Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the first year of Darius son of Xerxes, a Mede, made king over the Babylonian realm. Nʼafọ mbụ, nke Daraiọs nwa Ahasuerọs (onye agbụrụ Midia), onye e mere eze nke alaeze ndị Kaldịa,
2 In his reign's first year, I, Daniel, understood from the books how many years our Father told Jeremiah the prophet: seventy, to complete Jerusalem's ruins. nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa.
3 So I turned my face to the Sovereign Father, to seek him in prayer and pleading, with fasting, sackcloth, and ashes. Nʼihi nke a, echere m Onyenwe anyị Chineke ihu, rịọ ya arịrịọ, site nʼekpere na arịrịọ amara, nʼibu ọnụ, na iyikwa akwa mkpe na ntụ.
4 I prayed to my Father, confessing: "Sovereign Father, great and awesome, keeping covenant and faithful love for those loving him and keeping his commands, Ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị bụ Chineke m, ma kwupụta sị, “Onyenwe anyị, onye dị ukwuu, dị oke egwu. Onye na-edebe ọgbụgba ndụ nke ịhụnanya nke ndị hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile.
5 we have sinned, done wrong, done evil, rebelled, turning from your commands and rulings. Ma anyị emehiela meekwa ihe nʼadịghị mma megide gị. Anyị emeela ajọ omume, anyị enupula isi megide gị, gbakụtakwa iwu gị niile azụ.
6 We haven't listened to your servant prophets speaking in your name to our kings, princes, ancestors, and all the land's people. Anyị e geghịkwa ndị ozi gị bụ ndị amụma ntị, bụ ndị gwara ndị eze anyị, na ndị ọchịchị anyị, na nna anyị ha, ma mmadụ niile bi nʼala anyị okwu nʼaha gị.
7 Righteousness is yours, Sovereign Father, but ours is open shame today—Judah's people, Jerusalem's residents, all Israel, near and far, in every land where you drove them for their unfaithfulness to you. “Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, ma nʼụbọchị taa anyị bụ ndị ihere dịrị, ndị Juda, ndị Jerusalem na ndị Izrel niile, ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya ebe ị chụgara ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi anyị nye gị.
8 O our Father, open shame belongs to us—our kings, princes, and ancestors—because we sinned against you. Onyenwe anyị, ihere emegbuola anyị. Ihere dịrị ndị eze anyị, dịkwara ndịisi anyị na ndị nna anyị, nʼihi na anyị emeela mmehie megide gị.
9 To the Sovereign Father belong mercy and forgiveness, for we have rebelled against him, Ma Onyenwe anyị Chineke anyị ka obi ebere na mgbaghara niile dịrị, nʼihi na anyị enupurula gị isi.
10 and we disobeyed our Father's voice to walk in his laws set before us through his servants the prophets. Anyị erubeghị isi nye Onyenwe anyị Chineke anyị, maọbụ debe iwu ahụ o nyere anyị site nʼaka ndị ohu ha bụ ndị amụma.
11 All Israel broke your law and turned away, refusing to obey your voice. So the curse and the sworn oath written in the Law of Moses, our Father's servant, poured out on us, because we sinned against him. Ndị Izrel niile enupula isi nʼiwu gị, wezuga onwe ha, jụ ige gị ntị. “Ya mere, ọbụbụ ọnụ ahụ niile e dere nʼiwu Mosis, odibo nke Chineke adakwasịla anyị, nʼihi na anyị emehiela megide gị.
12 He confirmed his words against us and our judges who judged us, bringing great disaster on us; nothing under all heaven matches what happened to Jerusalem. O meela ka okwu ya guzosie ike, bụ nke o kwuru megide anyị na ndị ndu anyị site nʼiwetara anyị oke mbibi a. Nke bụ na o nwebeghị mgbe ọbụla e merela ụdị ihe emere na Jerusalem nʼokpuru eluigwe.
13 As written in the Law of Moses, all this disaster came on us; yet we have not sought our Father's favor by turning from our sins and understanding your truth. Ọ bụ dịka e si dee ya nʼiwu Mosis, ka mbibi a niile bịakwasịrị anyị, ma anyị achọbeghị ihuọma Onyenwe anyị Chineke anyị, na ichegharị site na mmehie anyị chee uche banyere eziokwu gị.
14 So our Father readied the disaster and brought it on us, for our Father is righteous in all he does; but we did not obey his voice. Onyenwe anyị kpachara anya mee ka nsogbu a bịakwasị anyị. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke anyị, bụ onye ezi omume nʼihe niile ọ na-eme, ma anyị jụrụ irubere ya isi.
