Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In my first book, Theophilus, I wrote about everything Jesus began to do and teach, Ezigbo enyi m Tiofilọs, nʼakwụkwọ m nke mbụ m dere gị banyere ihe niile Jisọs malitere ime nakwa ikuzi,
2 until the day he was taken up, having given commands through the Holy Spirit to the apostles he had chosen. ruo nʼụbọchị e mere ka ọ laghachi nʼeluigwe mgbe o sitere nʼike Mmụọ nsọ nyesịa ndị na-eso ụzọ ya iwu, bụ ndị ọ họpụtara.
3 After his suffering, he showed himself alive to them through many proofs, appearing to them forty days, speaking of our Father's kingdom. Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.
4 While staying with them, he ordered them not to leave Jerusalem but to wait for my Father's promise—"which," he said, "you heard from me; Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m.
5 for John baptized with water, but within a few days you will be baptized with the Holy Spirit." Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
6 So, gathered together, they asked, "Lord, will you restore the kingdom to Israel now?" Mgbe ha gbakọrọ, ha jụrụ ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugbu a ka i ga-enyeghachi Izrel alaeze ahụ?”
7 He said to them, "You're not to know times or seasons that my Father has set by his own authority. Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya.
8 But when the Holy Spirit falls on you, you'll gain power to be my witnesses—in Jerusalem, all Judea, Samaria, and earth's farthest reaches." Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.”
9 After he said these things, as they watched, he was lifted up, and a cloud took him from their sight. Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.
10 As they stared into heaven while he went, suddenly two men in white clothes stood beside them. Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso.
11 They said, "Galileans, why stare at the sky? This Jesus, taken from you into heaven, will return exactly as you saw him go." Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”
12 Then they returned to Jerusalem from the Mount called Olivet, near Jerusalem, about a half-mile away. Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
13 Entering, they went up to the upstairs room where they stayed: Peter, John, James, Andrew, Philip, Thomas, Bartholomew, Matthew, James son of Alphaeus, Simon the Zealot, and Judas son of James. Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis.
14 All these persisted together in prayer, with the women, Mary the mother of Jesus, and his brothers. Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike nʼekpere. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna ya.
15 In those days Peter stood up among the brothers (about 120 in all) and said, Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị,
16 "Brothers, the Scripture the Holy Spirit spoke beforehand through the mouth of David about Judas—who became guide to those who arrested Jesus—had to be fulfilled. “Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga.
17 For he was numbered among us and was allotted his share in this ministry." Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.”
18 (This man bought a field with the pay for his wrongdoing, then fell headfirst, burst open in the middle, and all his insides spilled out. Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.
19 This became known to everyone living in Jerusalem, so the field was named in their language Akeldama, that is, Field of Blood.). Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara.
20 "For it's written in the Book of Psalms: 'Let his camp become empty, with no one living there,' and 'Let another take his position.' Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’
21 So one of the men who accompanied us all along, while the Lord Jesus went in and out among us, Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,
22 from John's baptism until the day he was taken up from us—one of these must become with us a witness to his resurrection." bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”
23 And they put forward two—Joseph called Barsabbas, who was also called Justus, and Matthias. Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.
24 They prayed and said, "You, Lord Jesus, who know all hearts, show which one of these two you chose, Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.
25 to take the place in this ministry and apostleship that Judas left to go to his own place. Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.”
26 They cast lots for them; the lot fell to Matthias, and he was counted with the eleven apostles." Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]