Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 12 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 About that time King Herod attacked some who belonged to the church, intending to harm them. Nʼoge ahụ, eze Herọd jidere ụfọdụ ndị so na chọọchị buru nʼobi ịkpagbu ha.
2 He had James, the brother of John, put to death with the sword. O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn.
3 Seeing that this pleased the Jews, Herod proceeded to seize Peter too, during the days of Unleavened Bread. Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko.
4 He arrested him, put him in prison, and handed him to four squads of four soldiers to guard, intending to bring him out to the people after the Passover. Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị.
5 Peter was kept in prison, but the church prayed fervently to our Father for him. Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke.
6 That night, before Herod could bring him out, Peter slept between two soldiers, bound with two chains; guards before the door kept watch over the prison. Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche.
7 Suddenly an angel of our Father stood beside him, and light filled the cell. He struck Peter's side, woke him, and said, "Get up quickly." The chains fell from his hands. Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya.
8 The angel told him, "Get dressed and put on your sandals." Peter complied. Then he said, "Wrap your cloak around you and follow me." Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.”
9 So Peter went out and followed, not knowing the angel's actions were real—he thought he saw a vision. Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie.
10 Passing the first and second guard posts, they reached the iron gate to the city, which opened for them on its own. They went out, walked one street, and the angel suddenly left him. Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya.
11 Then Peter came to himself and said, "Now I know for certain: our Father sent his angel and rescued me from Herod's hand and from everything the Jewish people expected." Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”
12 Aware of this, he went to Mary's house, mother of John also called Mark, where many were gathered praying. Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere.
13 When Peter knocked at the door of the gateway, a servant girl named Rhoda came to answer. Mgbe ọ kụrụ aka nʼọnụ ụzọ ama, otu odibo nwanyị aha ya bụ Roda bịara ka o zaa ya.
14 Recognizing Peter's voice, she was so overjoyed she ran in without opening the gate, announcing Peter stood there. Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!”
15 "You're out of your mind," they said. But she insisted it was true. So they said, "It's his angel." Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.”
16 But Peter kept on knocking, and when they opened the door and saw him, they were astonished. Ma Pita nọgidere na-akụ aka nʼụzọ. Mgbe ha meghere ụzọ hụ ya, ọ gbagwojuru ha anya.
17 Signaling with his hand for quiet, he explained how our Father had led him out of prison. "Tell James and the brothers and sisters this," he said, then left for another place. O feere ha aka ka ha mechie ọnụ. Ọ kọọrọ ha otu Onyenwe anyị si dupụta ya site nʼụlọ mkpọrọ. Ọ gwara ha, “Meenụ ka Jemis na ụmụnna anyị niile mata ihe ndị a.” Ọ pụrụ gawa ebe ọzọ.
18 When morning came, there was no small commotion among the soldiers over what had become of Peter. Nʼisi ụtụtụ echi ya, oke ọgbaaghara dị nʼetiti ndị agha, ebe ha na-eche ihe mere Pita.
19 Herod, after searching for him and not finding him, questioned the guards and ordered them executed. Then he went down from Judea to Caesarea and stayed there. Mgbe Herọd chọgharịchara ya ma ọ chọtaghị ya, ọ jụrụ ndị nche ahụ ajụjụ dị iche iche. Nʼikpeazụ ọ nyere iwu ka e gbuo ha. Emesịa ọ hapụrụ Judịa gaa Sizaria nọdụ nʼebe ahụ.
20 Herod was enraged at Tyre and Sidon. Together they came to him, and having won over Blastus, the king's chamberlain, they requested peace, since their land depended on the king's land for food. Nʼoge ahụ Herọd na-eweso ndị Taịa na Saịdọn iwe, ha zipụrụ ndị ozi ha izute ya. Ha buru ụzọ mee ka ha na Blastọs bụrụ enyi, onye eze tụkwasịrị obi nke na-elekọtakwa ime ụlọ ndina eze anya. Ha rịọrọ ya ka udo dịrị, nʼihi na a na-esi nʼobodo eze na-enwetara ha ihe oriri.
21 On the set day Herod dressed in royal robes, sat on the throne, and made a speech to them. Nʼụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị uwe ndị eze ya nọkwasị nʼocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ niile okwu.
22 And the crowd kept shouting, "This is the voice of a god, not of a man!" Igwe mmadụ ahụ nọ na-eti mkpu, “Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu chi!”
23 Instantly an angel of our Father struck him down for not giving our Father the glory, and worms ate him and he died. Nʼotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti dị egwu nʼihi na o nyeghị Chineke otuto ma otu. Ikpuru ripịara ya ahụ, nke mere ka ọ nwụọ.
24 But the word of our Father continued to grow and spread. Ma okwu Chineke gara nʼihu na-aba ụba na-agbasakwa.
25 Barnabas and Saul returned from Jerusalem, having finished their mission, taking with them John, also called Mark. Mgbe ha rụchara ọrụ ha, Banabas na Sọl si Jerusalem lọghachi. Ha kpọọrọ Jọn onye a na-akpọkwa Mak nʼije ha.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]