Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 8 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Saul approved of Stephen's killing. That day a great persecution erupted against the Jerusalem church, scattering everyone except the apostles through Judea and Samaria. Sọl kwenyere ka e gbuo ya. Nʼụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ dị na Jerusalem. Ndị niile kwere ekwe, ma ewezuga ndị ozi nʼonwe ha gbasasịrị nʼala Judịa na Sameria.
2 Devout men buried Stephen and mourned loudly over him. Ndị ikom, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin gaa lie ya. Ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ya.
3 But Saul was destroying the church, entering house after house, dragging off men and women, throwing them in prison. Ma Sọl bidoro ịla nzukọ nʼiyi. Ọ na-abanye site nʼụlọ ga nʼụlọ ndị kwere ekwe na-adọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nʼụlọ mkpọrọ.
4 So those scattered went everywhere, proclaiming the good news of the word. Ndị ahụ a chụsasịrị zisara oziọma nʼebe niile ha gbagara.
5 Philip went down to the city of Samaria and proclaimed Christ to them. Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst.
6 The crowds paid attention together to Philip's words, hearing and seeing the signs he did. Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ.
7 Unclean spirits came out of many who were possessed, screaming loudly, and many paralyzed and lame were healed. Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ.
8 So there was great joy in that city. Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ.
9 A man named Simon had already practiced magic in that city, amazing Samaria's people and claiming to be someone great. Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu.
10 Everyone, from least to greatest, listened to him, saying, "This man is God's power, called Great." Onye ọbụla, ma onye ukwu ma onye nta, na-ege ya ntị na-asịkwa “Nwoke a bụ ike Chineke ahụ a na-akpọ Ike dị ukwuu.”
11 They paid attention to him because for a long time he had amazed them with his magic. Ha na-ege ya ntị oge niile nʼihi na ọ na-eji ike mgbaasị ya na-eme ihe juru ha anya.
12 But when they believed Philip's good news about the kingdom of our Father and the name of Jesus Christ, men and women were baptized. Ma mgbe ha kwenyere nʼoziọma Filip dịka ọ na-ekwusa ihe banyere oziọma alaeze Chineke na aha Jisọs Kraịst, e mere ha baptizim, ma nwoke ma nwanyị ha.
13 Simon himself believed, was baptized, and stayed close to Philip, amazed at the signs and great miracles he saw. Saimọn kwerekwara otu aka ahụ. Mgbe e mechara ya baptizim, o bidoro iso Filip na-agagharị nʼihi ihe ịrịbama na ọrụ ebube niile Filip rụrụ, tụrụ ya nʼanya nke ukwuu.
14 When the apostles in Jerusalem heard Samaria had received our Father's word, they sent Peter and John to them. Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu nke Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn.
15 When they arrived, they prayed for them that they might receive the Holy Spirit, Mgbe ha bịaruru, ha kpere ekpere ka ha nata Mmụọ Nsọ.
16 for the Holy Spirit had not yet fallen on any of them; they were only baptized into the name of the Lord Jesus. Nʼihi na Mmụọ Nsọ abịakwasịbeghị onye ọbụla nʼime ha, kama ihe e mere ha bụ baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.
17 Then they laid their hands on them, and they received the Holy Spirit. Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ.
18 When Simon saw the Spirit given through the apostles' laying on of hands, he offered them money, Mgbe Saimọn hụrụ na a na-enye Mmụọ Nsọ naanị site nʼaka ndị ozi bikwasịrị ha nʼisi, o chere ha ego nʼihu,
19 saying, "Give me this power too, so whoever I lay hands on receives the Holy Spirit." sị, “nyekwanụ m ike a. Ka onye ọbụla m bikwasịrị aka nʼisi nata Mmụọ Nsọ.”
20 Peter said to him, "May your silver perish with you, since you thought you could buy our Father's gift with money! Ma Pita sịrị, “Gị na ego gị laakwa nʼiyi. Nʼihi na i chere na ị ga-eji ego zụta onyinye Chineke.
21 You have no part or share in this matter, for your heart is not right before our Father. I nweghị oke maọbụ ihe nketa nʼọrụ a, nʼihi na obi gị ezighị ezi nʼihu Chineke.
22 So turn from this evil, and pray to our Father that, if possible, your heart's intent may be forgiven you. Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ọ ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị.
23 I see you poisoned by bitterness and bound by evil." Nʼihi na ahụrụ m na ị jupụtara nʼobi ilu na ị nọkwa nʼagbụ nke ajọ omume.”
