Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 6 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In those days, as the disciples multiplied, the Greek-speaking Jews grumbled against the Hebrews because their widows were overlooked in the daily distribution of food. Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị.
2 So the Twelve called all the disciples together and said, "It's not right for us to neglect our Father's word to serve tables. Nʼihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ ọgbakọ ndị niile na-eso ụzọ ya sị, “O zighị ezi na anyị ga-ahapụ ikwusa oziọma Chineke bido na-eke nri.
3 So, brothers, pick seven men among you, well-respected, full of the Holy Spirit and wisdom, whom we'll appoint to this task. Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.
4 But we will devote ourselves to prayer and to the ministry of the word." Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.”
5 The whole assembly approved, and chose Stephen—full of faith and the Holy Spirit—along with Philip, Prochorus, Nicanor, Timon, Parmenas, and Nicolaus, a convert from Antioch. Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.
6 They presented these men to the apostles, who prayed and laid their hands on them. Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi.
7 The word of our Father spread, and disciples in Jerusalem multiplied greatly; a great number of priests became obedient to the faith. Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.
8 Now Stephen, full of grace and power, was performing great wonders and signs among the people. Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ.
9 Some from the so-called Synagogue of the Freedmen—Cyrenians, Alexandrians, and men from Cilicia and Asia—rose up to argue with Stephen. Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka.
10 Yet they could not stand up against the wisdom and the Spirit with which he was speaking. Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu.
11 Then they secretly instructed men to say, "We heard him speak blasphemous words against Moses and God." Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.”
12 They stirred up the people, elders, and scribes; came upon him, seized him, and brought him before the council. Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe.
13 They brought in false witnesses, saying, "This man never stops speaking against this holy place and the law. Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị.
14 For we heard him say this Jesus of Nazareth will destroy this place and change the customs Moses handed down to us." Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”
15 Everyone sitting in the council stared at him and saw his face was like an angel's face. Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]