Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 21 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jehoshaphat rested with his ancestors, buried with them in the City of David; his son Jehoram reigned instead. Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2 Jehoram's brothers, sons of Jehoshaphat: Azariah, Jehiel, Zechariah, Azariah, Michael, Shephatiah. All these were sons of Jehoshaphat king of Israel. Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel.
3 Their father gave them many gifts—silver, gold, precious things—and fortified cities in Judah, but gave the kingdom to Jehoram, because he was firstborn. Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya.
4 Once Jehoram rose over his father's kingdom, he grew strong and killed all his brothers with the sword, and also some of Israel's officials. Mgbe Jehoram mere onwe ya ka o guzosie ike nʼebe alaeze nna ya dị, o weere mma agha gbuo ụmụnne ya ndị ikom niile, tinyere ụfọdụ nʼime ndịisi Izrel.
5 Jehoram was thirty-two years old when he became king, and he reigned eight years in Jerusalem. Jehoram gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem.
6 He walked in the way of Israel's kings, as Ahab's house had done, for Ahab's daughter was his wife, and he did evil in our Father's eyes. O soro ụzọ ndị eze Izrel, dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
7 Yet our Father would not destroy the house of David, because of the covenant he made with David, and his promise to give him and his sons a lamp forever. Ma nʼagbanyeghị nke a, Onyenwe anyị achọghị ibibi ụlọ Devid, nʼihi ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị na Devid nwere. Nʼihi na o kwere ya nkwa ime ka oriọna dịịrị ya na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
8 In Jehoram's days Edom rebelled against Judah's rule and set up their own king. Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.
9 Jehoram crossed with his commanders and all his chariots. He rose at night and struck the Edomites surrounding him and the chariot commanders. Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu.
10 Edom rebelled against Judah's rule to this day; Libnah also rebelled then, because he had abandoned our Father, the God of his ancestors. Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ya ha azụ.
11 He built high places on Judah's hills, led Jerusalem's people to prostitute themselves, and drew Judah astray. O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda.
12 A letter came to him from Elijah the prophet: Your Father, God of your ancestor David, says: Because you haven't walked in the ways of your father Jehoshaphat, or the ways of Asa king of Judah, Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị: “Otu a ka Onyenwe anyị Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda,
13 but walked like Israel's kings, led Judah and Jerusalem's people to be unfaithful, as Ahab's house led Israel, and killed your brothers—your father's house—men better than you, kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị.
14 now your Father will strike your people, children, wives, and all your goods with a great plague. Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere.
15 You will have a severe intestinal disease, until day by day your intestines come out. Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’ ”
16 Our Father stirred up against Jehoram the spirit of the Philistines and Arabs near the Cushites. Onyenwe anyị mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha.
17 They attacked Judah, invaded it, and seized all the goods found in the king's palace, plus his sons and wives, leaving him no son except Jehoahaz, his youngest. Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ.
18 After all this, our Father struck him with an incurable disease in his intestines. Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Onyenwe anyị mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram.
19 In time, after two years, his intestines came out because of his disease, and he died in agony. His people made no fire for him, as they had for his ancestors. Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze.
20 He was thirty-two when crowned king; he reigned eight years in Jerusalem. He died unmourned, buried in the City of David, but not among the kings' tombs. Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]