Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 20 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Later, Moabites and Ammonites, with some Meunites, came to make war on Jehoshaphat. Mgbe oge nta gasịrị, eze ndị Moab na nke ndị Amọn, na ndị ọzọkwa, bịara ibuso Jehoshafat na ndị Juda agha.
2 Messengers came and reported to Jehoshaphat, "A vast army comes against you from beyond the Dead Sea, from Edom, already at Hazazon-tamar" (En-gedi). Ụfọdụ ndị mmadụ bịara gwa Jehoshafat sị, “Lee, igwe usuu ndị agha na-abịa imegide gị site nʼEdọm, nakwa nʼofe osimiri Nnu (osimiri nwụrụ anwụ). Ha erutela Hazezọn Tama, ebe a na-akpọkwa En-Gedi.”
3 Jehoshaphat was afraid, so he set himself to seek our Father, and proclaimed a fast throughout Judah. Jehoshafat tụrụ egwu nke ukwuu, kpebiekwa ịchọ inyeaka Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, ọ kpọsara obubu ọnụ nye ndị Juda niile.
4 Judah gathered to seek our Father; from every town of Judah they came to seek him. Ndị Juda zukọtara ịchọ inyeaka Onyenwe anyị; nʼezie, ha sitere nʼobodo niile nke Juda bịa ịchọ ihu Onyenwe anyị.
5 Then Jehoshaphat stood up in the assembly of Judah and Jerusalem, in our Father's house, before the new courtyard. Mgbe ahụ, Jehoshafat guzoro nʼetiti nzukọ ndị Juda na Jerusalem nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ogige ọhụrụ ahụ,
6 He said: "O our Father, God of our ancestors, are you not our Father in heaven? You rule all kingdoms of nations. Power and might are in your hand; none can stand against you. sị; “O Onyenwe anyị, Chineke nna nna anyị ha, ọ bụghị gị bụ Chineke onye bi nʼeluigwe? Ọ bụkwa gị na-achị alaeze niile nke mba dị iche iche. Ike na ume dị nʼaka gị, ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzogide gị.
7 Our Father, didn't you drive out this land's people before your people Israel, giving it forever to Abraham your friend's descendants? O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke?
8 They have lived in it and have built you a sanctuary in it for your name, saying, Ha ebiela nʼime ya wukwaa ebe nsọ nʼime nye nʼAha gị na-asị,
9 if disaster comes on us—sword of judgment, plague, or famine—we'll stand before this house and before you, for your name is in this house, and cry out to you in our distress, and you'll hear and save. ‘Ọ bụrụ na ihe ọjọọ adakwasị anyị, maọbụ mma agha, ma nke ikpe ọmụma, maọbụ ajọọ ọrịa na-efe efe, maọbụ oke ụnwụ, anyị ga-eguzo nʼihu gị nʼụlọnsọ a nke a kpọkwasịrị Aha gị, kpọkuo gị nʼime nsogbu anyị, gị onwe gị ga-aza anyị, zọpụtakwa anyị.’
10 Now: Ammon, Moab, and Mount Seir—you would not let Israel invade them when they came from Egypt; Israel turned away from them and did not destroy them. “Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.
11 See how they repay us, coming to drive us from the possession you gave us to inherit. Lee ihe ha ji akwụ anyị ụgwọ bụ ịchọ ka ha chụpụ anyị nʼala a i nyere anyị ka ọ bụrụ ihe nketa anyị.
12 Our Father, won't you judge them? We're powerless against this vast army coming against us; we don't know what to do, but our eyes are on you." O Chineke anyị, ọ bụ na ị gaghị ekpe ha ikpe? Nʼihi na ike adịghị nʼime anyị iguzogide igwe mmadụ ndị a bara ụba na-abịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ na gị ka anya anyị na-adịkwasị.”
13 All Judah stood there before our Father, with their little ones, their wives, and their children. Ndị ikom Juda niile, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha, na ụmụntakịrị ha guzoro nʼihu Onyenwe anyị.
14 Then our Father's Spirit came on Jahaziel son of Zechariah, son of Benaiah, son of Jeiel, son of Mattaniah, a Levite of Asaph's line, amid the assembly. Mgbe ahụ, mmụọ Nsọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jahaziel nwa Zekaraya, nwa Benaya, nwa Jeiel, nwa Matanaya, bụ onye Livayị, onye si nʼikwu Asaf, dịka o guzo nʼetiti mkpọkọta ahụ.
15 He said: "Listen, all Judah, Jerusalem's residents, and King Jehoshaphat. This is what our Father says to you: Do not fear or be terrified by this vast army—the battle isn't yours but our Father's. Ọ sịrị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda niile na ndị bi na Jerusalem, na gị eze Jehoshafat. Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-asị unu. ‘Unu atụla ụjọ, maọbụ daa mba, nʼihi usuu ndị agha a niile dị unu nʼihu. Ọ bụghị unu ka agha a dịịrị, kama ọ bụ Chineke nwe ya.
16 Tomorrow go down against them: they're climbing the Ziz ascent; you'll find them at the valley's end, facing the Jeruel wilderness. Echi pụọnụ izute ha. Ha ga arịgota site nʼụzọ warawara nrigo Ziz, unu ga-ahụ ha na nsọtụ ndagwurugwu dị tupu e ruo nʼọzara Jeruel.
17 You won't need to fight this battle. Take your places, stand firm, and watch our Father rescue you, Judah and Jerusalem. Don't fear or lose heart. March out against them tomorrow, for our Father is with you.'" Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, Onyenwe anyị ga-anọnyekwara unu.’ ”
18 Jehoshaphat bowed face-down, and all Judah and Jerusalem's people fell in worship before our Father. Mgbe ahụ, Jehoshafat, na ndị Juda na ndị Jerusalem niile dara nʼala kelee Onyenwe anyị, kpọọ isiala nye ya.
