Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 10 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 There was a man in Caesarea named Cornelius, a centurion of what was called the Italian Cohort. Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọnelịọs. O bụ ọchịagha na-elekọta narị ndị agha si na mpaghara Itali.
2 He was devout, feared our Father with his whole household, gave many gifts to the people, and prayed to our Father constantly. Nwoke a na ezinaụlọ ya bụ ndị na-asọpụrụ ma na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka na-ekpekwara Chineke mgbe niile.
3 About three in the afternoon he saw clearly in a vision an angel of our Father come to him and say, "Cornelius." Otu ụbọchị, nʼihe dịka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ ebe otu mmụọ ozi nke Chineke bịakwutere ya sị ya, “Kọnelịọs!”
4 Staring at him, terrified, he said, "What is it, sir?" The angel replied, "Your prayers and gifts to the poor have risen as a memorial before our Father." Kọnelịọs lekwasịrị ya anya nʼegwu jụọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụ gịnị?” Ọ sịrị ya, “Ekpere gị na onyinye gị nye ndị ogbenye e rutela dịka ihe ncheta nʼihu Chineke.
5 Now send men to Joppa and bring a man named Simon, who is called Peter. Ugbu a, zie ndị ikom ka ha gaa nʼobodo Jopa kpọta otu onye aha ya bụ Saimọn, onye a na-akpọkwa Pita.
6 He is lodging with a tanner named Simon, whose house is by the sea. Ọ bụ ọbịa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Onye ụlọ ya dị nʼakụkụ osimiri.”
7 When the angel who spoke to him left, Cornelius called two of his household servants and a devout soldier from among his regular attendants, Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ ndị ohu ya abụọ na otu nʼime ndị agha na-eche ya nche nke na-atụkwa egwu Chineke.
8 and after explaining everything to them, he sent them to Joppa. Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa.
9 The next day, as they journeyed and neared the city, Peter went up on the roof to pray, about noon. Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere.
10 He grew hungry and wanted to eat, but while they prepared food, a trance came over him, Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ.
11 and saw heaven opened, and something like a large sheet coming down, lowered by its four corners to the earth. Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala.
12 It held all kinds of four-footed animals and reptiles of the earth and birds of the air. Ihe dị nʼime ya: bụ ụmụ anụmanụ dị iche iche, ndị nwere ụkwụ anọ, ma anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke igwe.
13 And a voice came to him: "Rise, Peter; kill and eat." Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.”
14 But Peter said, "Absolutely not, Lord; for I have never eaten anything common or unclean." Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.”
15 The voice came to him again, a second time: "What I have made clean, don't call common." Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.”
16 This happened three times, and at once the sheet was taken up to heaven. Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe.
17 While Peter was puzzled over what the vision meant, suddenly the men sent by Cornelius, having asked the way to Simon's house, stood at the gate, Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị.
18 and called out to ask whether Simon who was called Peter was lodging there. Ha kpọrọ oku ịjụ ma Saimọn onye a na-akpọ Pita ọ nọ nʼụlọ ahụ.
19 As Peter thought about the vision, the Holy Spirit said to him, "Three men are looking for you. Ka Pita nọrịị na-atụgharị uche nʼihe ọhụ ahụ pụtara, Mmụọ Nsọ gwara ya, “Lee, mmadụ atọ guzo nʼọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị.
20 Get up, go downstairs, and go with them without hesitation, for I have sent them." Bilie, rịda jekwuru ha ngwangwa, enwela obi abụọ ị soro ha gawa, nʼihi na ọ bụ m zitere ha.”
21 Peter went down to the men and said, "I'm the one you're looking for. Why have you come?" Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?”
22 They said, "Cornelius, a centurion, upright, fears our Father, and respected by the whole Jewish nation, was told by a holy angel to summon you to his house and hear what you have to say." Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.”
23 So he invited them in and hosted them. Next day he set out with them, joined by some brothers from Joppa. Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa. Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa.
24 The next day he entered Caesarea. Cornelius, expecting them, had gathered his relatives and close friends. Nʼụbọchị na-esota ya, ha bịaruru Sizaria. Kọnelịọs nọrịị na-eche ha, ya na ndị ezinaụlọ ya, na ndị ikwu na ibe ya, na ndị enyi ya ọ kpọrọ.
