Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 When the day of Pentecost arrived, they were all together in one place. Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe.
2 Suddenly a sound like a violent, rushing wind came from heaven and filled the entire house where they sat. Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ.
3 What looked like divided tongues of fire appeared and rested on each one of them. Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu.
4 All were filled with the Holy Spirit and began speaking in other tongues, as the Spirit gave them words to say. Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
5 At that time devout Jews from every nation under heaven were living in Jerusalem. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe.
6 When this sound rang out, a crowd gathered, confused, since each one heard them speak in his own language. Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche.
7 They were amazed and astonished, saying, "Are not all these who are speaking Galileans? Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili?
8 How is it, then, that each of us hears them in our own native language? Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche?
9 Parthians, Medes, and Elamites; those who live in Mesopotamia, Judea and Cappadocia, Pontus and Asia, Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa,
10 Phrygia, Pamphylia, Egypt, the parts of Libya near Cyrene; visitors from Rome, Jews and converts to Judaism; ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa
11 Cretans and Arabs—we hear them telling in our own tongues the mighty works of our Father!" (ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.”
12 They were all amazed and perplexed, saying to one another, "What does this mean?" O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụ?”
13 But others mocked and said, "They are full of sweet wine." Ma ụfọdụ ndị ọzọ na-akwa ha emo na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”
14 But Peter stood with the eleven, raised his voice, and declared to them: "Men of Judea, everyone living in Jerusalem—know this and listen carefully to my words. Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu.
15 These people are not drunk, as you suppose, for it is only nine o'clock in the morning. Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ.
16 No, this is what was spoken through the prophet Joel: Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,
17 'And in the last days, says our Father, I will pour out my Spirit on all people; your sons and your daughters will prophesy, your young men will see visions, and your old men will dream dreams. “ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
18 Even on my male servants and my female servants in those days I will pour out my Spirit, and they will prophesy. Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.
19 I will show wonders in the heavens above and signs on the earth below—blood and fire and billows of smoke. Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ.
20 The sun will be turned to darkness and the moon to blood, before the great and glorious day of the Lord comes. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
21 And everyone who calls on the name of the Lord will be saved.'" Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’
22 "Men of Israel, hear these words: Jesus of Nazareth—a man our Father attested to you through miracles, wonders, and signs our Father did through him among you, as you yourselves know. “Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.
23 This man, handed over by our Father's set plan and foreknowledge, you crucified and killed by the hands of lawless men. Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu.
24 But our Father raised him, freeing him from death's agony, since death could not hold him. Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya.
25 For David says of him: 'I saw our Father always before me, for he's at my right hand, so I won't be shaken.' Devid kwuru banyere ya, “ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji.
26 Therefore my heart was glad and my tongue rejoiced; moreover, my body also will rest in hope. Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ; anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya,
27 For you will not abandon my soul to the grave, nor let your Holy One see decay. nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.
28 You have shown me the paths of life; you will fill me with gladness in your presence." I mere ka m mara ụzọ nke ndụ; ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’
29 "Brothers, I can tell you plainly: our ancestor David died, was buried, and his tomb remains with us to this day. “Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa.
30 Since he was a prophet, he knew our Father had sworn an oath to seat one of his descendants on his throne, Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
31 he foresaw and spoke of the Christ's resurrection, that he was not abandoned to the grave, nor his body saw decay. Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure.
32 This Jesus our Father raised up, and we are all witnesses of it. Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya.
33 So, lifted up to our Father's right hand, having received the promised Holy Spirit from the Father, he poured out what you now see and hear. Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.
34 For David never went up into heaven, but he himself says: "Our Father said to my Lord, 'Sit at my right hand, Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị, “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m,
35 until I make your enemies a footstool for your feet.'" ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’
36 "So let the whole house of Israel know for certain: our Father made this Jesus, whom you crucified, both Lord and Christ." “Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
37 Cut to the heart at this, they asked Peter and the other apostles, "Brothers, what should we do?" Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha sịrị Pita na ndị ozi ndị ọzọ, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
38 Peter said to them, "Repent, and each of you be baptized in the name of Jesus Christ for the forgiveness of your sins, and you will receive the gift of the Holy Spirit. Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
39 For the promise is for you, your children, and all far off—as many as the Sovereign our Father will call to himself." Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.”
40 And with many other words he warned and urged them, saying, "Save yourselves from this corrupt generation." O jiri ọtụtụ okwu ndị ọzọ gbaa ama, ma dụọkwa ha ọdụ sị, “Sitenụ nʼetiti ọgbọ a jọrọ njọ zọpụta onwe unu.”
41 So those who welcomed his message were baptized, and about 3,000 people were added that day. E mere ndị nabatara okwu ya baptizim, ha dị ihe ruru puku mmadụ atọ, a gụnyere nʼọnụọgụgụ ha.
42 They devoted themselves to the apostles' teaching and deep communion, to the breaking of bread and the prayers. Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere.
43 Awe came over everyone, and many wonders and signs were done through the apostles. Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche.
44 All who believed were together and had all things in common. Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ.
45 They sold their property and possessions and distributed the proceeds to all, as anyone needed. Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.
46 Every day, devoting themselves together in the temple, breaking bread house to house, they shared food with joyful, sincere hearts, Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.
47 praising our Father, with favor among all the people. The Lord added to their number daily those being saved. Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]