Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In Cyrus king of Persia's third year, a message was revealed to Daniel, called Belteshazzar—true, about a great war. He understood it, gaining insight into the vision. Nʼafọ atọ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, e nyere Daniel (onye aha ya bụkwa Belteshaza mkpughe). Ozi ahụ bụ eziokwu, ọ gbasakwara oke ọgbaaghara. Ọ ghọtara ozi ahụ, nwetakwa nkọwa banyere ọhụ ahụ.
2 In those days I, Daniel, was mourning for three full weeks. Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ.
3 I ate no fine food; no meat or wine touched my mouth; I used no oil at all, until three weeks passed. Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile.
4 On the twenty-fourth day of month one, I stood on the bank of the great river—the Tigris. Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris,
5 I looked up and saw a man in linen, a belt of fine gold of Uphaz around his waist. eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya.
6 His body like beryl, his face like lightning, his eyes like torches of fire, his arms and legs like polished bronze, and the sound of his words like a roaring crowd. Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.
7 I, Daniel, alone saw the vision; the men with me didn't see it, but great trembling fell on them, and they fled and hid. Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha.
8 Left alone, I saw this great vision. No strength remained in me; my face turned deathly pale, and I kept no strength. Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ.
9 Then I heard his words, and hearing them, I fell face down on the ground in a deep sleep. Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra.
10 Suddenly a hand touched me and set me trembling on my hands and knees. Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ.
11 He said to me, "Daniel, dearly loved man, understand the words I speak to you; stand up, for I am now sent to you." When he spoke this word to me, I stood up, trembling. Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji.
12 He said to me, "Don't be afraid, Daniel. From the first day you set your heart to understand and humbled yourself before your Father, your words were heard, and I came because of your words. Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha.
13 But the prince of Persia's kingdom opposed me twenty-one days; then Michael, one of the chief princes, came to help me, for I was left there with Persia's kings. Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa.
14 I came to help you understand your people's future in days to come, for the vision is for days still ahead." Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.”
15 As he spoke these words to me, I turned my face to the ground, unable to speak. Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla.
16 Then one like a man touched my lips. I opened my mouth and began to speak. I said to the one standing before me, "My lord, the vision has filled me with pain, and I have no strength left. Mgbe ahụ, otu onye, nke yiri mmadụ, bịara metụ egbugbere ọnụ m aka, mee ka m nwee ike ikwukwa okwu ọzọ. Mgbe ahụ agwara m onye ahụ nke guzo m nʼihu, “Anọ m nʼoke ihe mgbu; Onyenwe m, enwekwaghị m ike ọbụla, nʼihi ọhụ m hụrụ.
17 How can I, your servant, speak with you, my lord? No strength remains in me now, no breath is left." Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.”
18 Again the one who looked like a man touched me and strengthened me. Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike.
19 He said, "Don't be afraid, treasured one. Peace to you; be strong, be strong!" His words strengthened me, and I said, "Speak, my lord, for you have strengthened me." Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.” Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.”
20 He said, "Do you know why I came to you? Now I return to fight Persia's prince; then, as I leave, Greece's prince comes. Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa;
21 But first I'll tell you what's written in the Book of Truth: none stands firmly with me against them but Michael, your prince." ma otu ọ dị, aga m agwa gị ihe e dere nʼakwụkwọ nke eziokwu. (Ọ dịghị onye na-enyere m aka imegide ha ma ọ bụghị naanị Maikel onyeisi unu.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]