Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Timothy 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 So then, my child, draw your strength from the grace that is in Christ Jesus. Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye.
2 And what you heard from me in the presence of many witnesses, entrust to faithful people able to teach others too. Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a.
3 Take your share of suffering like a good soldier of Christ Jesus. Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst.
4 No soldier on duty gets tangled in civilian affairs—he wants to please the one who enlisted him. Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ.
5 And an athlete is not crowned unless he competes according to the rules. Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị.
6 The hard-working farmer ought to be the first to receive a share of the crops. Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya.
7 Think over what I am saying, for the Lord will give you understanding in everything. Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile.
8 Remember Jesus Christ, risen from the dead, a descendant of David, as told in my gospel, Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m.
9 for which I suffer, chained like a criminal. But the word of our Father is not chained! Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ.
10 So I endure everything for the sake of the chosen, so they too may gain the salvation in Christ Jesus, with eternal glory. Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi.
11 This saying is trustworthy: If we have died with him, we will also live with him; Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi: Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ, anyị ga-esokwa ya dị ndụ.
12 if we endure, we will also reign with him; if we disown him, he also will disown us; Ọ bụrụ na anyị anagide, anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị. Ọ bụrụ na anyị ajụ ya, ọ ga-ajụkwa anyị.
13 if we are faithless, he remains faithful, for he cannot disown himself. Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe, ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi, nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya.
14 Remind them of these things, and warn them before our Father not to quarrel over words—useless, and ruins those who listen. Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi.
15 Do your best to present yourself to our Father approved, a worker unashamed, rightly handling the word of truth. Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
16 But avoid empty, godless chatter; it leads people further into wickedness, Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa.
17 and their talk will spread like gangrene. Among them are Hymenaeus and Philetus, Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a.
18 who wandered away from the truth, claiming the resurrection already happened, and are undermining some people's faith. Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, na-asị na oge mbilite nʼọnwụ agafeela. Site nʼokwu ha, ha na-ekpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu nʼala.
19 Yet our Father's firm foundation stands, sealed: "He knows those who are his," and "Let all who name his name turn from evil." Ma ntọala Chineke hiwere na-eguzosi ike. Nʼelu ya ka eji ihe e dere kaa akara: “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya,” ya na, “Ka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ibi ndụ ajọ omume.”
20 In a large house there are vessels not only of gold and silver, but also of wood and clay—some for honor, some for dishonor. Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla.
21 So if anyone purifies himself from these, he becomes a vessel of honor: holy, useful to the Master, ready for every good work. Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ.
22 Flee youthful cravings; pursue righteousness, faith, love, and peace with those who call on the Lord from a pure heart. Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.
23 Have nothing to do with foolish, ignorant controversies; you know they breed quarrels. Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu.
24 The Lord's servant must not be quarrelsome, but be gentle to all, able to teach, patient when wronged. O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya.
25 Gently correcting those who oppose him. Perhaps our Father will grant them repentance to know the truth, Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu.
26 and they may sober up, escaping the devil's trap where he has held them captive to do his will. Mgbe ahụ, ha nwere ike gbanahụ ọnya ekwensu, ka o jidechara ha ka ha mee uche ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]