24 Simon answered, "Pray to God for me, that nothing you have said may come upon me." Saimọn zara Pita sị, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a niile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”
25 So, having testified and spoken our Lord Jesus's word, they returned to Jerusalem, preaching the good news in many Samaritan villages. Mgbe ha gbachara akaebe, ma kwusaakwa okwu nke Onyenwe anyị, ha lọghachiri Jerusalem. Ma mgbe ha na-ala ha zisara oziọma nʼọtụtụ obodo ndị Sameria.
26 Then an angel of our Father told Philip, "Get up and go south to the road going down from Jerusalem to Gaza"—a desert road. Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip sị, “Gaa na ndịda, nʼụzọ ọzara nke siri Jerusalem gawa Gaza, ụzọ ahụ bụ ụzọ ọzara.”
27 He got up and went. There was an Ethiopian eunuch, a court official of Candace, queen of the Ethiopians, in charge of all her treasury, who had come to Jerusalem to worship, O biliri gawa. Mgbe ahụ, otu onye Itiopia bụ onye onozi, bụrụkwa onyeisi ozi dị mkpa, onye na-eche akụ nke Kandis, eze nwanyị ndị Itiopia, gara Jerusalem ife Chineke.
28 and was returning, seated in his chariot and reading the prophet Isaiah. Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nʼụgbọala ya, nke ịnyịnya na-adọkpụgharị, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma.
29 And the Holy Spirit said to Philip, "Go over and catch up with that chariot." Mmụọ Nsọ gwara Filip, “Gaa ụgbọ ahụ nso, sonyekwara ya.”
30 Philip ran up, heard him reading the prophet Isaiah, and asked, "Do you understand what you're reading?" Filip gara nso, nụkwa ka ọ na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Ọ sịrị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?”
31 He said, "How can I, unless someone guides me?" and invited Philip up to sit with him. Ọ sịrị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nʼụgbọala ahụ, soro ya nọdụ nʼime ya.
32 Now the passage of Scripture he was reading was this: "Like a sheep he was led to the slaughter, and like a lamb silent before its shearer, so he did not open his mouth. Mpaghara akwụkwọ nsọ ọ na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nʼebe a ga-egbu ya. Dịka nwa atụrụ na-anọ nwayọọ nʼihu onye na-akpacha ya ajị, otu a ka ọ na-emegheghị ọnụ ya.
33 In his humiliation justice was denied him. Who can describe his generation? For his life is taken away from the earth." Nʼọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Onye ga-akọ akụkọ banyere agbụrụ ya? Nʼihi na e sitere nʼụwa wepụ ndụ ya.”
34 The eunuch said to Philip, "Tell me, of whom does the prophet say this—himself, or someone else?" Onozi ahụ jụrụ Filip, “Biko, gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?”
35 Philip opened his mouth and, starting from this Scripture, told him the good news about Jesus. Mgbe ahụ, Filip malitere ikwu okwu, site nʼakụkọ akwụkwọ nsọ ọ na-agụ kọọrọ ya akụkọ oziọma banyere Jisọs.
36 Traveling the road, they reached water, and the eunuch said, "Look, water! What stops me from being baptized?" Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Onozi ahụ sịrị, “Lee, nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?”
37 Not in this edition Filip sịrị, “Ọ bụrụ na i ji obi gị niile kwere, e nwere ike ime gị baptizim.” Onozi ahụ sịrị, “Ekwere m na Jisọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke.”
38 He ordered the chariot to stop; both went down into the water, Philip and the eunuch, and Philip baptized him. O kwuru ka a kwụsị ụgbọala ahụ. Mgbe ahụ, onozi ahụ na Filip wụdatara banye nʼime mmiri ebe Filip nọ mee ya baptizim.
39 When they came up out of the water, the Spirit of our Father snatched Philip away; the eunuch never saw him again, but went on his way rejoicing. Mgbe ha sitere nʼime mmiri ahụ pụta, ngwangwa Mmụọ Onyenwe anyị sitere nʼebe ahụ wepụ Filip, onye onozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ; kama ọ gara nʼihu nʼije ya na-aṅụrịkwa ọṅụ.
40 Philip found himself at Azotus. He traveled through, announcing the good news in every town until he reached Caesarea. Ebe ọzọ a hụrụ Filip bụ nʼAzọtus. O jegharịkwara nʼobodo niile dị nʼala ahụ, na-ekwusa oziọma ruo mgbe ọ bịaruru Sizaria.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]