Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 7 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then the high priest asked, "Are these things true?" Onyeisi nchụaja sịrị ya, “Ị nụrụ ihe ndị a, ọ bụ eziokwu?”
2 Stephen said, "Brothers and fathers, listen: Our Father of glory appeared to our father Abraham in Mesopotamia, before he lived in Haran, Ọ sịrị, “Ụmụnna m na ndị nna, geenụ m ntị. Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Ebraham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamịa, tupu ọ gaa biri na Haran.
3 and told him, 'Leave your land and relatives, and go to the land I'll show you.' Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’
4 He left the Babylonians' land and settled in Haran. After his father died, our Father moved him from there into this land you now live in. “Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a.
5 He gave him no inheritance in it, not even a foot of ground—yet promised it to him and his descendants after him as a possession, though he had no child. O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa.
6 And our Father said his offspring would be foreigners in a land not their own, enslaved and mistreated 400 years. Ma Chineke gwara ya otu a, na, ‘Ụmụ ụmụ ya ga-ebi dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha, ndị ga-eji ha mere ohu, ma mejọọkwa ha narị afọ anọ.
7 'I will judge the nation they serve,' our Father said, 'and after, they will come out and worship me in this place.' Mana aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ.’ Chineke kwukwara sị, ‘Mgbe nke a gasịrị, ha ga-esi na mba ahụ pụta, bịa fee m ofufe nʼebe a.’
8 He gave him the covenant of circumcision. Abraham fathered Isaac and circumcised him on the eighth day; Isaac fathered Jacob, and Jacob the twelve ancestors. O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.
9 The ancestors, jealous of Joseph, sold him into Egypt, but our Father was with him, “Nʼihi na ndị nna ochie ahụ nwere ekworo nʼebe Josef nọ. Ha resi ya ndị Ijipt dịka ohu. Ma Chineke nọnyeere ya,
10 and rescued him from all his troubles, gave him favor and wisdom before Pharaoh king of Egypt, who made him ruler over Egypt and Pharaoh's whole household. zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.
11 A famine and great suffering struck all Egypt and Canaan, and our fathers found no food. “Nʼoge ahụ, ụnwụ dara nʼala Ijipt na nʼala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri.
12 Hearing there was grain in Egypt, Jacob sent our fathers there first. Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri ọka dị nʼala Ijipt, o zipụrụ nna nna anyị ha ka ha gaa njem mbụ ha nʼIjipt. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipt.
13 On the second visit, Joseph made himself known to his brothers, and Pharaoh learned of Joseph's family. Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef.
14 And Joseph sent for his father Jacob and all his relatives, seventy-five persons in all. Mgbe ahụ, Josef ziri ozi ka a kpọta nna ya bụ Jekọb na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise ka ha bịakwute ya.
15 And Jacob went down into Egypt, and he died, he and our fathers. Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ.
16 They were taken back to Shechem, and buried in the tomb Abraham had bought for silver from Hamor's sons in Shechem. E budatara ozu ha na Shekem, ebe e liri ha nʼili nke Ebraham jiri ego ọlaọcha zụta nʼaka ụmụ Hamọ nʼala Shekem.
17 As the time of the promise our Father gave Abraham neared, the people grew and multiplied in Egypt, “Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa na-abịaru nso, ndị Izrel nọ nʼIjipt mụbara nke ukwuu,
18 until there arose over Egypt another king who did not know Joseph. ruo mgbe eze ọzọ nke na-amaghị Josef, bidoro ịchị ọchịchị nʼala Ijipt.
19 This king exploited our people and mistreated our fathers, forcing them to abandon their infants to die. O megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbukwaa ha. Manye ndị nna nna anyị ha ka ha tufuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha ghara ịdị ndụ.
20 At that time Moses was born, beautiful in our Father's sight. He was raised three months in his father's house. “Ọ bụ nʼoge a ka a mụrụ Mosis, ọ mara mma nke ukwuu nʼanya Chineke. A zụrụ ya naanị ọnwa atọ nʼụlọ nna ya.
21 And when he was abandoned, Pharaoh's daughter adopted him and brought him up as her own son. Mgbe e tufuru ya, ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nwoke nke aka ya.
22 Moses was trained in all Egyptian wisdom, and was strong in speech and action. A zụrụ Mosis nʼamamihe niile nke ndị Ijipt, ọ bụrụ dike nʼokwu na nʼọrụ ịtụnanya.
23 When he was forty years old, he decided to visit his brothers, the sons of Israel. “Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nʼuche ịga ileta ụmụnna ya ndị Izrel.
24 Seeing one of them wronged, he defended the oppressed man and avenged him by striking down the Egyptian. Mgbe ọ hụrụ otu onye nʼime ha nke onye Ijipt na-emegide ya, ọ lụtara ya ọgụ, bọtakwara ya ọbọ site nʼigbu onye Ijipt ahụ.
25 He thought his brothers would understand our Father was giving them salvation through his hand, but they didn't understand. Mosis chere na ụmụnna ya ga-aghọta na Chineke akpọlitela ya isite nʼaka ya napụta ha. Ma ha aghọtaghị.
