Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 5 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now a man named Ananias, together with his wife Sapphira, sold a piece of property. Ma otu nwoke a na-akpọ Ananayas na nwunye ya bụ Safaịra rekwara ala nke ha.
2 He kept back part of the proceeds for himself, with his wife aware, and brought only a portion, laying it at the apostles' feet. Na nkwekọrịta ya na nwunye ya, o zoro ụfọdụ ego site nʼego ha retara nʼala ha ahụ, weta nke fọdụrụ bịa tọgbọ nʼụkwụ ndị ozi.
3 But Peter said, "Ananias, why has Satan filled your heart to lie to the Holy Spirit and keep back part of the land's price? Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị?
4 Wasn't it yours while unsold? After selling, wasn't the money yours to control? Why did you plan this in your heart? You didn't lie to people, but to our Father." Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.”
5 Hearing these words, Ananias fell down and died; great fear seized all who heard. Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere.
6 Then the young men rose, wrapped up his body, carried him out, and buried him. Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie.
7 About three hours later his wife came in, not knowing what had happened. Mgbe ihe dịka awa atọ gasịrị, nwunye ya batakwara, ma ọ matabeghị ihe mere di ya.
8 Peter asked her, "Tell me, did you sell the land for this much?" She said, "Yes, for that much." Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?” Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.”
9 Then Peter said to her, "Why did you conspire to test the Spirit of our Father? Look, the feet of those who buried your husband are at the door, and they'll carry you out too." Pita sịrị ya, “Gịnị mere unu jiri kpebie ịnwa Mmụọ nke Onyenwe anyị ọnwụnwa? Gee ntị, nzọ ụkwụ ndị buuru di gị gaa lie nọ nʼọnụ ụzọ. Ha ga-ebupụkwa gị.”
10 At once she fell at his feet and died. The young men came in, found her dead, carried her out, and buried her beside her husband. Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya.
11 And great fear came upon the whole church and upon all who heard of these things. Oke egwu tụrụ nzukọ ahụ niile, tụọkwa ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe ndị a.
12 Many signs and wonders happened among the people through the apostles' hands. They all gathered together in Solomon's Portico. Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Ha niile na-ezukọ na mgbe ụlọ Solomọn.
13 None of the rest dared to join them, but the people held them in high honor. O nweghị onye ọbụla kwere iso ha ọzọ, nʼagbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-asọpụrụ ha.
14 Even more believers were added to the Lord—crowds of men and women, Ma otu ọ dị, ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwanyị kwere nʼOnyenwe anyị sonyere ha.
15 so they even carried the sick into the streets and put them on cots and mats, hoping that at least Peter's shadow might fall on some of them as he passed. Nʼihi nke a, ndị mmadụ bupụtara ndị ọrịa nʼokporoụzọ nibe ha nʼute na ihe ndina, ka ọ ga-abụ mgbe Pita na-agafe onyinyo ya ga-adakwasị ụfọdụ nʼime ha.
16 Crowds also came from towns around Jerusalem, bringing the sick and those tormented by unclean spirits, and all were healed. Igwe mmadụ zukọtara site nʼobodo ndị dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị nrịa nrịa, na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu, a gwọkwara ha niile.
17 The high priest rose up, and all with him, the Sadducee party, and they were filled with jealousy. Mgbe ahụ onyeisi nchụaja na ndị otu ya so nʼotu ndị Sadusii ka ekworo jupụtara obi.
18 They arrested the apostles and put them in the public prison. Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ.
19 But at night an angel of our Father opened the prison doors, led them out, and said, Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị,
20 "Go, stand in the temple and speak to the people all the words of this Life." “Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”
21 Hearing this, they went into the temple at dawn and began teaching. When the high priest and those with him arrived, they convened the council—the full assembly of elders of Israel—and sent to the jail to have them brought. Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha.
22 But the guards found no one there when they arrived; they returned and reported, Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ,
23 "We found the prison locked tight, guards standing at the doors, but opening them, found no one inside." “Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.”
24 Hearing this, the temple guard captain and chief priests were baffled, wondering where it would lead. Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta.
25 Someone came and reported, "Look, the men you jailed are standing in the temple teaching the people!" Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.”
26 Then the captain and officers went and brought them, without force, fearing the people would stone them. Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.
27 When they had brought them, they set them before the council. And the high priest questioned them, Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ,
28 saying, "We strictly ordered you not to teach in this name, yet you've filled Jerusalem with your teaching and intend to bring this man's blood on us." sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.”
29 But Peter and the apostles answered, "We must obey our Father rather than men. Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ.
30 The God of our fathers raised Jesus, whom you killed by hanging him on a tree. Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi.
31 Our Father exalted him to his own right hand as Ruler and Savior, to give Israel repentance and forgiveness of sins. Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie.
32 We are witnesses of these things, and so is the Holy Spirit, whom our Father gave to those who obey him." Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.”
33 When they heard this, they were enraged and wanted to kill them. Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha.
34 But a Pharisee named Gamaliel, a law teacher honored by all the people, stood up in the council and ordered the men taken outside briefly. Ma otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, bụrụkwa onye ozizi iwu a na-asọpụrụ, aha ya bụ Gamaliel, biliri ọtọ nʼetiti ọgbakọ ahụ, nye iwu ka a kpọpụ ndị ozi ahụ nʼezi nwa oge nta.
35 He told them, "Israelites, think carefully about what you're about to do with these men. Ọ sịrị ha, “Ndị Izrel, leziekwanụ anya nke ọma ihe unu na-achọ ime ndị a.
36 Before this, Theudas appeared, claiming to be somebody; about 400 men followed him. He was killed, his followers all scattered, and it came to nothing. Nʼoge gara aga Teodas pụtara na-egosi na ya bụ onye pụrụ iche, ihe dịka narị mmadụ anọ sokwara ya, mgbe e gburu ya, ndị niile sooro ya gbasasịrị ihe niile a kwụsịkwa.
37 After him, Judas the Galilean rose up during the census and drew people away after him. He too died, and all who followed him were scattered. Mgbe nke ya gasịrị, Judas onye Galili pụtakwara gosi onwe ya nʼoge a na-agụ ọnụọgụgụ mmadụ, o nwetakwara ndị sooro ya. Mgbe e gbukwara ya, ndị niile na-eso ya gbasasịrị.
38 Now I tell you: stay away from these men and leave them alone. If this plan or work is from men, it will fail. Ya mere, agwa m unu, hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya.
39 But if it's from our Father, you won't be able to overthrow them; you might even find yourselves fighting our Father." So they were persuaded by him. Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”
40 Persuaded by him, they called in the apostles, beat them, ordered them not to speak in the name of Jesus, and released them. Ọgbakọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi ahụ pịa ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nʼaha Jisọs, hapụkwa ha ka ha laa.
41 So they left the council, rejoicing they'd been counted worthy to be shamed for the name. Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya.
42 Every day, in the temple and house to house, they never stopped teaching and proclaiming the good news: the Christ is Jesus. Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]