Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 26 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Then all the people of Judah made Uzziah, sixteen years old, king in place of his father Amaziah. Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii.
2 He rebuilt Eloth and restored it to Judah after the king rested with his ancestors. Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ.
3 Uzziah became king at sixteen and reigned fifty-two years in Jerusalem. His mother was Jecoliah of Jerusalem. Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem.
4 He did what was right in our Father's eyes, just as his father Amaziah had done. O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
5 He devoted himself to seeking our Father in Zechariah's days, who taught him to fear our Father; and while he sought our Father, he prospered. Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu.
6 He went out and fought the Philistines, tearing down the walls of Gath, Jabneh, and Ashdod. He built cities near Ashdod and among the Philistines. O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia.
7 Our Father helped him against the Philistines, the Arabs of Gur-baal, and the Meunites. Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim.
8 The Ammonites paid tribute to Uzziah, and his fame reached the border of Egypt, for he had grown very strong. Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu.
9 Uzziah built towers in Jerusalem at the Corner Gate, the Valley Gate, and the Angle, and fortified them. O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike.
10 He built desert towers and dug many cisterns, for he had large herds in the lowlands and plain. He kept farmers and vinedressers in the hills and fertile fields, for he loved the soil. O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.
11 Uzziah had an army of trained soldiers going out to war by divisions, numbered by Jeiel the secretary and Maaseiah the officer, under Hananiah, one of the king's commanders. Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha.
12 The total number of clan leaders commanding the mighty warriors was 2,600. Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600.
13 Under their command was an army of 307,500, trained to make war with great power, to help the king against his enemies. Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya.
14 Uzziah equipped the whole army with shields, spears, helmets, coats of armor, bows, and slingstones. Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ.
15 In Jerusalem he made devices invented by skilled men, set on the towers and corners to shoot arrows and hurl large stones. His fame spread far and wide, for he was helped wonderfully until he grew strong. O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike.
16 When Uzziah grew strong, his heart grew proud, leading to his ruin. He was unfaithful to our Father, entering the temple of our Father to burn incense on the incense altar. Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja.
17 Azariah the priest went in after him, with eighty courageous priests of our Father. Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja Onyenwe anyị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ.
18 They confronted King Uzziah, saying, "It is not for you, Uzziah, to burn incense to our Father, but for the priests, Aaron's descendants, dedicated to burn incense. Leave the sanctuary; you have been unfaithful, and this brings you no honor from our Father." Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.”
19 Uzziah became furious. With a censer in his hand to burn incense, as he raged at the priests, a defiling skin disease broke out on his forehead—there before the priests in the house of our Father, beside the altar of incense. Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu.
20 When Azariah the chief priest and all the priests turned to him and saw the disease on his forehead, they rushed him out, and he hurried to leave, because our Father had struck him. Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.
21 King Uzziah had the disease until his death. He lived in a separate house, still diseased, cut off from the house of our Father. His son Jotham ran the palace, governing the people of the land. Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.
22 The rest of Uzziah's acts, from first to last, the prophet Isaiah son of Amoz recorded. Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ.
23 Uzziah rested with his ancestors, buried near them in a burial field belonging to the kings, for they said, "He had a skin disease." His son Jotham reigned in his place. Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]