Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Timothy 4 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 I solemnly charge you before our Father and Christ Jesus, who will judge the living and the dead, by his appearing and his kingdom: Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nʼihu Chineke na nʼihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ejikwa m ọbịbịa ya na alaeze ya na-asị gị,
2 Preach the word; stand ready in season and out; correct, rebuke, and encourage, with complete patience and teaching. kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ.
3 For a time will come when they won't tolerate sound teaching, but will pile up teachers to fit their own desires, since their ears itch, Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.
4 and will turn their ears away from the truth and wander off into myths. Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi.
5 But you: stay clear-headed in everything, endure hardship, do an evangelist's work, fulfill your service. Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị.
6 For I am already being poured out like a drink offering; my time to depart has come. Nʼihi na ugbu a, abụrụla m rịị onye a na-awụpụ dị ka aja ihe ọṅụṅụ, oge ụla m eruokwala.
7 I have fought the good fight, I have finished the race, I have kept the faith. Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ.
8 Now a crown of righteousness awaits me, which the Lord, the righteous judge, will give me on that day—not only to me but to all who have loved his appearing. Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.
9 Do your best to come to me soon. Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ,
10 Demas loved this present world, abandoned me, went to Thessalonica. Crescens went to Galatia, Titus to Dalmatia. nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia.
11 Only Luke is with me. Pick up Mark and bring him with you—he's useful to me for service. Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m.
12 I have sent Tychicus to Ephesus. Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs.
13 When you come, bring the coat I left with Carpus at Troas, and the scrolls, especially the parchments. Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ.
14 Alexander the coppersmith did me great harm; the Lord will repay him according to his deeds. Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-akwụghachi ya dị ka ihe o mere m si dị.
15 Watch out for him yourself, for he strongly opposed our message. Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru.
16 No one stood with me at my first defense—all abandoned me. May it not be charged against them. Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie.
17 But the Lord stood with me and strengthened me, so through me the message would be fully proclaimed and all nations would hear it. I was rescued from the lion's mouth. Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm.
18 The Lord will rescue me from every evil deed and carry me safely into his heavenly kingdom. Glory to him forever and ever. Amen. Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
19 Greet Prisca and Aquila, and the household of Onesiphorus. Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs.
20 Erastus stayed at Corinth, and I left Trophimus, who was ill, at Miletus. Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike.
21 Try hard to come before winter. Eubulus, Pudens, Linus, Claudia, and all the brothers and sisters greet you. Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile.
22 The Lord be with your spirit. Grace be with you all. Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ gị. Ka amara dịnyere gị.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]