Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Timothy 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 But understand this: in the last days there will come times of difficulty. Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ.
2 For people will be self-lovers, money-lovers, boastful, arrogant, abusive, disobedient to parents, ungrateful, unholy. Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha.
3 Heartless, unforgiving, slanderous, without self-control, brutal, hating what is good, Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.
4 treacherous, reckless, swollen with conceit, lovers of pleasure rather than lovers of our Father. Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya.
5 They keep the shape of devotion to God but deny its power—turn from them. Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ.
6 For among these are those who slip into homes and trap weak women weighed down with sins, driven by various desires. Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ.
7 Always learning but never able to come to a knowledge of the truth. Ndị a na-akụziri ihe oge niile, ma ha apụghị inweta amamihe nke eziokwu.
8 As Jannes and Jambres opposed Moses, these also oppose the truth—minds corrupted, disqualified regarding the faith. Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosis ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ha bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nʼebe okwukwe anyị dị.
9 But they won't get far, for their foolishness will be clear to all, as with those two men. Ma ha agaghị aga nʼihu nʼihi na nzuzu ha ga-apụta ihe nʼihu mmadụ niile, dịka nke mmadụ abụọ ahụ.
10 You, however, have followed my teaching, conduct, purpose, faith, patience, love, endurance, Ma ugbu a, ị maara ihe niile banyere ozizi m, na omume m, na ebumnuche m, na okwukwe m na ntachiobi m, na ịhụnanya m, na ndidi m,
11 my persecutions and suffering—at Antioch, at Iconium, at Lystra, what persecutions I endured! Yet the Lord rescued me from them all. na mkpagbu m na ahụhụ niile nke dakwasịrị m nʼAntiọk, na Aikoniọm, na Listra. Ị maara ụdị mkpagbu dị iche iche m gabigara. Ma Onyenwe anyị napụtara m site nʼime ha niile.
12 Indeed, all who desire to live a godly life in Christ Jesus will be persecuted, Nʼezie, ndị niile chọrọ ibi ndụ ịsọpụrụ Chineke nʼime Kraịst Jisọs ga-agabiga mkpagbu.
13 while evil people and impostors will go on from bad to worse, deceiving and being deceived. Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.
14 But you—stay with what you learned and became convinced of, knowing from whom you learned it, Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha.
15 and that from infancy you have known the sacred writings, able to make you wise for salvation through faith in Christ Jesus. Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.
16 All Scripture is breathed out by our Father—useful for teaching, exposing wrong, correcting, and training in right living, Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:
17 so that the person of our Father may be complete, equipped for every good work. ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]