Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 11 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 And I, in the first year of Darius the Mede, stood up to support and strengthen him. Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Daraiọs onye Midia, ọ bụ m guzoro inyere ya aka na ichekwa ya.)
2 Now I'll tell you the truth: look, three more kings will rise in Persia, then a fourth far richer than all. Strengthened by his wealth, he will stir up everyone against Greece's kingdom. “Ugbu a, aga m agwa gị eziokwu. A ga-enwe ndị eze Peshịa atọ ọzọ ndị ga-achịkwa. A ga-enwe eze nke anọ onye ga-aba ụba karịa ndị ọzọ niile. Mgbe ọ ga-adị ike site akụnụba ya, ọ ga-akpalị onye ọbụla imegide eze Griis.
3 Then a mighty king will arise, who will rule with great dominion and do as he pleases. Ma mgbe ahụ, a ga-enwe eze dị ike nke ga-eji oke ike chịa. Ọ ga na-eme ihe masịrị ya.
4 Once he rises, his kingdom will break apart and split toward the four winds of heaven—not to his descendants, nor with the power he held, for his kingdom will be uprooted and given to others besides them. Ma mgbe ọ rịgotachara nʼọchịchị, a ga-ekposa alaeze ya kesaa ya nʼakụkụ anọ nke ụwa ma ọ bụghị ụmụ ya ga na-achị. Ọ bụghịkwa nʼusoro dịka ike ọchịchị ya si dị, nʼihi na a ga-ehopu alaeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ọzọ na-abụghị ndị agbụrụ ya.
5 The king of the south will grow strong; one of his commanders will grow stronger than him and rule—his dominion will be vast. “Eze nke ndịda ga-adị ike, ma otu onye nʼime ndịisi agha ya ga-adị ike karịa ya, chịakwa alaeze dị ukwu karịa nke ya
6 After some years they will ally: the daughter of the king of the south will come to the king of the north to make an agreement. But she won't keep her strength, nor will he or his arm stand. She will be handed over—with her escort, her father, and her supporter—in those times. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ha ga-ekekọta onwe ha. Ada eze ndịda ga-agakwuru eze ugwu ka ha gbaa ndụ, ma ada eze agaghị ejigide ike ya, eze na ike ya agaghị adịgidekwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, a ga-arara ada eze ahụ nye, ya na ndị na-eche ya nche, na nna ya na onye ahụ dịnyeere ya.
7 A shoot from her roots will rise in his place, attack the army, enter the north king's fortress, act against them, and prevail. “Nʼoge ahụ, otu onye ga-esi nʼagbụrụ ụlọ nwanyị ahụ kulite i were ọnọdụ ya ịchị dịka eze, ọ ga-ebuso ndị agha eze mpaghara ugwu agha, bata nʼebe ya e wusiri ike, ọ ga-alụso ha agha ghọọ onye mmeri.
8 He will take their gods captive to Egypt, with their metal images and precious silver and gold vessels; for years he will stay away from the king of the north. Ọ ga-ebukọrọ chi ha niile na arụsị ha niile awụrụ awụ ma ndị atụrụ atụ, na ihe ndị ọzọ dịkarịsịrị ha mkpa dịka efere, ọlaọcha na nke ọlaedo laa Ijipt. O mechaa nke a, ọ ga-akwụsị ịlụso eze ugwu ọgụ afọ ole na ole.
9 The king of the north will invade the king of the south's realm, then return home. Otu a kwa, eze mpaghara ugwu ga-ebuso eze ndịda agha, ma ọ gaghị anọ ọdụ lọghachikwa nʼala nke ya.
10 His sons will arm for war, gather a vast army that keeps coming, overflows, sweeps through, then renews war to his stronghold. Ma ụmụ ya ndị ikom ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha siri ike, ndị ga-enupu dịka oke idee mmiri, buru agha ruo nʼebe ya e wusiri ike.
11 The southern king, enraged, will march out to fight the northern king, who musters a vast army; but the army is given into the southern king's hand. “Mgbe ahụ, eze ndịda, onye iwe ga-eju obi, ga-achịkọtakwa ndị agha nke ya buso eze ugwu agha, onye nke ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha, ma ndị a ka ndị iro ya ga-alụgbu.
