Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 While Peter and John were speaking to the people, the priests, the temple captain, and the Sadducees came up to them, Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha.
2 greatly annoyed because they were teaching the people and proclaiming the resurrection from the dead in Jesus. Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị.
3 They arrested them and put them in custody until the next day, since it was already evening. Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi.
4 But many who heard the message believed, and the men's number reached about 5,000. Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise.
5 The next day their rulers, elders, and teachers of the law gathered together in Jerusalem, Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem.
6 with Annas the high priest, Caiaphas, John, Alexander, and all who were of the high-priestly family. Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja.
7 They stood them in the middle and asked, "By what power or by what name did you do this?" Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”
8 Then Peter, filled with the Holy Spirit, said to them, "Rulers of the people and elders, Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye.
9 if we're questioned today about a good deed to a sick man, how he was healed. Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya,
10 Know this, all of you and all Israel's people: by the name of Jesus Christ of Nazareth, whom you crucified, whom our Father raised from the dead—by him this man stands before you well. ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
11 This Jesus is "the stone you builders rejected, which has become the cornerstone." Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
12 Salvation is in no one else; no other name under heaven is given among people by which we must be saved." Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
13 Seeing Peter and John's boldness, and realizing they were uneducated, ordinary men, they were amazed and recognized they had been with Jesus. Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ.
14 Seeing the healed man standing with them, they had nothing to say against it. Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.
15 So they ordered them to leave the council, and then they conferred among themselves, Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a.
16 saying, "What should we do with these men? A notable sign has happened through them, plain to all who live in Jerusalem, and we cannot deny it. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.
17 But to stop this from spreading further among the people, let's warn them to speak to no one in this name again." Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.”
18 They called them and ordered them not to speak or teach at all in Jesus' name. Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs.
19 Peter and John answered them, "You judge whether it's right before our Father to listen to you rather than to him. Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị?
20 For we cannot help speaking about what we have seen and heard." Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.”
21 After more threats, they released them, finding no way to punish them because of the people, since all were glorifying our Father for what happened. Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.
22 For the man who had received this sign of healing was over forty years old. Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.
23 Once released, they went to their own people and reported all the chief priests and elders had said to them. Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha.
24 Hearing this, they raised their voices together to our Father and said, "Sovereign Father, you made heaven, earth, sea, and everything in them. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha.
25 You spoke by the Holy Spirit through the mouth of our father David, your servant: "Why did the nations rage and the peoples plot in vain?" Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “ ‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
26 The kings of the earth took their stand, and the rulers gathered together against our Father and against his Anointed." Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’
27 For truly, in this city, Herod and Pontius Pilate gathered with the Gentiles and peoples of Israel against your holy servant Jesus, whom you anointed, Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,
28 to do whatever your hand and your plan had decided beforehand should happen. ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.
29 Now, Father, see their threats, and let your servants speak your word with all boldness, Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.
30 as you reach out your hand to heal, and signs and wonders occur through the name of your holy servant Jesus. Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”
31 After they prayed, the place they were gathered in shook; all were filled with the Holy Spirit and spoke the word of our Father boldly. Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
32 All the believers were one in heart and soul; no one called any possession their own, but held everything in common. Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.
33 With great power the apostles testified to the Lord Jesus's resurrection, and great grace rested on them all. Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba.
34 No one among them was needy: all who owned land or houses sold them and brought the price of what was sold, O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha,
35 and laid it at the apostles' feet, and it was distributed to each according to their need. nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.
36 Joseph, a Levite from Cyprus, whom the apostles called Barnabas (which means Son of Encouragement), Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”).
37 sold a field he owned, brought the money, and laid it at the apostles' feet. O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]