Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 2 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Solomon resolved to build a house for our Father's name, and a royal palace for himself. Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha Onyenwe anyị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze.
2 Solomon assigned 70,000 carriers, 80,000 stonecutters in the mountains, and 3,600 overseers over them. O manyere ndị ọrụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa (70,000) na-ebu ibu, na ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ (80,000), na ndị o doro dịka ndịisi ha, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị isii (3,600).
3 Solomon sent to Huram king of Tyre: "Deal with me as you did with my father David, sending him cedar to build his house to live in. Solomọn zigara Hiram eze Taịa ozi sị ya, “Zidatara m osisi sida dịka i mere nʼoge nna m Devid wuru ụlọeze nke ya.
4 I am building a house for the name of my Father, to dedicate it to him—to burn fragrant incense before him, set out the bread of the Presence continually, offer burnt offerings morning and evening, on sabbaths, new moons, and appointed feasts of our Father. Israel must do this forever. Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke Onyenwe anyị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi.
5 The house I am building will be great, for our Father is greater than all gods. “Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile.
6 But who can build him a house, when heaven and the highest heavens cannot contain him? And who am I to build him one, except to burn sacrifices before him? Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya?
7 Now send me a craftsman skilled in gold, silver, bronze, iron, purple, crimson, and blue yarn, and in engraving, to work with my skilled workers in Judah and Jerusalem, whom my father David provided. “Zitere m, onye ǹka, onye maara otu e si eji ọlaedo na ọlaọcha, na bronz, na igwe arụ ọrụ. Onye bụkwa onye maara ọrụ ǹka metụtara akwa dị iche iche, akwa ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie, na nke anụnụ anụnụ. Ọ ga-abụkwa onye igbunye akara nʼihe doro anya, onye ga-arụ ọrụ na Juda na nʼime Jerusalem, ebe ọ ga-eso ndị ǹka m, bụ ndị nna m Devid họpụtara rụọ ọrụ.
8 Send me also cedar, cypress, and red sandalwood from Lebanon, for I know your servants skillfully cut Lebanon's timber; my servants will join yours. “Zitekwara m osisi sida, na osisi junipa, na osisi algụm, ndị sitere nʼọhịa Lebanọn, nʼihi na ndị gị bụ ọkachamara nʼọrụ ịwa osisi. Aga m ezitekwa ndị m ga-abịa soro ha rụọ ọrụ,
9 Prepare plenty of timber for me, for the house I am building will be great and wonderful. ime ka osisi ha ga-egbutere m dị ukwuu, nʼihi na ya bụ ụlọnsọ ga-ebu ibu, maakwa mma.
10 For your servants who cut the timber I will give about 125,000 bushels of crushed wheat, 125,000 of barley, 115,000 gallons of wine, and 115,000 of oil." Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.”
11 Huram king of Tyre wrote Solomon: "Because the LORD loves his people, he made you their king." Hiram, eze Taịa zighachiiri Solomọn akwụkwọ ozi sị ya. “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị hụrụ ndị ya nʼanya ka o ji mee gị eze ha.”
12 Huram said: "Blessed be the LORD, God of Israel, maker of heaven and earth! He gave King David a wise son with insight and understanding, to build a house for the LORD and a royal palace for himself. Hiram kwukwara sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye kere eluigwe na ụwa. Onye nyere Devid, bụ eze, nwa nwere nghọta na akọnuche dị otu a, iwuru Onyenwe anyị ebe obibi, na iwukwa ụlọeze nke aka ya.
13 Now I am sending you a skilled craftsman, gifted with understanding, Huram-abi, “Ana m ezitere gị Huram-Abi, onye ọka maara ọrụ ya nke ọma.
14 son of a woman of Dan's daughters, his father a man of Tyre—skilled in gold, silver, bronze, iron, stone, wood, purple, blue, and crimson yarn, and fine linen. He can do any engraving and carry out any design assigned to him, working with your craftsmen and those of my lord David, your father. Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị.
15 So let my lord send his servants the wheat, barley, oil, and wine he promised, “Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa.
16 and we'll cut all the timber you need from Lebanon, float it to you as rafts by sea to Joppa, and you can haul it up to Jerusalem." Anyị ga-egbutu osisi niile ị chọrọ site nʼugwu Lebanọn, sitekwa nʼosimiri budata ha obodo Jopa, ebe i nwere ike isite buruo ha Jerusalem.”
17 Solomon counted all the foreigners residing in the land of Israel, as his father David had; they numbered 153,600. Emesịa, Solomọn gụrụ ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel ọnụ, dịka Devid mere, achọpụtara na ha dị narị puku iri ise na atọ, na narị isii (153,600).
18 He assigned 70,000 as carriers, 80,000 as stonecutters in the mountains, and 3,600 as overseers to keep the people working. O mere iri puku ndị ọrụ asaa (70,000) nʼime ha ka ha bụrụ ndị na-ebu ibu, na ọnụọgụgụ dị iri puku asatọ (80,000) ka ha bụrụ ndị ga-awa nkume, meekwa puku ndị ikom atọ na narị isii (3,600), ndị ga-abụ ndịisi ọrụ ime ka ọrụ na-aga nke ọma.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]