12 When the crowd is carried off, his heart grows proud; he strikes down tens of thousands, yet fails. Ma mgbe o merichara ndị agha ahụ, ọ ga-enwe ọṅụ dị ukwu, ọ ga-egbukwa imerime puku ndị mmadụ, ma ọ gaghị emeri na-aga nʼihu.
13 The king of the north will again raise a horde bigger than before, then after years come with a great army and vast supplies. Mgbe afọ ole na ole gafere, eze ndị mpaghara ugwu ga-eduru ndị agha ji ezi ngwa agha, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ karịa ndị nke e meriri nʼagha na mbụ pụọ ibu agha.
14 In those times many will rise against the king of the south; violent men of your people will lift themselves up to fulfill the vision, but fail. “Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị ga-ebili imegide eze ndịda, Ụfọdụ ndị ọkpa aghara nʼetiti unu ga-enupukwa isi, ha ga-esi otu a mezuo ihe a ị hụrụ nʼọhụ, ma a ga-emeri ha.
15 The king of the north will come, raise a siege ramp, and take a fortified city; the south's forces will not stand, nor its elite troops—no strength remains to stand. Mgbe ahụ, eze ndị mpaghara ugwu ga-abịa buo agha megide obodo ndị ndịda e wusiri ike, lụgbukwaa ya. Ndị agha agaghị enwe ike iguzogide ha ọ bụladị ndị ha bụ ọka ibe nʼagha.
16 His invader does as he pleases; none can stand before him. He will stand in the splendid land, destruction in his hand. Ma onye nke na-ebuso ya agha ga-eme ihe masịrị ya, ma o nweghị onye ga-egbochi ha. Ọ ga-abatakwa nʼAla Ọma ahụ, ebe ihe niile ga-anọ nʼokpuru ya.
17 He will set out to enter with his kingdom's full strength, and make terms with him; he will give him a daughter of women to ruin it, but it will not stand or benefit him. Ọ ga-ekpebi ịbịa nʼike nke alaeze ya niile, iji mee nke a, ya na eze nke ndịda ga-agba ndụ. Ọ ga-enyekwa ya nwaagbọghọ iji kwatuo alaeze ya, ma ebumnobi ya agaghị eguzo maọbụ baara ya uru.
18 Then he'll turn to the coastlands and take many, but a commander will end his arrogance, turning it back on him. Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere.
19 Then he will turn his face toward the fortresses of his own land, stumble, fall, and be found no more. Ọ ga-echigharị azụ chee ihu ya ebe niile e wusiri ike nke ala nke ya, ọ ga-asọ ngọngọ daa, a gaghị ahụkwa ya ọzọ.
20 In his place will rise one who sends a tax collector for the glory of the kingdom; within a few days he'll be broken—not in anger, not in battle. “Otu onye ga-abịa nọchie ọnọdụ ya, ọ ga-ezipụ onye ga-ekegbu ndị mmadụ nʼụtụ iji mee ka otuto nke alaeze ahụ daa, ma nʼime ụbọchị ole na ole, a ga-egbu ya, ma ọ gaghị abụ nʼagha maọbụ nʼihu mmadụ.
21 A despised man will rise in his place, denied royal honor. He'll come in a time of ease and seize the kingdom through flattery. “Nʼọnọdụ ya, otu onye ọjọọ e ledara anya ga-ebilite, onye na-ekwesighị iwere nsọpụrụ nke ya bụ ọchịchị. Ọ ga-abata nʼike nʼalaeze ahụ mgbe ndị ya nọ nʼudo, ọ ga-eji nwayọọ ma were ire ụtọ na aghụghọ nweta alaeze ahụ.
22 Armies will be swept away before him and broken, and the prince of the covenant as well. Mgbe ahụ, ọ ga-achụsasị igwe ndị agha niile, bibiekwa ha na onye ọchịchị nke ọgbụgba ndụ.
