Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 24 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Joash became king at seven, and reigned forty years in Jerusalem. His mother Zibiah was from Beersheba. Joash gbara afọ asaa mgbe e mere ya eze, ọ chịrị iri afọ anọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba.
2 Joash did what was right in our Father's eyes all the days of Jehoiada the priest. Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị nʼafọ niile nke Jehoiada bụ onye nchụaja, dị ndụ.
3 Jehoiada chose two wives for him, and Joash had sons and daughters. Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
4 Some time later, Joash set his heart on restoring the house of our Father. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị ọhụrụ.
5 He gathered the priests and Levites, told them, "Go to Judah's cities, collect money from all Israel yearly to repair your Father's house—hurry." But the Levites didn't hurry. Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa.
6 The king summoned Jehoiada the chief priest: "Why haven't you required the Levites to bring the tax from Judah and Jerusalem that Moses, our Father's servant, and the assembly set on Israel for the tent of testimony?" Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu Onyenwe anyị na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?”
7 Athaliah's sons, that wicked woman, broke into our Father's house and even used all the holy things of our Father's house in worship of the Baals. Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe Onyenwe anyị dị nʼime ya maka Baal.
8 At the king's order, they made a chest and set it outside our Father's house gate. Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
9 They announced in Judah and Jerusalem: bring our Father the tax Moses, our Father's servant, set on Israel in the wilderness. A kpọsara ya na Juda na Jerusalem niile sị ka ha wetara Onyenwe anyị ụtụ nke Mosis ohu Chineke kwagidere ụmụ Izrel nʼọzara na ha ga na-atụ.
10 All the officials and all the people rejoiced, bringing and dropping their gifts into the chest until full. Ndịisi na ndị mmadụ niile jiri obi ụtọ tụta ụtụ ha. Ha jiri onyinye ha bịa tụnye ha nʼigbe onyinye ahụ, tutu rụọ mgbe o juru nʼọnụ.
11 Whenever the Levites brought the chest to the king's officials and saw it full of money, the royal secretary and chief priest's officer emptied it and returned it to its place. Daily they collected much money. Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu.
12 The king and Jehoiada gave it to workers on our Father's house, who hired masons and carpenters to restore it, and iron and bronze workers to repair our Father's house. Eze na Jehoiada weere ego ahụ niile nyefee ha nʼaka ndị ọrụ ụlọ Onyenwe anyị dị nʼaka, ha chọtara ndị ọka na-edo nkume, na ndị ọkpọ ǹtu. Ha tinyere ọrụ ime ka ụlọnsọ ahụ dị ọhụrụ nʼaka ndị a. Ha gokwara ndị ụzụ bịara kpụọ ihe niile gbasara bronz na igwe e ji rụọ ọrụ ahụ.
13 Workers labored; repair progressed by their hands. They restored our Father's house to its form and strengthened it. Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa.
14 When finished, they brought the rest of the money to the king and Jehoiada, making from it articles for our Father's house: vessels for service and burnt offerings, dishes, gold and silver vessels. They offered burnt offerings in our Father's house continually, all Jehoiada's lifetime. Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye Onyenwe anyị ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ.
15 Jehoiada grew old and full of years, then died; at his death he was 130 years old. Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ.
16 They buried him in the City of David among the kings, for doing good in Israel toward our Father and his house. E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya.
17 After Jehoiada died, Judah's officials came and bowed to the king, and he listened to them. Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị.
18 They abandoned our Father's house, God of their ancestors, served Asherah poles and idols—so anger came on Judah and Jerusalem for this guilt. Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem.
19 Yet our Father sent them prophets to bring them back to himself; they warned them, but they wouldn't listen. Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị.
20 Then the Spirit of our Father came on Zechariah son of Jehoiada the priest. He stood before the people and said, "This is what our Father says: Why break his commands? You won't succeed—you abandoned him, so he abandons you." Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ”
21 They conspired against him, stoning him in our Father's house courtyard at the king's command. Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
22 King Joash forgot the kindness Zechariah's father Jehoiada had shown him and killed his son. As Zechariah was dying he said, "May our Father see and require it." Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.”
23 At the turn of the year Aram's army attacked Joash, invaded Judah and Jerusalem, killed all the people's officials, sent all their plunder to Damascus's king. O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike.
24 Though Aram's army came with few men, our Father gave a much larger army into their hand, since Judah abandoned our Father, the God of their ancestors. So judgment fell on Joash. Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, Onyenwe anyị raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash.
25 When the Arameans left, leaving him badly wounded, his servants conspired against him for the blood of Jehoiada the priest's son, killing him on his bed. He died and was buried in the City of David, not in the kings' tombs. Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze.
26 Conspirators against him: Zabad son of Shimeath, Ammonite woman, and Jehozabad son of Shimrith, Moabite woman. Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab.
27 His sons, the many prophecies against him, and rebuilding our Father's house are written in the Book of the Kings' commentary; his son Amaziah reigned in his place. Ihe niile gbasara Joash na ụmụ ya, na amụma niile e buru banyere ya, na otu e si wuzie ụlọnsọ ukwu Chineke, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel niile. Mgbe Joash nwụrụ, Amazaya nwa ya ghọrọ eze Juda.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]