26 The next day he came upon them as they were fighting and tried to reconcile them, saying, 'Men, you are brothers. Why do you wrong each other?' Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’
27 But the man wronging his neighbor shoved Moses aside, saying, 'Who made you ruler and judge over us? “Ma nwoke ahụ nke na-emegbu nwanna ya nupuru ya sị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị?
28 Do you want to kill me as you killed the Egyptian yesterday?' Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’
29 At this word, Moses fled and lived as a foreigner in the land of Midian, where he fathered two sons. Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ.
30 Forty years later, an angel appeared to him in the wilderness of Mount Sinai, in a burning bush's flame. “Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị.
31 Moses saw it and was amazed; as he approached to look closer, our Father's voice came: Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị,
32 'I am the God of your fathers—the God of Abraham, Isaac, and Jacob.' Moses trembled, not daring to look. ‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’ Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.
33 Then our Father told him, 'Take the sandals off your feet, for the place you're standing on is holy ground.' “Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.
34 I have indeed seen my people's suffering in Egypt, heard their groaning, and come down to rescue them. Now go—I'm sending you to Egypt. Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’
35 This Moses, whom they rejected, saying, 'Who made you ruler and judge?'—this is the one our Father sent as both ruler and redeemer, through the hand of the angel who appeared to him in the bush. “Ọ bụ otu Mosis ahụ ha jụrụ ajụ, mgbe ha sịrị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe?’ Ọ bụkwa ya ka Chineke zigara ị bụ onyeisi na onye nnapụta ha, site nʼinyeaka mmụọ ozi ahụ mere ka ọ hụ ya nʼọhịa ahụ.
36 This man led them out, doing wonders and signs in the land of Egypt, at the Red Sea, and in the wilderness for forty years. O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.
37 This is the Moses who told Israel's sons, 'Our Father will raise up a prophet like me for you, from your brothers.' “Onye a bụ Mosis ahụ gwara ụmụ Izrel, sị, ‘Chineke ga-eme ka onye amụma nke dị ka m, biliere unu site nʼetiti ụmụnne unu.’
38 This is the one who was in the wilderness assembly with the angel speaking to him at Mount Sinai, and with our fathers—he received living words to give us. Ya onwe ya nọ nʼọgbakọ nʼọzara, ya na mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nʼUgwu Saịnaị, na nna nna anyị ha; ebe ọ natakwara okwu dị ndụ inye anyị.
39 Our fathers refused to obey him; they rejected him and in their hearts turned back to Egypt, “Ma nna nna anyị ha jụrụ irubere ya isi. Kama ha nupuru ya nʼakụkụ, ma tụgharịa laghachi azụ nʼIjipt nʼobi ha,
40 telling Aaron, 'Make us gods to go ahead of us. As for this Moses who led us out of the land of Egypt, we don't know what happened to him.' na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’
41 They made a calf in those days, offered a sacrifice to the idol, and celebrated what their hands had made. Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha.
42 But our Father turned away, giving them over to worship the host of heaven, as written in the prophets' book: 'Did you bring me slaughtered animals and sacrifices for forty years in the wilderness, house of Israel? Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma, “ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
43 You carried Moloch's tent and your god Rephan's star, the idols you fashioned to worship them; so I will banish you far beyond Babylon.' Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk na kpakpando nke chi unu bụ Refan, bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha. Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’
44 Our ancestors had the tent of witness in the wilderness, as he who spoke to Moses directed him to make it, matching the pattern he'd seen. “Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis.
45 Our fathers in turn brought it in with Joshua when they dispossessed the nations that our Father drove out before them. So it was until the days of David, Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.
46 who found favor with our Father and asked to find a dwelling place for our Father. Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi.
47 But it was Solomon who built a house for him. Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
48 Yet the Most High does not live in houses made by human hands, as the prophet says: “Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
49 'Heaven is my throne, and the earth is my footstool. What kind of house will you build for me, says our Father, or what is the place of my rest? “ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru.
50 Did not my hand make all these things?' Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’
51 "You stubborn people, uncircumcised in heart and ears, always resist the Holy Spirit—like your fathers, so do you. “Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere.
52 Which of the prophets did your fathers not persecute? They killed those who announced beforehand the Righteous One's coming—whom you have now betrayed and murdered. Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya.
53 You who received the law through angels and yet did not keep it." Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site nʼaka ndị mmụọ ozi, ma unu edebeghị ya.”
54 Now when they heard these things they were enraged, and they ground their teeth at him. Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ.
55 But Stephen, full of the Holy Spirit, looked into heaven, saw the glory of our Father, and Jesus standing at the right hand of our Father. Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke.
56 And he said, "Look, I see the heavens opened and the Son of Man standing at our Father's right hand." Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.”
57 But they cried out with a loud voice, covered their ears, and rushed at him. Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya,
58 They threw him out of the city and stoned him. The witnesses laid their coats at the feet of a young man named Saul. dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl.
59 And as they were stoning him, Stephen called out, "Lord Jesus, receive my spirit." Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.”
60 Kneeling, he cried out loudly, "Lord, do not hold this sin against them." Then he fell asleep. O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]