Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 13 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the Antioch church were prophets and teachers: Barnabas, Simeon called Niger, Lucius of Cyrene, Manaen (a lifelong companion of Herod the tetrarch), and Saul. Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl.
2 While they worshiped our Lord Jesus and fasted, the Holy Spirit said, "Set apart for me Barnabas and Saul, for the work I've called them to." Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.”
3 Then, after fasting and praying, they laid their hands on them and sent them off. Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.
4 Sent by the Holy Spirit, they went down to Seleucia, then sailed to Cyprus. Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs.
5 Arriving at Salamis, they proclaimed our Father's word in the Jewish synagogues. They had John as their helper. Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.
6 Having crossed the whole island to Paphos, they found a Jewish sorcerer and false prophet named Bar-Jesus, Mgbe ha gazuchara obodo niile ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ruo Pafọs, ha zutere otu onye mgbaasị, onye Juu bụ onye amụma ụgha a na-akpọ Ba-Jisọs.
7 who was with the proconsul, Sergius Paulus, an intelligent man. He summoned Barnabas and Saul, wanting to hear our Father's word. Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke.
8 Elymas the magician—that's his name's meaning—opposed them, trying to turn the proconsul from the faith. Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ.
9 But Saul, who was also called Paul, filled with the Holy Spirit, looked intently at him, Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya
10 and said, "You son of the devil, enemy of all righteousness, full of every deceit and trickery—will you never stop twisting our Father's straight paths? sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị?
11 Now look: the hand of our Father is on you. You will be blind, unable to see the sun, for a time." Immediately mist and darkness fell on him; he felt his way around, seeking someone to lead him by the hand. Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.” Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.
12 Seeing what happened, the proconsul believed, amazed at the teaching of our Lord Jesus. Mgbe onyeisi ahụ hụrụ ihe mere, o kweere, nʼihi na o juru ya anya bụ ozizi nke okwu Onyenwe anyị.
13 Paul and his companions sailed from Paphos to Perga in Pamphylia, but John left them and returned to Jerusalem. Pọl na ndị otu ya ji ụgbọ mmiri site na Pafọs garuo Pega nke dị nʼala Pamfilia. Nʼebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem.
14 From Perga they went on to Antioch in Pisidia. On the Sabbath they entered the synagogue and sat down. Site na Pega ha gara ruo Antiọk obodo nke dị na Pisidia. Nʼụbọchị izuike, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala.
15 After the reading of the Law and the Prophets, the synagogue leaders sent word: "Brothers, if you have a word of encouragement for the people, speak." Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.”
16 Paul stood, waved his hand, and said, "Men of Israel, and you who fear our Father, listen. Pọl guzoro ọtọ nʼetiti ha feere ha aka ya, sị, “Unu ndị Izrel na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị.
17 Our Father, the Father of this people Israel, chose our ancestors, made them great during their stay in the land of Egypt, and led them out with a raised arm. Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ.
18 And for about forty years he put up with them in the wilderness. Ọ nagidere ha iri afọ anọ nʼime ọzara.
19 After destroying seven nations in Canaan, he gave them their land as an inheritance. O bibiri mba asaa dị ukwuu nʼime ala Kenan nʼihi ha, nyekwa ndị ya obodo a ka ọ bụrụ nke ha.
20 This took about 450 years. Then he gave them judges until Samuel the prophet. Nke a bụ ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. “Mgbe nke a gasịrị, o nyere ha ndị ikpe dị iche iche ruo oge Samuel onye amụma.
21 Then they asked for a king, and our Father gave them Saul son of Kish, a man from Benjamin's tribe, for forty years. Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ.
22 After removing him, he raised up David as their king, testifying: 'I have found David son of Jesse, a man after my heart, who will do everything I want.' Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’
23 From this man's offspring our Father has brought to Israel a Savior, Jesus, just as he promised. “Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite.
24 Before his coming, John had proclaimed a baptism of repentance to all the people of Israel. Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị.
25 As John was completing his course, he said, 'What do you think I am? I am not he. But look, one is coming after me—I'm not worthy to untie the sandals on his feet.' Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’
26 "Brothers, sons of Abraham's family, and those among you who fear our Father: this salvation message was sent to us. “Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile.
27 Jerusalem's people and their leaders didn't recognize him or grasp the prophets' words read each Sabbath—condemning him, they fulfilled those very words. Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ.
28 Though they found no cause for his death, they asked Pilate to have him executed. Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya.
29 After they finished everything written about him, they took him down from the tree and laid him in a tomb. Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya.
30 But our Father raised him from the dead, Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie.
31 for many days he appeared to those who came up with him from Galilee to Jerusalem, now his witnesses to the people. Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya.
32 And we bring you the good news that what our Father promised to our ancestors. “Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha.
33 He has fulfilled this for us, their children, by raising Jesus, as is also written in Psalm 2: 'You are my Son; today I have fathered you.' O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma, “ ‘Ị bụ ọkpara m, taa abụrụla m nna gị.’
34 And as for the fact that he raised him from the dead, never to decay again, he said, 'I will give you the holy and sure blessings promised to David.' Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’
35 Therefore he also says in another psalm: 'You will not let your Holy One see decay.' E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma, “ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’
36 For David, after serving our Father's purpose in his own generation, fell asleep, was laid with his ancestors, and saw decay, “Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure.
37 but he whom our Father raised up did not see decay. Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure.
38 So know this, brothers—through this man forgiveness of sins is proclaimed to you, “Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu.
39 through him, everyone who believes is freed from everything the law of Moses could not free you from. A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume.
40 Be careful, then, that what is said in the Prophets does not happen to you: Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu.
41 'Look, you scoffers, be astonished and perish; for I am doing a work in your days, a work that you will never believe, even if someone tells it to you.'" “ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo, nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi. Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị unu nke unu na-agaghị ekwe na o mere, ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’”
42 As Paul and Barnabas left, the people urged them to speak again about these things next Sabbath. Mgbe Pọl na Banabas na-apụ, ndị mmadụ rịọrọ ha ka ha bịakwa nʼizu ụka ọzọ gwa ha okwu gbasara ihe ndị a.
43 When the synagogue meeting ended, many Jews and devout converts to Judaism followed Paul and Barnabas, who spoke with them and urged them to continue in the grace of our Father. Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke.
44 The next Sabbath almost the whole city gathered to hear the word of our Lord Jesus. Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị.
45 When the Jews saw the crowds, jealousy filled them, and they contradicted Paul's words, insulting him. Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu.
46 Paul and Barnabas spoke boldly: "The word of our Father had to be spoken to you first. Since you reject it, judging yourselves unworthy of eternal life, look—we turn to the Gentiles." Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ.
47 For our Father has commanded us: "I have made you a light to the nations, to bring salvation to the ends of the earth." Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu, “ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’”
48 Hearing this, the Gentiles rejoiced and glorified the word of our Lord Jesus; all appointed to eternal life believed. Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ.
49 And the word of our Lord Jesus spread throughout the whole region. Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ.
50 But the Jews stirred up the devout, prominent women and the city's leading men, roused persecution against Paul and Barnabas, and expelled them from their region. Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ.
51 So they shook the dust off their feet against them and went to Iconium. Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm.
52 And the disciples were filled with joy and with the Holy Spirit. Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]