Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In King Belshazzar's third year, a vision appeared to me, Daniel, after the earlier one. Nʼafọ nke atọ site na mgbe eze Belshaza bidoro ịbụ eze, mụ bụ Daniel hụrụ ọhụ ọzọ.
2 In the vision I was in the citadel of Susa, in Elam province; and in the vision I was beside the Ulai Canal. Nʼime ọhụ, ahụrụ m onwe m nʼobodo Susa, nke bụ obodo ukwu ebe eze nwere isi ọchịchị ya, nʼobodo dị na mpaghara Elam. Eguzokwara m nʼakụkụ osimiri Ulai.
3 I looked up: a ram stood before the canal, two tall horns—one taller than the other, the taller coming up last. Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.
4 I watched the ram charging west, north, and south. No animal could stand against him, none could rescue from his power. He did as he pleased and grew great. Mgbe m na-ele anya, ebule ahụ malitere iji mpi ya na-asọ ihe o bụla dị nʼọdịda anyanwụ na nʼugwu nakwa na ndịda. O nweghị anụ ọbụla nwere ike iguzogide ya, o nwekwaghị onye ọbụla pụrụ inyere ndị ọ lụsoro ọgụ aka. O mere ihe ọbụla masịrị ya si otu a dị ukwuu.
5 As I was considering this, suddenly a male goat came from the west across the whole earth without touching the ground; it had a prominent horn between its eyes. Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya.
6 He came to the two-horned ram I saw standing by the canal and ran at it in raging power. Ọ bịaruru nso ebule ahụ nwere mpi abụọ nke m hụrụ guzo nʼakụkụ mmiri, were oke iwe na-agbata ọsọ nʼebe ọ nọ.
7 I saw him reach the ram, enraged, striking and shattering its two horns. The ram had no strength to stand against him; the goat threw it down and trampled it, and no one could rescue the ram from his power. Ahụrụ m ka o ji oke iwe lụso ebule ahụ ọgụ kujipụ mpi abụọ ya. Ebule ahụ enweghị ike iguzogide ya. Ọ tụdara ya nʼala, were ụkwụ ya zọda ya, ma na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịnapụta ebule ahụ site nʼike ya.
8 The goat grew very great, but at its full strength the great horn broke, and four prominent horns grew up in its place toward the four winds of heaven. Mkpi ahụ, dịịrị ike nke ukwu, ma nʼuju ike ya a gbajipụrụ mpi ukwu ya. Nʼọnọdụ mpi ahụ mpi anọ puputara chee ihu nʼakụkụ anọ nke eluigwe,
9 From one of them a little horn came out, growing very great toward the south, east, and the glorious land. Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ
10 It grew great, up to the host of heaven, casting down to earth some of the host and of the stars, and trampled them. O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha.
11 It made itself great against the Prince of the host; the Prince's regular offering was removed and his sanctuary's place thrown down. O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala.
12 Because of wrongdoing, the army was handed over to it with the daily offering; it threw truth to the ground and acted and thrived. Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala.
13 Then I heard a holy one speaking, and another holy one asked the speaker, "How long is the vision—the regular offering, the wrongdoing that brings desolation, sanctuary and host handed over to trampling?" Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?”
14 He told me, "For 2,300 evenings and mornings; then the sanctuary will be restored to its rightful state." Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.”
15 As I, Daniel, watched the vision seeking to understand, one like a man stood before me. Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m.
16 I heard a human voice from the Ulai calling, "Gabriel, make this man understand the vision." Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.”
17 He came near where I stood, and as he drew close I was terrified and fell facedown. He said to me, "Understand, son of man: the vision is for the time of the end." Mgbe ọ bịara m nso nʼebe m guzo, egwu tụrụ m nke ukwu. Adara m, kpuo ihu m nʼala. Ma ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ghọta na ọhụ a bụ maka ọgwụgwụ oge.”
18 As he spoke, I fell into a deep sleep, face to the ground; but he touched me and set me on my feet. Mgbe ahụ ọ na-agwa m okwu, adara m nʼoke ụra, kpuo ihu nʼala. Ma o metụrụ m aka, nyere m aka iguzo ọtọ nʼụkwụ m.
19 He said, "Listen, I will tell you what will happen in the later time of the wrath, for it concerns the appointed time of the end. Ọ sịrị, “Lee, aga m agwa gị ihe na-aga ime nʼoge oke iwe. Nʼihi na ọhụ a bụ maka oge ọgwụgwụ ihe niile nke a kara aka.
20 The ram you saw with the two horns is the kings of Media and Persia. Ma banyere ebule ahụ ị hụrụ nke nwere mpi abụọ, na-egosi eze Midia na Peshịa.
21 The shaggy goat is Greece's king; the great horn between his eyes is the first king. Mkpi ahụ ị hụrụ na-egosi eze ndị Griis, nnukwu mpi nke dị nʼetiti anya ya abụọ bụ eze nke mbụ.
22 The broken horn, four rising in its place: four kingdoms rise from his nation, but without his power. Dịka mpi ahụ siri gbajie, mpi anọ ọzọ pupụta nʼọnọdụ ya, otu a ka alaeze anọ ga-esi pụta na mba ya, ma ike ha agaghị eru ka nke mbụ ahụ.
23 At the end of their reign, when sinners reach full measure, a fierce-faced king skilled in intrigue will arise. “Ma na mgbe ọgwụgwụ alaeze ahụ, mgbe iko ndị nnupu isi juru, otu eze nke nwere ihu dị ike, na akọnuche na obi aghụghọ ga-ebili.
24 His power will be great—but not his own—and he will cause terrible destruction, prosper, and act. He will destroy the mighty and the people of the holy ones. Ọ ga-adị ike nke ukwuu, ma ọ bụghị nʼike onwe ya, ọ ga-eweta mbibi ga-eju anya. Ihe niile o metụrụ aka ga-agara ya nke ọma. Ọ ga-alakwa ndị dị ike na ndị nsọ nʼiyi.
25 By cunning he makes deceit thrive under his hand, and in his heart he lifts himself up. Without warning he destroys many, and rises against the Prince of princes—yet he will be broken, by no human hand. Ọ ga-eme ka aghụghọ baa ụba, ọ ga-ahụta onwe ya dịka onye dị elu karịa, mgbe ndị mmadụ na-eche na udo dị, ọ ga-ebibi ọtụtụ ndị. Ọ ga-eguzo megide Onyeisi nke ndịisi, a ga-ebibi ya ma ọ bụghị nʼike nke mmadụ.
26 The vision of the evenings and mornings told to you is true, but seal it up, for it concerns days far off." “Ọhụ a ị hụrụ, maka ụtụtụ na anyasị nke ekpughere gị bụ eziokwu, ma zobe ọhụ a, nʼihi na ọ dịrị ọtụtụ oge ka dị nʼihu.”
27 I, Daniel, was overcome and sick for days. Then I got up and did the king's business, but the vision left me appalled, beyond understanding. Mụ bụ Daniel, nọrọ nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ na ahụ esighị ike. Mgbe ụbọchị ole na ole gafekwara, ebiliri m bidokwa na-agagharị, na-arụkwa ọrụ eze, ma obi jọrọ m njọ nke ukwuu nʼihi nrọ ahụ, nʼihi na ọ karịrị m nghọta.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]