Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 25 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Amaziah became king at twenty-five and reigned twenty-nine years in Jerusalem. His mother was Jehoaddan of Jerusalem. Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze, ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Nne ya bụ Jehoadin onye Jerusalem.
2 He did what was right in the eyes of our Father, but not wholeheartedly. O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o jighị obi ya niile mee nke a.
3 Once the kingdom was firmly his, he executed the servants who had killed his father the king. Mgbe alaeze guzosiri ike nʼokpuru ọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya.
4 But he did not put their children to death, as written in the Law, the book of Moses, where our Father commanded, "Parents must not die for their children, nor children for their parents; each dies for his own sin." Ma o meghị ka ụmụ ha nwụọ, kama ọ gbasoro usoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Ndị mụrụ ụmụ agaghị anwụ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”
5 Amaziah gathered Judah, organized them by ancestral houses under commanders of thousands and hundreds, for all Judah and Benjamin. He counted those twenty and up: 300,000 chosen men fit for war, handling spear and shield. Amazaya kpọkọtara ndị Juda, guzo ha dịka ezinaụlọ ha si dị, kenye ha nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndị na-achị ọtụtụ narị ndị agha, bụ ndị Juda na ndị Benjamin niile. Mgbe ọ gụrụ ndị dị afọ iri abụọ maọbụ karịa ọnụ, ọ chọpụtara na ha dị narị puku ndị ikom atọ ndị tozuru iji ùbe na ọta buo agha.
6 He also hired 100,000 strong warriors from Israel for about 7,500 pounds of silver. O ji narị talenti ọlaọcha gota narị puku ndị agha site nʼala Izrel.
7 A man of our Father came to him: "King, don't let Israel's army go with you, for our Father is not with Israel—all these Ephraimites. Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na Onyenwe anyị anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem.
8 Even if you fight bravely, our Father will overthrow you before the enemy, for our Father has power to help or overthrow." A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.”
9 Amaziah asked the man of our Father, "But what about the roughly 7,500 pounds of silver I gave Israel's troops?" He replied, "Our Father can give you far more than this." Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?” Onye nke Chineke ahụ zara, “Onyenwe anyị pụrụ inye gị karịa nke ahụ.”
10 So Amaziah sent home the troops that came to him from Ephraim. They burned with anger against Judah and returned home enraged. Amazaya zighachiri ndị agha Izrel ahụ azụ ka ha laa, bụ ndị a si nʼIfrem bịakwute ya. Ha were iwe nke ukwuu megide Juda, jirikwa oke iwe laghachi nʼụlọ ha.
11 But Amaziah took courage, led out his people to the Valley of Salt, and struck down 10,000 men of Seir. Amazaya duuru ndị agha ya gaa na Ndagwurugwu Nnu, ebe o gburu ndị ikom Sia dị puku iri.
12 Judah's men also captured 10,000 alive, took them to the cliff top, and threw them down, smashing them all to pieces. Ndị agha Juda nwudoro puku ndị ikom iri ọzọ na ndụ, duru ha gaa nʼelu nkume dị elu, si nʼebe ahụ tụda ha niile, nke mere na ha niile kụpịasịrị.
13 Meanwhile the troops Amaziah sent back, not letting them join the battle, raided Judah's cities from Samaria to Beth-horon, struck down 3,000 people, and carried off much plunder. Ma ndị agha ahụ Amazaya zilagara, ka ha ghara iso ya gaa agha, wakporo ọtụtụ obodo ndị Juda site na Sameria ruo Bet-Horon. Ha gburu puku mmadụ atọ nʼime ha, bukọrọkwa ọtụtụ ihe nkwata nʼagha, buru ha laa.
14 After Amaziah defeated the Edomites, he brought back the gods of Seir's people, set them up as his own gods, bowed to them, and burned offerings to them. Mgbe Amazaya sitere nʼagha ebe o gburu ọtụtụ ndị Edọm lọta, o bulatara chi nke ndị Sia. O guzobere ha dịka chi ndị nke aka ya, kpọọ isiala nye ha ma surekwa aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ha.
