Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

John 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Afterward Jesus showed himself again to the disciples by the Sea of Tiberias—this is how he showed himself. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee.
2 Simon Peter, Thomas called Twin, Nathanael from Cana in Galilee, Zebedee's sons, and two other disciples were together. Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya.
3 Simon Peter told them, "I'm going fishing." "We'll go with you," they said. So they went out and got into the boat, but caught nothing that night. Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla.
4 At daybreak Jesus stood on the shore, yet the disciples didn't know it was Jesus. Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs.
5 Jesus said to them, "Children, do you have any fish?" They answered him, "No." Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.”
6 He told them, "Cast the net on the boat's right side, and you'll find fish." So they cast it, and were no longer able to haul it in for the sheer number of fish. Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.
7 The disciple Jesus loved told Peter, "It's the Lord!" Hearing it was the Lord, Simon Peter wrapped his coat around him—he'd taken it off to work—and threw himself into the sea. Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ.
8 The other disciples came in the boat, dragging the net full of fish, since they were only about one hundred yards from shore. Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise.
9 When they went ashore, they saw a charcoal fire with fish on it, and bread. Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.
10 Jesus said to them, "Bring some of the fish you have just caught." Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.”
11 So Simon Peter climbed aboard and dragged the net ashore, full of 153 large fish; despite so many, it didn't tear. Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.
12 Jesus said to them, "Come, eat breakfast." None of the disciples dared ask him, "Who are you?"—they knew it was the Lord. Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị.
13 Jesus came, took the bread, and gave it to them, and the fish as well. Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ.
14 This was now the third time Jesus revealed himself to the disciples after being raised from the dead. Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.
15 After they ate breakfast, Jesus asked Simon Peter, "Simon, son of John, do you love me with all your heart, more than these?" He answered, "Yes, Lord, you know I love you as a friend." Jesus told him, "Feed my lambs." Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”
16 A second time Jesus asked, "Simon son of John, do you love me with all your heart?" He replied, "Yes, Lord, you know I love you as a friend." Jesus said, "Take care of my sheep." Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.”
17 A third time Jesus said to him, "Simon son of John, do you love me as a friend?" Peter was hurt that Jesus asked him a third time, "Do you love me as a friend?" and said, "Lord, you know everything; you know that I love you as a friend." Jesus said to him, "Feed my sheep." Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m.
18 "Truly, truly, I tell you: when you were young, you dressed yourself and went where you wanted; but when you're old, you'll stretch out your hands, and another will dress you and take you where you don't want to go." Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”
19 Jesus said this to show by what kind of death Peter would glorify our Father. Then he told him, "Follow me." O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.”
20 Peter turned and saw the disciple Jesus loved following—the one who leaned back against Jesus at supper and asked, "Lord, who is going to betray you?" Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”)
21 When Peter saw him, he said to Jesus, "Lord, what about this man?" Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?”
22 Jesus told him, "If I want him to remain until I come, what's that to you? You follow me." Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.”
23 So this word spread among the brothers and sisters that this disciple would not die. Yet Jesus did not tell him he would not die, but, "If I want him to remain until I come, what is that to you?" Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?”
24 This is the disciple testifying to these things and who wrote them; we know his testimony is true. Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu.
25 Jesus did many other things too. If each were written down, I don't think the world itself could hold the books written. Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]