Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 22 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 The people of Jerusalem made his youngest son Ahaziah king in his place, since the raiders who came with the Arabs into the camp had killed all the older sons. So Ahaziah son of Jehoram king of Judah became king. Ndị Jerusalem mere Ahazaya, nwa Jehoram nke nta, eze nʼọnọdụ ya, nʼihi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike, bụ ndị ha na ndị Arab so bata nʼụlọ ikwu ha, egbuolarị ụmụnne ya ndị okenye. Ya mere Ahazaya, nwa Jehoram bụ eze Juda malitere ịchị.
2 Ahaziah became king at twenty-two and reigned one year in Jerusalem. His mother was Athaliah, granddaughter of Omri. Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya nwa nwa Omri eze Izrel.
3 He too followed the ways of Ahab's house, for his mother counseled him to do evil. Ya onwe ya sokwara ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, nʼihi na nne ya gbara ya ume ime ajọ omume.
4 He did evil in our Father's eyes, like Ahab's house, for after his father's death they were his counselors, to his ruin. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere nʼihi na ha ghọrọ ndị ndụmọdụ ya mgbe nna ya nwụsịrị, nke a wetara ọdịda ya.
5 He followed their advice too, joining Joram son of Ahab, Israel's king, to fight Hazael king of Aram at Ramoth-gilead, where the Arameans wounded Joram. O gbasokwara ndụmọdụ ha, mgbe o sooro Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ịga buso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ,
6 So he returned to Jezreel to recover from the wounds he received at Ramah fighting Hazael king of Aram. Ahaziah son of Jehoram king of Judah went down to Jezreel to see Joram son of Ahab, because he was wounded. ya mere, ọ lọghachitere na Jezril ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ha merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram, eze Juda gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
7 Ahaziah's downfall came from our Father when he visited Joram. On arriving, he went out with Jehoram against Jehu son of Nimshi, whom our Father had anointed to destroy the house of Ahab. Ọ bụ site na nleta Ahazaya gara leta Joram, ka Chineke si weta ọdịda Ahazaya. Mgbe Ahazaya bịarutere, ya na Joram pụrụ ịga zute Jehu nwa Nimshi, onye ahụ Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ laa ezinaụlọ Ehab nʼiyi.
8 As Jehu carried out judgment on Ahab's house, he found Judah's officials and Ahaziah's nephews who served Ahaziah, and killed them. Mgbe Jehu nọ na-emezu ihe e kpebiri nʼikpe banyere ezinaụlọ Ehab, o zutere ndị ozi Juda na ụmụ ndị ikom ụmụnne Ahazaya, ndị na-ejere Ahazaya ozi, gbuo ha niile.
9 He searched for Ahaziah, who was captured while hiding in Samaria. They brought him to Jehu and killed him, then buried him, saying, "He is Jehoshaphat's son, who sought our Father with all his heart." So Ahaziah's house had no one strong enough to hold the kingdom. Ọ pụrụ ịchọ Ahazaya. Ndị ozi ya jidere ya ebe o zoro onwe ya na Sameria. Ha kpụtaara ya Jehu onye gburu ya. Ha liri ya, nʼihi na ha kwuru sị, “Nwa Jehoshafat ka ọ bụ, onye jiri obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị.” Ya mere, o nwekwaghị onye dị ike nʼụlọ Ahazaya ijide alaeze ahụ.
10 When Athaliah, Ahaziah's mother, saw her son was dead, she set out to destroy all the royal offspring of Judah's house. Mgbe Atalaya, nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze, bụ ndị ezinaụlọ eze Juda.
11 But Jehoshabeath the king's daughter took Joash son of Ahaziah, stealing him from among the royal sons about to be killed, and hid him with his nurse in a bedroom. So Jehoshabeath, King Jehoram's daughter, Jehoiada the priest's wife and Ahaziah's sister, hid him from Athaliah, so she did not kill him. Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, kuuru Joash nwa Ahazaya zopu ya site nʼetiti ụmụ eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina. Nʼihi na Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, bụ nwanne Ahazaya, ma bụrụkwa nwunye Jehoiada onye nchụaja, ya mere o jiri zonarị Atalaya nwantakịrị ahụ, ka ọ ghara igbu ya.
12 He stayed hidden with them in the house of our Father six years while Athaliah reigned over the land. Ya na ha nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Chineke, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]