15 And now, Sovereign Father, you brought your people out of Egypt with a strong hand and made yourself a name lasting to this day—we sinned, we did wrong. “Ma ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, onye ji aka dị ike kpọpụta ndị nke ya nʼala Ijipt, i meere onwe gị aha nke na-adịgide ruo taa. Anyị mere mmehie, ma mejọọkwa.
16 Sovereign Father, by all your righteous acts, turn your anger and rage from your city Jerusalem, your holy mountain—for our sins and our ancestors' wrongdoing made Jerusalem and your people a disgrace to all around us. Onyenwe anyị, dịka ezi omume gị si dị, wezuga iwe gị na oke iwe gị nʼebe Jerusalem nọ, bụ obodo gị, na ugwu nsọ gị. Mmehie anyị na njehie nna anyị ha emeela ka Jerusalem na ndị gị bụrụ ihe ịkwa emo nye ndị gbara anyị gburugburu.
17 Now, our Father, hear your servant's prayer and pleas, and shine your face on your desolate sanctuary, for your own sake, Sovereign Father. “Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu.
18 Turn your ear toward us, my Father, and hear; open your eyes, see our ruins and the city called by your name. We bring our pleas before you not for our righteousness but your great mercy. Chineke m, tọọ ntị gị nʼala nụrụ arịrịọ m. Meghee anya gị abụọ ka ị hụrụ ọnọdụ mbibi nke obodo a na-akpọ aha gị nọ. Anyị anaghị arịọ ka i nyere anyị aka nʼihi na anyị bụ ndị ezi omume, kama anyị na-arịọ nʼihi na ebere gị dị ukwuu.
19 Sovereign Father, hear! Sovereign Father, forgive! Sovereign Father, listen and act! Don't delay, for your sake, my Father, because your city and your people bear your name." Onyenwe anyị nụrụ! Onyenwe anyị, gbaghara anyị! Onyenwe anyị biko, gee ntị ma zaa anyị. Nʼihi aha gị, O Chineke m, anọkwala ọdụ, nʼihi obodo gị, na ndị nke gị bụ aha gị ka a na-akpọ ha.”
20 Still speaking, praying, confessing my sin and my people Israel's sin, laying my plea before my Father for my Father's holy hill, Mgbe m nọ na-ekwu okwu na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie m na mmehie ndị m Izrel, na-arịọkwa amara nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke m maka ugwu dị nsọ nke Chineke m,
21 while I was still praying, Gabriel, the man I saw earlier in the vision, reached me, flying fast, about the time of the evening offering. ebe m ka nọ na-ekpere, Gebrel, nwoke ahụ m hụrụ nʼọhụ na mbụ, feere ọsịịsọ bịakwute m nʼoge a na-achụ aja nke uhuruchi.
22 He gave me insight, speaking with me and saying, "Daniel, I have now come out to give you insight and understanding. Ọ bịara sị m, “Daniel, a bịara m ugbu a inye gị uche na nghọta.
23 As your pleas began, a word went out, and I came to tell you, for you are deeply loved. So weigh the word and understand the vision: Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a.
24 "Seventy weeks are decreed for your people and your holy city: to end wrongdoing, finish sin, atone for guilt, bring in everlasting righteousness, seal vision and prophet, and anoint a most holy place. “Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmanụ.
25 Know therefore and understand: from the time the command goes out to restore and rebuild Jerusalem until the coming of the Anointed One, the Prince, there will be seven weeks and sixty-two weeks. It will be rebuilt with streets and a moat, but in troubled times. “Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu.
26 And after the sixty-two weeks the Anointed One will be cut off and will have nothing. The people of the prince who is to come will destroy the city and the sanctuary. Its end will come like a flood, and to the end there will be war; desolations are decreed. Mgbe izu ụka iri isii na abụọ gasịrị, Onye ahụ e tere mmanụ ka a ga-egbu, ma o nweghị ihe ọ ga-enwe. Usuu agha nke onye ọchịchị ga-abịa bibie obodo na ụlọnsọ. Oge ikpeazụ ga-abịa dịka idee mmiri; agha ga-adịgide ruo nʼoge ọgwụgwụ, e kpebiela na ịla nʼiyi ga-adị.
27 He will confirm a covenant with many for one week; mid-week he will stop sacrifice and offering. On a temple wing he will set up an abomination that causes desolation, until the decreed end pours on the desolator." Ya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-enwe ọgbụgba ndụ nʼotu ‘izu ụka,’ ọ bụkwa nʼọkara izu ụka ahụ, ka ọ ga-eme ka ịchụ aja na inye onyinye kwụsị. Ọ ga-emekwa ihe arụ dị egwu nʼime ụlọnsọ ahụ, ruo mgbe a ga-awụkwasị ya ọgwụgwụ ahụ bụ nke akara aka nʼahụ onye ọjọọ ahụ.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]