Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 1 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Solomon son of David strengthened his hold on his kingdom; our Father was with him, making him very great. Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne.
2 Solomon spoke to all Israel—the commanders of thousands and hundreds, the judges, and every leader in Israel, the family heads. Mgbe ahụ, Solomọn gwara ndị Izrel niile okwu, ya bụ, ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndị ikpe, na ndị ndu niile nọ nʼIzrel, na ndịisi ezinaụlọ niile.
3 Solomon and the whole assembly went to the high place at Gibeon, where our Father's tent of meeting stood, which Moses, our Father's servant, made in the wilderness. Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị wuru nʼọzara.
4 But David had brought the ark of our Father up from Kiriath-jearim to the place he prepared for it, pitching a tent for it in Jerusalem. Ma Devid esitelarị na Kiriat Jearim buputa igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, bulaa ya nʼụlọ ikwu nke o wuru maka ya na Jerusalem.
5 The bronze altar Bezalel son of Uri, son of Hur, made was there before the tabernacle of our Father; so Solomon and the assembly sought our Father there. Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ.
6 Solomon went up to the bronze altar before our Father at the tent of meeting and offered 1,000 burnt offerings on it. Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya.
7 That night our Father appeared to Solomon and said to him, "Ask what I should give you." Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
8 Solomon said to our Father, "You showed great covenant love to David my father, and made me king in his place. Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya
9 Now, my Father, confirm your promise to my father David, for you made me king over a people as many as the earth's dust. Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala.
10 Give me wisdom and knowledge now to lead this people, for who can govern this great people of yours?" Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
11 Our Father said to Solomon, "Because this was in your heart—you asked not for riches, wealth, or honor, nor your enemies' lives, nor long life, but for wisdom and knowledge to govern my people, over whom I made you king, Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha.
12 wisdom and knowledge are given you. I will also give you riches, wealth, and honor no king before you had, and none after you will." Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.”
13 So Solomon went from Gibeon's high place, from before the tent of meeting, to Jerusalem, and reigned over Israel. Mgbe ahụ, Solomọn sitere nʼebe dị elu nke Gibiọn, site nʼihu ụlọ nzute ahụ, lọghachi na Jerusalem. Ọ chịrị dịka eze nʼIzrel.
14 Solomon gathered chariots and horsemen; he had 1,400 chariots and 12,000 horsemen, which he stationed in the chariot cities and with the king in Jerusalem. Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
15 In Jerusalem the king made silver and gold like stones, and cedar as plentiful as foothill sycamore-figs. Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche
16 Solomon's horses came from Egypt and Kue; the king's traders bought them from Kue at market price. A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
17 They imported a chariot from Egypt for about fifteen pounds of silver, a horse for about four; through them they exported these to all the kings of the Hittites and Aram. Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii; jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]