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara.
17 'These four great beasts are four kings who will rise from the earth. ‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa.
18 But the holy ones of the Most High, our Father, will receive and possess the kingdom forever, forever and ever. Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’
19 Then I wanted the truth about the fourth beast, different from all others—most terrifying, iron teeth, bronze claws—devouring, crushing, and trampling what remained underfoot. “Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ.
20 I also wanted to know about the ten horns on its head, and the other horn that came up before which three fell—the horn with eyes and a boastful mouth, appearing bigger than the rest. Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ.
21 As I watched, this horn was waging war against the holy ones and was defeating them, Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa.
22 until the Ancient of Days, our Father, came, judgment was given for the holy ones of the Most High, our Father, and the holy ones' time came to possess the kingdom.' Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ.
23 He said: 'The fourth beast is a fourth kingdom on earth, unlike all other kingdoms. It will devour, trample, and crush the whole earth. “Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile.
24 The ten horns: ten kings will arise from this kingdom. After them another arises, different from the first, and subdues three kings. Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi.
25 He will speak words against the Most High, our Father, oppress the holy ones of the Most High, our Father, and try to change the set times and the law. The holy ones will be handed to him for a time, times, and half a time. Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara.
26 But the court will sit in judgment, and his dominion will be taken away, consumed and destroyed forever. “ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam.
27 Kingdom, dominion, and greatness of all kingdoms under heaven will be given to the people, the holy ones of the Most High, our Father. His kingdom is a kingdom without end; all rulers will serve and obey him.' Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’
28 This ends the matter. I, Daniel—my thoughts terrified me, my face turned pale, but I kept it to myself. “Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]