Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Daniel 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 At that time Michael, the great prince guarding your people's children, will arise. There will be distress unmatched since nations began, until then. At that time your people—all listed in the book—will be rescued. “Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta.
2 Many sleeping in earth's dust will wake—some to everlasting life, some to shame and everlasting contempt. Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi.
3 The wise will shine like the sky's brightness; those who turn many to righteousness, like stars, forever and ever. Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.
4 But you, Daniel, close these words and seal the book until the end time. Many will roam back and forth, and knowledge will grow. Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.”
5 Then I, Daniel, looked and saw two others standing, one on each bank of the river. Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ.
6 One asked the linen-clad man above the river's waters, "How long till these wonders end?" Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?”
7 I heard the man dressed in linen, above the river's waters, lift his right hand and left toward heaven and swear by the One who lives forever: for a time, times, and half a time; when the shattering of the holy people's power is finished, all these things will be finished. Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.”
8 I heard, but didn't understand, so I said, "My lord, what is the end of these things?" Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?”
9 He said, "Go, Daniel, for the words are shut and sealed until the time of the end. Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge.
10 Many will be purified, whitened, refined; the wicked will keep doing evil. None of the wicked will understand, but the wise will understand. Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara.
11 From the daily sacrifice's removal and the setting up of the abomination that causes desolation: 1,290 days. “Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu. (1,290)
12 Blessed is the one who waits and reaches the 1,335 days. Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise (1,335) ahụ gafere.
13 But you, go to the end. You will rest, then stand for your inheritance at the end of the days." “Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]