Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 9 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 But Saul, still breathing threats and murder against the Lord's disciples, went to the high priest, Ma ugbu a, Sọl, onye ume niile ọ na-ekupụta bụ naanị ịba mba na igbu ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru onyeisi nchụaja,
2 and asked him for letters to Damascus's synagogues, so that if he found any of the Way, men or women, he could bring them bound to Jerusalem. rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.
3 As he traveled and was approaching Damascus, suddenly a light from heaven flashed around him. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu.
4 He fell to the ground and heard a voice saying, "Saul, Saul, why are you persecuting me?" Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”
5 He said, "Who are you, Lord?" And he said, "I am Jesus, whom you are persecuting. Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.
6 But rise and enter the city, and you will be told what you must do." Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.”
7 The men traveling with him stood speechless, hearing the voice but seeing no one. Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla.
8 Saul got up from the ground, but with eyes open he saw nothing; they led him by the hand and brought him into Damascus. Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs.
9 He was blind for three days and neither ate nor drank. Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ.
10 A disciple named Ananias lived in Damascus. In a vision the Lord said, "Ananias." He answered, "Here I am, Lord." Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ, “Ananayas!” Ọ sịrị, “Lee m, Onyenwe anyị.”
11 The Lord said to him, "Get up, go to the street called Straight, and look in Judas's house for a man from Tarsus named Saul—he is praying, Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa nʼụlọ Judas nke dị nʼokporoụzọ Guzoziri Eguzo, jụọ ajụjụ banyere onye a na-akpọ Sọl, onye si Tasọs, ọ nọ ugbu a na-ekpe ekpere.
12 and in a vision has seen a man named Ananias come in and place his hands on him so he may see again." Ọ hụla ọhụ na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, ibikwasị ya aka nʼisi ka ọ hụ ụzọ.”
13 Ananias replied, "Lord, many have told me about this man—the harm he's done your holy ones in Jerusalem. Ma Ananayas zara, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ niile nwoke a mere ndị nsọ gị bi na Jerusalem.
14 And here he has authority from the chief priests to bind all who call on your name." Ugbu a, ọ natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja bịa nʼebe a ka o jide ndị niile na-akpọku aha gị.”
15 But the Lord said to him, "Go, for this man is my chosen instrument to carry my name before nations, kings, and Israel's people. Ma Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa, nʼihi na ahọpụtala m nwoke a ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ewegara mba ndị ọzọ, ndị eze na ụmụ Izrel aha m.
16 For I will show him how much he must suffer for the sake of my name." Mụ onwe m ga-egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịta nʼihi aha m.”
17 Ananias went and entered the house. He laid hands on Saul and said, "Brother Saul, the Lord Jesus—who appeared to you on the road you traveled—sent me so you may see again and be filled with the Holy Spirit." Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
18 Immediately something like scales fell from his eyes, and he could see again. He got up and was baptized, Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim.
19 and after eating, he regained his strength. For some days he was with the disciples in Damascus, Mgbe o richara nri, ọ nwetakwara ike ya. Ya na ndị na-eso ụzọ Jisọs nọrọ na Damaskọs ọtụtụ ụbọchị.
20 and immediately he began proclaiming Jesus in the synagogues, that he is the Son of our Father. Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke.
21 All who heard were amazed and said, "Isn't this the man who caused such havoc in Jerusalem among those calling on this name? And hasn't he come here for this: to bring them bound before the chief priests?" O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?”
22 But Saul grew stronger still, bewildering the Jews living in Damascus by proving this one is the Christ. Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
23 After many days had passed, the Jews plotted to kill him, Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Juu gbara izu igbu ya.
24 but Saul learned of their plot; they watched the gates day and night to kill him, Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya.
25 but at night his disciples lowered him through the wall in a basket. Ma ụmụazụ ya kunyere ya na nkata amanyere ụdọ bufee ya nʼofe mgbidi nke obodo.
26 Arriving in Jerusalem, he tried to join the disciples, but all feared him, not believing he was a disciple. Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha.
27 But Barnabas took him to the apostles and explained how Saul had seen the Lord on the road, who spoke to him, and how in Damascus he had spoken boldly in Jesus' name. Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu.
28 So he was with them, moving freely about Jerusalem, speaking boldly in the name of the Lord. O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu.
29 He spoke and debated with the Hellenists, but they were seeking to kill him. Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya.
30 When the brothers learned this, they brought him down to Caesarea and sent him off to Tarsus. Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs.
31 So the church throughout Judea, Galilee, and Samaria had peace and was strengthened; walking in the fear of the Lord and comforted by the Holy Spirit, it multiplied in number. Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ.
32 As Peter traveled among all the believers, he also went down to the holy ones living in Lydda. Pita na-ejegharị nʼetiti ndị kwere ekwe, ọ gakwara leta ndị nsọ nọ nʼobodo Lida.
33 There he found a man named Aeneas, bedridden for eight years, who was paralyzed. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
34 Peter said to him, "Aeneas, Jesus Christ heals you. Get up, make your bed." He got up at once. Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ.
35 And all who lived in Lydda and Sharon saw him, and they turned to the Lord. Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị.
36 In Joppa lived a disciple named Tabitha, meaning Dorcas. She was full of good works and help for the poor. Nʼobodo Jopa, e nwere otu onye nwanyị na-eso ụzọ ya, nke aha ya bụ Tabita nke pụtakwara Dọkas na asụsụ Griik. O jupụtara nʼọrụ ọma, na ọrụ obi ebere nʼebe ụmụ ogbenye nọ.
37 In those days she got sick and died; they washed her and laid her in an upstairs room. Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu.
38 Since Lydda was near Joppa, disciples who heard Peter was there sent two men to him, urging, "Don't delay coming to us." Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.”
39 So Peter got up and went with them. When he arrived, they brought him to the upper room. All the widows stood beside him crying, showing the tunics and cloaks Dorcas had made while with them. Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.
40 Peter sent everyone out, knelt, and prayed. Turning to the body, he said, "Tabitha, get up." She opened her eyes, saw Peter, and sat up. Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala.
41 Giving her his hand, he raised her up. Calling the holy ones and the widows, he presented her alive. O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ.
42 And it became known throughout all Joppa, and many believed in the Lord. A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.
43 And he stayed in Joppa for many days with a man named Simon, a tanner. Ọ nọgidere na Jopa ọtụtụ ụbọchị. Ọ nọdụrụ nʼụlọ Saimọn, onye ọrụ ya bụ idozi akpụkpọ anụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]