Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 11 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The apostles and brothers in Judea heard that Gentiles too had received our Father's word. Ndị ozi na ụmụnna ndị bi na Judịa niile nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke.
2 So when Peter went up to Jerusalem, those of the circumcision party criticized him, Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta,
3 saying, "You visited uncircumcised men and ate with them." na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?”
4 But Peter explained it to them step by step: Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị.
5 Praying in the city of Joppa, I fell into a trance and saw a vision: a huge sheet-like object, lowered from heaven by its four corners, reaching me. “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m.
6 Looking closely at it, I saw four-legged animals, wild beasts, reptiles, and birds. Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe.
7 And I heard a voice saying to me, 'Get up, Peter; kill and eat.' Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’
8 But I said, 'By no means, Lord; for nothing impure or unclean has ever entered my mouth.' “Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’
9 But the voice answered a second time from heaven, 'What our Father has made clean, do not call impure.' “Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’
10 This happened three times, and all of it was drawn up again into heaven. Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe.
11 Right then three men, sent to me from Caesarea, arrived at the house where we stayed. “Nʼotu oge ahụ, ndị ikom atọ ndị e zipụrụ site Sizaria ịkpọ m bịarutere kwụsị nʼọnụ ụzọ nʼụlọ ebe m nọ.
12 The Spirit told me to go with them, making no distinction. These six brothers also went with me, and we entered the man's house. Mmụọ Nsọ gwara m ka m ghara inwe obi abụọ isoro ha na-akpaghị oke ọbụla. Mmadụ isii ndị a nʼetiti ụmụnna anyị sokwa m, bịarute nʼụlọ nwoke ahụ.
13 He told us how he saw the angel standing in his house and saying, 'Send to Joppa and bring Simon called Peter; Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita.
14 he will bring you a message by which you will be saved, you and all your household.' Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’
15 When I began speaking, the Holy Spirit fell on them just as on us at first. “Mgbe m ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dịka o siri bịakwasị anyị na mbụ.
16 Then I remembered what our Lord Jesus said: 'John baptized with water, but you will be baptized with the Holy Spirit.' Mgbe ahụ, echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’
17 If our Father gave them the same gift he gave us who believed in the Lord Jesus Christ, who was I to stand in our Father's way? Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?”
18 Hearing this, they quieted down and praised our Father, saying, "So our Father has granted repentance that leads to life even to the Gentiles." Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.”
19 Those scattered by the persecution over Stephen traveled as far as Phoenicia, Cyprus, and Antioch, speaking the message to no one but Jews. Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu.
20 But some of them—men from Cyprus and Cyrene—reached Antioch and spoke to Hellenists too, telling the good news about the Lord Jesus. Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs.
21 The hand of our Lord Jesus was with them, and many believed and turned to the Lord. Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị.
22 The church in Jerusalem heard about this and sent Barnabas to Antioch. Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk.
23 Arriving, he saw our Father's grace and rejoiced, urging all to remain devoted to the Lord with firm hearts. Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị.
24 For he was a good man, full of the Holy Spirit and faith, and a large crowd was added to the Lord. Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị.
25 So Barnabas went to Tarsus to look for Saul, Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl.
26 finding him, he brought him to Antioch. For a full year they met with the church and taught a large crowd, and in Antioch the disciples were first called Christians. Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst.
27 In these days prophets came down from Jerusalem to Antioch. Nʼoge ahụ, ndị amụma sitere na Jerusalem bịaruru Antiọk.
28 One of them, named Agabus, stood up and predicted through the Spirit that a great famine would come over the whole world—it happened in Claudius's days. Otu onye nʼime ha a na-akpọ Agabọs biliri ọtọ buo amụma site nʼike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ga-abịakwasị ụwa niile. Amụma a mezukwara nʼoge Klọdiọs na-achị.
29 The disciples decided, each according to ability, to send relief to the brothers living in Judea. Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike.
30 And they did so, sending it to the elders through Barnabas and Saul. Ha mere nke a, ha zigara ndị okenye ihe ha tụkọtara, site nʼaka Banabas na Sọl.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]