Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Timothy 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Paul, apostle of Christ Jesus by the will of our Father, by the promise of life in Christ Jesus, Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị,
2 to Timothy, my beloved child: Grace, mercy, and peace from our Father and Christ Jesus our Lord. Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị.
3 I thank our Father, whom I serve with a clear conscience as my ancestors did, remembering you constantly in my prayers, night and day. Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị.
4 Remembering your tears, I long to see you, so that I may be filled with joy. Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke.
5 I recall your sincere faith—alive first in your grandmother Lois and mother Eunice, and now, I'm convinced, in you too. Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị.
6 So I remind you to fan into flame the gift of our Father in you, through the laying on of my hands. Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi.
7 For our Father gave us no spirit of fear, but the Spirit of power, love, and self-control. Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
8 So don't be ashamed of our Lord's testimony, nor of me his prisoner, but share in suffering for the gospel by our Father's power. Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.
9 He saved and called us with a holy calling, not by our works but by his own purpose and grace, given us in Christ Jesus before time began, Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a.
10 and now made known through the appearing of our Savior Christ Jesus, who ended death and illuminated life and immortality through the gospel. Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.
11 For this gospel I was appointed a preacher and an apostle and a teacher. Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.
12 That's why I suffer this way. But I'm not ashamed, for I know whom I've believed, and am convinced he can guard what's entrusted to me until the day he returns. Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.
13 Hold the pattern of sound words you heard from me, in faith and love in Christ Jesus. Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs.
14 Guard the good deposit entrusted to you, through the Holy Spirit who lives within us. Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe.
15 You know this: everyone in the province of Asia turned away from me, including Phygelus and Hermogenes. Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa.
16 May our Lord Jesus grant mercy to Onesiphorus's household, for he often refreshed me and wasn't ashamed of my chains. Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.
17 On the contrary, when he arrived in Rome he searched eagerly for me until he found me. Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m.
18 May our Lord Jesus grant that he finds mercy from the Lord on that day. You know very well how much he served in Ephesus. Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]