25 When Peter entered, Cornelius met him and fell down at his feet and worshiped him. Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala.
26 But Peter lifted him up, saying, "Stand up! I'm a man too." Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.”
27 While talking with Cornelius, Peter went in and found many people gathered. Mgbe ha na-ekwurịta okwu, ọ banyere nʼime ụlọ ma hụ igwe mmadụ ka ha zukọtara.
28 He said to them, "You yourselves know it's unlawful for a Jew to associate with or visit someone of another nation. But our Father showed me I should call no one common or unclean. Ọ sịrị ha, “Unu maara nke ọma na ọ bụ ihe megidere iwu na onye Juu na onye mba ọzọ ga-enwe mmekọrịta maọbụ gaa leta onye mba ọzọ. Ma Chineke ezila m na m ekwesighị ịkpọ mmadụ ọbụla onye rụrụ arụ maọbụ onye na-adịghị ọcha.
29 So, sent for, I came without objection. Now, why did you send for me?" Nʼihi nke a, ọ bụ ya mere m jiri bịa mgbe akpọrọ m na-ajụghị ajụjụ. Ma ka m jụọ ugbu a ihe mere unu ji kpọọ m?”
30 Cornelius said, "Four days ago at this hour, three in the afternoon, I was praying in my house, and suddenly a man in bright clothing stood before me, Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m.
31 and said, 'Cornelius, your prayer was heard and your gifts to the poor remembered before our Father. Ọ sịrị, Kọnelịọs, ‘Chineke anụla ekpere gị ma chetakwa onyinye ị na-enye ndị ogbenye.
32 So send to Joppa and call for Simon, known as Peter. He's staying in Simon the tanner's house, by the sea.' Ziga nʼobodo Jopa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. O bi nʼakụkụ osimiri.’ Nʼebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye ọbịa aha ya bụ Saimọn a na-akpọ Pita.
33 So I sent for you at once, and you did well to come. Now we're all here before God, to hear all the Lord has commanded you." Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji mee ngwangwa zie ka a kpọọ gị. Ọ dị mma na ị bịara. Ugbu a, anyị niile ezukọtala nʼebe a nʼihu Chineke ịnụrụ ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ka ị gwa anyị.”
34 Peter spoke up: "I truly see our Father shows no favoritism, Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu.
35 but in every nation anyone who fears him and does what is right is acceptable to him. Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata.
36 He sent his word to the Israelites, announcing good news of peace through Jesus Christ—he is Lord of all. Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile.
37 You yourselves know what happened throughout all Judea, beginning from Galilee after the baptism that John proclaimed: Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya.
38 how our Father anointed Jesus of Nazareth with the Holy Spirit and power, how he went about doing good and healing all oppressed by the devil, for our Father was with him. Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya.
39 We are witnesses of all he did in the Jews' land and Jerusalem—they killed him, hanging him on a tree, “Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe.
40 but our Father raised him on the third day and made him appear, Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ndị mmadụ hụ ya anya.
41 not to all the people but to us, witnesses whom our Father chose beforehand, who ate and drank with him after he rose from the dead. Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie.
42 He commanded us to preach to the people and testify: our Father appointed him judge of the living and the dead. O nyere anyị iwu ka anyị gaa zisaa oziọma nʼebe niile, ịkọwa na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
43 To him all the prophets testify that everyone believing in him receives forgiveness of sins through his name." Ndị amụma niile gbara ama ihe banyere ya na onye ọbụla nke kweere na ya ga-enweta mgbaghara mmehie site nʼaha ya.”
44 While Peter was still saying these things, the Holy Spirit fell on all who heard the word. Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a.
45 The circumcised believers who came with Peter were amazed that the gift of the Holy Spirit was poured out on Gentiles too. Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ.
46 For they heard them speaking in tongues and praising our Father. Then Peter declared, Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ,
47 "Can anyone refuse water to baptize these people, who received the Holy Spirit as we did?" “Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?”
48 He ordered them baptized in Jesus Christ's name. Then they asked him to stay several days. Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]