Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 23 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 In the seventh year Jehoiada took courage and made a covenant with the commanders of hundreds—Azariah son of Jeroham, Ishmael son of Jehohanan, Azariah son of Obed, Maaseiah son of Adaiah, and Elishaphat son of Zichri. Nʼafọ nke asaa, Jehoiada gosiri ịdị ike nke obi ya. Ya na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha gbara ndụ. Ndị a bụ: Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohanan, Azaraya nwa Obed, Maaseia nwa Adaya na Elishafat nwa Zikri.
2 They traveled through Judah, gathered the Levites from all its cities and the family heads of Israel, and came to Jerusalem. Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem,
3 The whole assembly made a covenant with the king in the house of our Father. Jehoiada told them, "Look, the king's son will reign, as our Father promised about David's sons. ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid.
4 Do this: a third of you—priests and Levites entering on the Sabbath—will be gatekeepers at the thresholds. Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche.
5 A third at the king's house, a third at the Gate of the Foundation, and all the people in the courts of the house of our Father. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ Onyenwe anyị.
6 Let no one enter the house of our Father except the priests and the serving Levites; they may enter, for they are holy. Everyone else is to keep guard for our Father. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu Onyenwe anyị, ghara ịbata.
7 The Levites must surround the king, each with weapon in hand; whoever enters the house is to be put to death. Stay with the king wherever he comes and goes." Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”
8 The Levites and all Judah did exactly as Jehoiada the priest commanded. Each took his men—those coming on duty the Sabbath with those going off—since Jehoiada the priest did not dismiss any of the divisions. Ndị Livayị na ndị ikom Juda niile mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike ma ndị na-emechi ọrụ. Nʼihi na Jehoiada onye nchụaja ezipụghị otu ọbụla nʼime ndị ọrụ ahụ niile.
9 Jehoiada the priest gave the commanders of hundreds King David's spears and large and small shields, kept in our Father's house. O nyere ndị ọchịagha ahụ na-elekọta narị ndị agha, ùbe na ọta ukwu na ọta nta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, bụ ndị dị nʼụlọnsọ Chineke.
10 He stationed all the people, each with weapon in hand, from the south side of the temple to the north side, surrounding the altar, the temple, and the king. O guzobere ndị ikom niile ahụ, onye ọbụla ji ngwa agha ya nʼaka ya, nọdụ eze gburugburu na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu ahụ. Site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
11 They brought out the king's son, crowned him, gave him the covenant law, and made him king. Jehoiada and his sons anointed him and shouted, "Long live the king!" Jehoiada na ụmụ ya ndị ikom kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, ha nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze, tie mkpu sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
12 Hearing the sound of people running and praising the king, Athaliah came to them at our Father's house. Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị mmadụ, ndị na-agba ọsọ na-eto eze, ọ gakwuru ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
13 She looked—there was the king standing by his pillar at the entrance, officers and trumpeters beside him, all the people of the land rejoicing and blowing trumpets, singers with instruments leading the praise. Then Athaliah tore her clothes and shouted, "Treason! Treason!" O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi ya dị na mbata. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze, ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Ndị ọbụ abụ jikwa iti egwu na-edu nʼabụ otuto. Mgbe ahụ, Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nke a bụ nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”
14 Jehoiada the priest summoned the commanders of hundreds over the army and said, "March her out through the ranks; kill with the sword anyone who follows her." For the priest had said, "Do not kill her in the house of our Father." Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.”
15 They seized her; when she reached the Horse Gate's entrance by the king's house, they killed her there. Ya mere, ha jidere ya mgbe o rutere na mbata nke ọnụ ụzọ ịnyịnya nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha gburu ya.
16 Then Jehoiada made a covenant among himself, all the people, and the king to be our Father's people. Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị.
17 All the people went to Baal's temple and tore it down, smashed its altars and idols, and killed Mattan, Baal's priest, before the altars. Ndị niile ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
18 Jehoiada put the Levite priests in charge of our Father's house, whom David had assigned there, to offer burnt offerings to our Father, as written in Moses' law, with joy and song as David had ordered. Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke Onyenwe anyị nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu.
19 He stationed gatekeepers at the gates of our Father's house so no one unclean in any way could enter. O debekwara ndị nche nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, igbochi ka onye ọbụla nke na-adịghị ọcha nʼụzọ ọbụla ghara ịbanye.
20 He took the commanders of hundreds, the nobles, the rulers of the people, and all the people of the land, and brought the king down from the house of our Father, through the Upper Gate into the king's house, and seated him on the royal throne. Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị a na-asọpụrụ, na ndị na-achị achị, na ndị ala ahụ niile, dupụta eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha bara nʼụlọeze site nʼọnụ ụzọ ama nke dị Elu, mee ka eze nọkwasị nʼelu ocheeze.
21 All the people of the land rejoiced, and the city grew calm, for Athaliah was killed with the sword. Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]