15 So our Father's anger burned against Amaziah, and he sent a prophet, who asked, "Why seek this people's gods, which couldn't save their own from your hand?" Iwe Onyenwe anyị dị ukwuu megide Amazaya. O zigaara ya onye amụma, onye sịrị, “Nʼihi gịnị ka iji ajụ ase site nʼaka chi nke ndị ahụ, bụ ndị na-enweghị ike ịzọpụta ndị ha site nʼaka gị?”
16 As he spoke, the king said, "Did we make you the king's counselor? Stop! Why be killed?" The prophet stopped but said, "I know our Father has determined to destroy you, because you did this and ignored my counsel." Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ ya, eze sịrị ya; “Mechie ọnụ! Ị chọrọ ịnwụ? Ole mgbe ka anyị mere gị onye na-adụ eze ọdụ?” Ya mere, onye amụma ahụ kwụsịrị, ma sị, “Amaara m na Chineke ekpebiela ịla gị nʼiyi, nʼihi na i mere nke a ma jụkwa ige ntị na ndụmọdụ m.”
17 Amaziah king of Judah consulted his advisers, then sent to Joash son of Jehoahaz, son of Jehu, king of Israel: "Come, let us face each other in battle." Emesịa, mgbe Amazaya, eze Juda gbachara izu ya na ndị ndụmọdụ ya, o zigara Jehoash nwa Jehoahaz, nwa Jehu, eze Izrel ozi ịma aka, sị, “Bịa ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
18 Joash king of Israel answered Amaziah king of Judah: "A Lebanon thistle sent to a Lebanon cedar, saying, 'Give your daughter to my son as wife.' But a wild Lebanon beast passed and trampled the thistle. Ma Jehoash eze Izrel, zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda, sị; “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ zọpịa uke ahụ.
19 You said, 'Look, I have struck down Edom,' and your heart grew proud, boasting. Stay home. Why court disaster and fall—you and Judah with you?" Ị na-asị onwe gị, na i meriela Edọm, ugbu a, mpako abatala, isi a na-ebu gị. Ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
20 But Amaziah wouldn't listen—this was from our Father, to hand them over for seeking Edom's gods. Ma Amazaya egeghị ntị, nʼihi na Chineke na-akwado inyefe ya nʼaka Jehoash onye iro ha, nʼihi na ha chọrọ chi ndị Edọm gawa.
21 So Joash king of Israel marched up, and he and Amaziah king of Judah faced off at Beth-shemesh in Judah. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha. Ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda.
22 Judah was defeated by Israel, and everyone fled to his own home. Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
23 Joash king of Israel captured Amaziah king of Judah, son of Joash, son of Jehoahaz, at Beth-shemesh, took him to Jerusalem, and broke down its wall from the Ephraim Gate to the Corner Gate—about 600 feet. Jehoash, bụ eze Izrel nwudere Amazaya eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash duuru ya bịa na Jerusalem, kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii.
24 He took all the gold, silver, and articles found in the house of our Father in Obed-edom's care, plus the palace treasures and hostages, and returned to Samaria. Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Chineke, nke e tinyere nʼaka Obed-Edọm ilekọta, tinyekwara akụ niile dị nʼụlọeze. Ọ dọọrọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
25 Amaziah son of Joash, king of Judah, lived fifteen years after Joash son of Jehoahaz, king of Israel, died. Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị.
26 The rest of Amaziah's acts, first to last, are they not written in the Book of the Kings of Judah and Israel? Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel?
27 After Amaziah turned from following our Father, they conspired against him in Jerusalem, and he fled to Lachish. But they sent men after him there and killed him. Site nʼoge Amazaya gbakụtara Onyenwe anyị azụ, ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem. Ọ gbapụrụ gbalaga Lakish, ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ.
28 They brought him back on horseback and buried him with his ancestors in the City of Judah. Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha nʼobodo Juda.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]