23 Once allied with him, he will act dishonestly and grow strong with only a few people. Mgbe ọ banyesịrị nʼọgbụgba ndụ, ọ ga-eji aghụghọ na-eme mpu, ọ ga na-esiwanye ike nʼagbanyeghị nʼọnụọgụgụ ndị mmadụ dị ole na ole.
24 In a time of security, he will enter the province's richest regions and do what neither his fathers nor their fathers did—scattering plunder, spoil, and goods among them, devising schemes against fortresses, but only for a time. Ọ ga-abanye nʼakụkụ ala ahụ niile a maara ndị bara ụba bi, mee nʼebe ahụ ihe ndị buru ya ụzọ na-emebeghị. Ọ ga-ekesara ndị mmadụ akụnụba na ihe nkwata ndị ọzọ ọ lụtara nʼagha. Ọ ga-atụpụta aro iji lụso obodo siri ike ọgụ, ma nke ahụ ga-adị nwa mgbe nta.
25 He will rouse his strength and courage against the king of the south with a great army. The king of the south will fight with a very great, mighty army—but won't stand, for plots will be devised against him. “Mgbe ahụ, ọ ga-emesi onwe ya obi ike, chịkọtaa ọtụtụ ndị agha ibuso eze ndịda agha. Eze ndịda ga-achịkọtakwa ndị agha dị ọtụtụ dịkwa ike lụso ya ọgọ ma ọ gaghị enwe ike guzogide ya nʼihi izuzu nzuzo a gbara megide ya.
26 Those who eat his food will break him; his army is swept away, and many fall slain. Nʼihi na ndị na-eri ihe ọma eze ga-etipịa ya. A ga-achụsa ndị agha ya, ma gbukwaa ọtụtụ nʼọgbọ agha.
27 Both kings' hearts bent on evil will speak lies at one table, but it will fail—the end awaits its appointed time. Ndị eze abụọ a, ndị obi ha jupụtara nʼihe ọjọọ ga-anọkọta nʼotu tebul na-agwarịta ibe ha okwu ụgha, ma nzukọ ha agaghị enwe isi, nʼihi ọgwụgwụ ahụ ga-adị mgbe a kara aka ruru.
28 He returns to his land with great wealth, heart against the holy covenant; he acts, then returns to his land. Ọ ga-eji akụnụba dị ukwuu laghachi nʼobodo nke ya ma obi ya ga-adị imegide ọgbụgba ndụ nsọ ahụ. Ọ ga-ebili imegide ya ma mesịa laghachi nʼobodo nke aka ya.
29 At the appointed time he will return and head south, but this time won't match the earlier or the latter. “Ma mgbe oge ahụ a kara aka ruru, ọ ga-achịrịkwa ndị agha ya laghachi na ndịda, ma ihe agaghị adị otu ọ dị na mbụ.
30 For ships of Kittim will come against him; he loses heart, turns back, rages against the holy covenant, and acts. He returns and favors those who abandon the holy covenant. Ụgbọ mmiri ndị si obodo Kitim ga-abịa imegide ya, ọ ga-ada mba nʼihi egwu, ọ ga-alaghachi azụ were oke iwe megide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. Ọ ga-alọghachi gosi ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nkwado.
31 His forces will rise, defile the sanctuary fortress, end the daily sacrifice, and set up the abomination that causes desolation. “Ndị agha ya ga-ebili imerụ ebe ahụ e wusiri ike nke ụlọnsọ ukwu ahụ, kwụsịkwa aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị. Ha ga-ewuli ihe arụ nke na-eweta mbibi.
32 He will corrupt those who violate the covenant with flattery, but people who know their Father will stand firm and act. Ọ ga-eji ire ụtọ merụọ ndị ahụ mebiri iwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ndị ahụ maara Chineke ha ga-adị ike guzogide ya.
33 The wise among the people will teach many, but will fall for a time by sword, flame, captivity, and plunder. “Ndị niile nwere uche ga-ezi ọtụtụ mmadụ ihe, ma na nwa oge nta, ụfọdụ ga-anwụ site na mma agha, ụfọdụ ka a ga-akpọ ọkụ, ụfọdụ ka a ga-adọta nʼagha, ụfọdụ kwa ka a ga-apụnara ihe ha nwere.
