Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Peter and John were going up to the temple at around three in the afternoon, the hour of prayer. Otu ụbọchị Pita na Jọn na-aga nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere nʼoge ekpere nʼelekere atọ nke ehihie.
2 A man lame from birth was carried and placed daily at the temple gate called Beautiful, to beg from those entering the temple. Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.
3 Seeing Peter and John about to go into the temple, he asked them for money. Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.
4 And Peter, gazing at him with John, said, "Look at us." Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”
5 And he fixed his attention on them, expecting to receive something from them. O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.
6 Peter said, "I own no silver or gold, but I give you what I have: in the name of Jesus Christ of Nazareth, rise and walk." Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”
7 Taking his right hand, he raised him up; instantly his feet and ankles grew strong. O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.
8 Jumping up, he stood, began walking, and entered the temple with them, walking, jumping, and praising our Father. Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.
9 And all the people saw him walking and praising our Father. Mmadụ niile hụrụ ya ka ọ na-agagharị na-eto Chineke,
10 They recognized him as the beggar who sat at the temple's Beautiful Gate, and were filled with wonder and amazement at what had happened to him. ha ghọtara na ọ bụ ya bụ onye ahụ na-anọ nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ahụ, nke a na-akpọ ọnụ ụzọ ama ọma na-arịọ arịrịọ. Ọ gbagwojuru ha anya nke ukwuu, gbakwa ha gharịị ihe mere ya.
11 As he held on to Peter and John, all the people ran to them at the portico called Solomon's, utterly astonished. Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.
12 Seeing this, Peter said to the people, "Israelites, why does this amaze you? Why stare at us, as if by our own power or godliness we made him walk? Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije?
13 The God of Abraham, Isaac, and Jacob, the God of our fathers, glorified his servant Jesus, whom you handed over and denied before Pilate, when Pilate decided to release him. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa.
14 But you denied the Holy and Righteous One, asking that a murderer be given to you. Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.
15 You killed the Author of life; our Father raised him from the dead. To this we are witnesses. Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a.
16 His name, through faith in his name, has made this man strong—the very man you see and know. And faith in Jesus has given him this complete health right before your eyes. Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile.
17 "And now, brothers, I know that you acted in ignorance, as did also your rulers. “Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa.
18 But our Father fulfilled what he predicted through all the prophets: his Christ would suffer. Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ.
19 Repent, then, and turn back, so your sins are wiped out, Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu,
20 that times of refreshing may come from our Father's presence, and that he may send the Christ appointed for you, Jesus, ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs.
21 whom heaven must receive until all things are restored, about which our Father spoke through his holy prophets long ago. Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ.
22 Moses said, 'Your Father will raise up a prophet like me for you, from your brothers. Listen to him in everything he tells you.' Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.
23 Anyone who does not listen to that prophet will be utterly destroyed from among the people.' Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’
24 All the prophets who spoke, from Samuel onward, also announced these days. “Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a.
25 You are the sons of the prophets and of the covenant our Father made with your fathers, telling Abraham, 'By your offspring all the families of the earth will be blessed.' Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’
26 Our Father raised up his servant and sent him to you first, to bless you by turning each of you from your evil." Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]