Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Acts 14 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In Iconium they entered the Jewish synagogue together and spoke so that a great number of both Jews and Greeks believed. Nʼobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nʼụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu nʼụzọ pụrụ iche nke mere nʼọtụtụ mmadụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ kwenyekwara.
2 But the Jews who refused to believe stirred up and poisoned Gentile minds against the brothers. Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna.
3 They stayed a long time, speaking boldly for the Lord, who confirmed his message of grace, doing signs and wonders through their hands. Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche.
4 But the city split: some sided with the Jews, some with the apostles. Ma ndị obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ nʼime ha dịnyere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyekwara ndị ozi.
5 When both the Gentiles and the Jews, together with their rulers, moved to mistreat and stone them, Mgbe ndị mba ọzọ, na ndị Juu, ha na ndị ndu ha, gbara izu ime ha ihe ihere, tụọkwa ha nkume.
6 realizing this, they fled to the Lycaonian cities of Lystra and Derbe, and the surrounding region, Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ.
7 and there they kept preaching the gospel. Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ.
8 A man sat in Lystra, feet disabled, lame from birth, who had never walked. Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla.
9 He was listening to Paul speak. Paul stared at him and saw he had faith to be healed, O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya,
10 said in a loud voice, "Stand upright on your feet." The man leaped up and began walking. were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije.
11 When the crowds saw what Paul did, they shouted in Lycaonian, "The gods have come down to us in human form!" Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.”
12 Barnabas they called Zeus, and Paul they called Hermes, because he was the chief speaker. Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu.
13 The priest of Zeus, whose temple stood before the city, brought bulls and garlands to the gates, wanting to sacrifice with the crowds. Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha.
14 But hearing this, the apostles Barnabas and Paul tore their clothes and ran into the crowd, shouting, Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu,
15 and saying, "Men, why are you doing this? We are humans too, with the same nature as you. We bring you good news: turn from these worthless things to the living Father, who made the heaven, the earth, the sea, and everything in them. na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha.
16 In past generations he let all the nations go their own way, Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha.
17 yet he did not leave himself without witness: doing good, giving you rains from heaven and fruitful seasons, filling your hearts with food and joy." Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.”
18 Even with these words they barely restrained the crowds from sacrificing to them. Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.
19 But Jews from Antioch and Iconium came, won over the crowds, stoned Paul, and dragged him out of the city, thinking him dead. Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla.
20 When the disciples surrounded him, he got up and went into the city. The next day he left for Derbe with Barnabas. Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi.
21 After preaching the good news in that city and making many disciples, they returned to Lystra, Iconium, and Antioch, Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk.
22 strengthening the disciples' souls, urging them to remain in the faith: we must enter our Father's kingdom through many troubles. Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.”
23 After appointing elders for them in each church, praying with fasting, they entrusted them to the Lord they had believed in. Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya.
24 Then they passed through Pisidia and came to Pamphylia. Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia.
25 And when they had spoken the word in Perga, they went down to Attalia, Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia.
26 from there they sailed to Antioch, where they'd been entrusted to our Father's grace for the work they had finished. Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru.
27 When they arrived, they gathered the church and reported all our Father had done with them, and how he opened a door of faith to the Gentiles. Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ.
28 And they stayed there with the disciples for a long time. Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]