34 When they fall, they will receive a little help, and many will join them with flattery. Mgbe ha ga-ada, inyeaka ntakịrị ga-abịara ha, ọtụtụ ndị mmadụ ga-ejikwa ụzọ aghụghọ bịa dịnyere ha.
35 Some of the wise will stumble, to be refined, purified, and cleansed until the end time, for it still awaits the set time. Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị maara ihe ga-asọ ngọngọ, ka ha nwe ike bụrụ ndị a nụchara anụcha, na ndị a sachapụrụ ọcha na ndị emere ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ tutu ruo nʼọgwụgwụ ihe ndị a, nʼihi nʼoge ahụ ga-abịa mgbe akara aka.
36 The king will do as he pleases, lifting and enlarging himself above every god, speaking shocking things against our Father. He will flourish until the wrath is spent, since what is decreed will happen. “Eze ahụ ga-eme ihe ọbụla ọ chọrọ. Ọ ga-agụkwa onwe ya dịka onye dị ukwuu karịa chi niile. Nʼezie, ọ ga-ekwu okwu nkwulu megide Chineke kachasị chi niile. Ma ihe ga-agakwara ya nke ọma tutu mgbe oge ya zuru. Nʼihi na ihe niile ekwuru ga-emezucha.
37 He will disregard his fathers' gods, women's desired one, and every god—he will set himself above them all. Ọ gaghị akpọ chi nke nna ha maọbụ nke ahụ ụmụ nwanyị na-achọsi ike ihe ọbụla, o nweghị chi ọbụla ọ ga-akpọ ihe nʼihi na ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa ha niile.
38 Instead he'll honor a god of fortresses, unknown to his fathers, with gold, silver, precious stones, and costly gifts. Kama chi nke ọ ga-asọpụrụ bụ chi nke ebe e wusiri ike, chi nke nna ya ha na-amaghị. Ọ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, na nkume dị oke ọnụahịa na onyinye dara oke ọnụahịa fee chi a.
39 With a foreign god he attacks the strongest fortresses. He greatly honors those who acknowledge him, gives them rule over many, and divides land for a price. Ọ ga-emegide ebe niile e wusiri ike, nke siri ike site nʼinyeaka chi nke mba ọzọ. Ndị niile nabatara ya ka ọ ga-eme ka nsọpụrụ bara ụba. Ọ ga-eme ha ndị ọchịchị ọtụtụ mmadụ, kenyekwa ha ala dịka ụgwọ ọrụ ha.
40 At the end time, the king of the south will engage him, and the king of the north will storm against him with chariots, horsemen, and many ships. He will invade the lands, overflow, and pass through. “Ma nʼoge ikpeazụ, eze ndịda ga-ebuso ya agha, ma eze nke ugwu ga-eji iwe chịkọta ndị agha na-agba ụgbọ agha, ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ji ụgbọ mmiri megide ya. Ọ ga-ebuso ọtụtụ mba agha, kpochapụ ha dịka idee mmiri si ekpochapụ ihe.
41 He enters the beautiful land; many fall, but Edom, Moab, and Ammon's chief sons escape his hand. Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya.
42 He will stretch out his hand against the lands, and the land of Egypt will not escape. Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya.
43 He will rule gold and silver treasures, and all Egypt's riches, with Libyans and Cushites at his heels. Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya.
44 But news from the east and north will terrify him, and he'll set out in great rage to destroy and annihilate many. Ma nʼoge a kwa, ozi ga-esi nʼọwụwa anyanwụ na nʼugwu bịa, nke ga-emenye ya egwu. Nʼihi ya, ọ ga-eji oke iwe pụọ ibibi ọtụtụ ndị ma laakwa ha nʼiyi.
45 He will pitch his palace tents between the seas and the beautiful holy mountain, then come to his end with no helper. Ọ ga-akwụba ụlọeze ya nʼetiti ugwu ọma ahụ dị nsọ na nʼoke osimiri, nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]