Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 3 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then Solomon began building our Father's house in Jerusalem, on Mount Moriah, where our Father had appeared to his father David, at the site David had prepared on Ornan the Jebusite's threshing floor. Mgbe ahụ, Solomọn malitere iwu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼugwu Mọrịa, nke dị na Jerusalem, ka e wukwasịrị ya, nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka Devid bụ nna ya hụ ya anya. Ọ bụ nʼala ebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus, ebe ahụ Devid họpụtara.
2 He began building in the second month, second day, in the fourth year of his reign. O bidoro iwu ụlọ ahụ nʼabalị nke abụọ, nke ọnwa abụọ, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị eze ya.
3 These are the foundations Solomon laid for building the house of our Father: length about ninety feet by the earlier standard, width about thirty feet. Ntọala Solomọn tọrọ maka iwu ụlọnsọ Chineke dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara. (Nke a bụ ma ejiri ihe ọtụtụ ochie).
4 The portico across the house's front, along the width of the house, was about thirty feet wide; its height was 120 feet. He covered the inside with pure gold. Ịdị ogologo mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ dị mita itoolu, dịka ịdị ogologo obosara ụlọ nso ahụ nʼonwe ya. Ịdị elu ya dịkwa mita itoolu. O jikwa ọlaedo a nụchara anụcha machie ime ya.
5 He paneled the large room with cypress wood, covered it in fine gold, and added palm trees and chains. O ji osisi junipa machie ahụ ime ụlọ ezumezu ahụ, jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha techie osisi ndị ahụ niile. Emesịa, e sere oyiyi nkwụ dị iche iche, na oyiyi ụdọ igwe nʼahụ ụlọ ahụ iji chọọ ya mma.
6 He adorned the house with precious stones for beauty, and the gold was from Parvaim. O ji nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche chọọ ime ụlọnsọ ahụ mma, ya na ọlaedo nke e si na Pavaim bute.
7 He covered the house—beams, thresholds, walls, doors—with gold, and carved cherubim on the walls. Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile.
8 He made the Most Holy Place, its length matching the house's width—about thirty feet—and its width also thirty feet. He overlaid it with about twenty-three tons of fine gold. O wuru Ebe ahụ Kachasị Nsọ; nke ogologo ọnụ ụlọ ya dị mita iri, otu a kwa, obosara ya dị mita iri. O ji ọlaedo dị ezi mma nke ọnụahịa ya ruru narị talenti isii techie ahụ ime ụlọ ahụ niile.
9 Nails weighed about twenty ounces of gold; he covered the upper rooms with gold. Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.
10 In the Most Holy Place he made two carved cherubim, gilded them. Solomọn tinyere oyiyi mmụọ ozi cherubim abụọ ọ kpụrụ nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, werekwa ọlaedo machie ha.
11 Together the cherubim's wings spanned about thirty feet: one wing of the first cherub, about seven and a half feet, touched the house wall; its other wing, also about seven and a half feet, touched the second cherub's wing. Ịdị ogologo nku cherubim ndị a ruru mita iri. Ịdị ogologo otu nku cherub nke mbụ ruru mita abụọ na ọkara. Ọnụ nku a na-emetụ ahụ ime ụlọ nke ụlọnsọ ukwu, ma ọnụ ọnụ nku nke ọzọ, nke ịdị ogologo ya ruru mita abụọ nʼọkara, na-emetụ ọnụ otu nku cherub nke ọzọ.
12 The second cherub's wing, about seven and a half feet, touched the house wall; its other wing, also about seven and a half feet, joined the first cherub's wing. Nʼotu aka ahụ, otu nku cherub nke abụọ ruru mita abụọ na ọkara nʼogologo. Ọnụ nku ya na-emetụ akụkụ nke ọzọ nke ahụ ime ụlọnsọ ukwu, ma nku ya nke ọzọ, nke rukwara mita abụọ na ọkara nʼogologo, na-emetụ ọnụ ọnụ otu nku cherub nke mbụ.
13 The wings of these cherubim spread about thirty feet; they stood on their feet, facing the main hall. Nku cherubim ndị a gbasapụrụ ruo mita iri nʼogologo. Ha guzo ọtọ nʼụkwụ ha, na-eche ihu nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ.
14 He made the curtain of blue, purple, and crimson yarn and fine linen, with cherubim woven into it. O ji akwa na-acha anụnụ anụnụ, na uhie uhie, na odo odo, na ezi akwa ọcha, mee akwa mgbochi, nke a kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
15 In front of the house he made two pillars, each about fifty-three feet tall, topped with a capital about seven and a half feet high. O wuru ogidi abụọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nke ịdị elu ya ruru mita iri na asaa. Ọ kpụkwara ihe a dokwasịrị nʼelu ogidi ndị a, nke ịdị elu ha dị mita abụọ na ọkara.
16 He made chains like a necklace, put them atop the pillars, made one hundred pomegranates, and fastened them to the chains. Ọ kpụkwara ihe yiri ụdọ igwe a tụrụ atụ, nke e kokwasịrị nʼelu ogidi abụọ ndị ahụ. Kpụọkwa narị mkpụrụ pomegranet, nke a ganyekọtara ya na ụdọ igwe ahụ.
17 He set up the pillars in front of the temple, one to the right, one to the left, naming the right one Jachin and the left one Boaz. O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ, otu nʼakụkụ ugwu nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]