19 Then the Levites from the Kohathites and Korahites stood to praise our Father, Israel's God, with a loud voice raised high. Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too Onyenwe anyị Chineke Izrel nʼabụ.
20 At dawn they went out to Tekoa's wilderness. As they went out, Jehoshaphat stood and said, "Hear me, Judah and people of Jerusalem. Trust your Father and you'll stand firm; trust his prophets and you'll succeed." Nʼisi ụtụtụ, ha pụrụ gawa nʼọzara Tekoa. Ma mgbe ha na-apụ, Jehoshafat guzoro ọtọ sị, “Geenụ m ntị, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem. Nweenụ okwukwe nʼime Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nwekwanụ ntụkwasị obi na ige ndị amụma ya ntị, ka ihe gaara unu nke ọma.”
21 After consulting the people, Jehoshaphat appointed singers to our Father to praise his holy splendor, marching ahead of the army: "Give thanks to our Father, for his faithful love endures forever." Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ Onyenwe anyị ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”
22 As they began to sing and praise, our Father set ambushes against the Ammonites, Moabites, and the people of Mount Seir who were attacking Judah, and they were struck down. Mgbe ndị Juda malitere ịbụ abụ na ito otuto, Onyenwe anyị cheere ndị agha Amọn na nke ndị Moab, na ndị nke si nʼugwu Sia nʼụzọ, merie ha.
23 Ammon and Moab turned against Mount Seir's people to destroy and annihilate them; once Seir's people were finished, Ammon and Moab turned and slaughtered each other. Ma ndị agha Amọn na Moab buru ụzọ lụso ndị agha si nʼugwu Sia ọgụ. Mgbe ha lakwara onwe ha nʼiyi, ọgụ dakwara nʼetiti ndị Moab na Amọn.
24 When Judah reached the wilderness lookout and looked toward the vast army, they saw only corpses fallen on the ground—no one had escaped. Mgbe ndị agha Juda rutere ebe ha ga-esi lepụ anya hụ ihe na-eme nʼọzara ahụ, ha lepụrụ anya ịhụ usuu ndị agha ahụ, ma ihe ha hụrụ bụ ozu ndị agha tọgbọcha nʼala. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị agha ahụ gbapụrụ na ndụ.
25 Jehoshaphat and his people came to plunder the dead, finding abundant goods, clothing, and valuables—too much to carry, so gathering it took three days. Ya mere Jehoshafat na ndị agha ya banyere nʼọgbọ agha ahụ kwakọrọ ihe nkwata nʼagha. Ha butere ọtụtụ ngwa agha, na uwe na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa ma ha enweghị ike ibutecha ihe niile. Ihe nkwata nʼagha hiri nne ruo na o were ha ụbọchị atọ ibutecha ha.
26 On day four, they gathered at the Valley of Beracah and praised our Father there—so it's named Valley of Beracah to this day. Nʼụbọchị nke anọ ha zukọtara na Ndagwurugwu Beraka ebe ha nọ too Onyenwe anyị otuto. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Beraka ruo taa.
27 All the men of Judah and Jerusalem, Jehoshaphat leading, returned there with joy, for our Father gave them joy over their enemies. Emesịa, Jehoshafat duuru ndị Juda na Jerusalem niile laghachi na Jerusalem nʼọṅụ, nʼihi na Onyenwe anyị emeelara ha ihe ha kwesiri iji ṅụrịa ọṅụ nʼebe ndị iro ha nọ.
28 They entered Jerusalem with harps, lyres, and trumpets, and went to the house of our Father. Ha ji une, na ụbọ akwara, na opi ike bata Jerusalem, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
29 Fear of our Father fell on all the surrounding kingdoms when they heard our Father fought Israel's enemies. Egwu Chineke dakwasịrị alaeze niile bi gburugburu, mgbe ha nụrụ otu Onyenwe anyị si lụọ ọgụ megide ndị iro Izrel niile.
30 So Jehoshaphat's kingdom was at peace, for his Father gave him rest on every side. Ya mere, udo dịrị nʼalaeze Jehoshafat, nʼihi na Chineke nyere ya udo.
31 Jehoshaphat reigned over Judah, crowned at thirty-five, twenty-five years in Jerusalem; his mother, Azubah daughter of Shilhi. Jehoshafat ghọrọ eze juda. Ọ gbara iri afọ atọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Ọ chịrị iri afọ abụọ na ise na Jerusalem. Aha nne ya bụ Azuba, nwa Shilhi.
32 He walked in his father Asa's ways, never turning aside, doing right in our Father's eyes. O jere ije nʼụzọ niile nke Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
33 Yet the high places stayed; the people still had not set their hearts on their ancestors' God. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ ka nọ na-ejighị obi ha niile tụkwasị na Chineke nke nna nna ha.
34 Jehoshaphat's other acts, first to last, are in Jehu son of Hanani's records, found in the Book of Kings of Israel. Ihe banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼọchịchị Jehoshafat, site na mbido ruo na ngwụcha, ka e dere nʼakwụkwọ ihe mere nke Jehu nwa Hanani, nke e debanyere nʼime akwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel.
35 Later Jehoshaphat king of Judah allied with Ahaziah king of Israel, who did evil. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jehoshafat, bụ eze Juda jikọrọ onwe ha na Ahazaya, eze Izrel, onye ahụ omume ya jọrọ njọ.
36 He joined with him to build a fleet of trading ships to go to Tarshish, built at Ezion-geber. Ha kwekọrịtara ka ha na ya wuo ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa. Emesịa, ha wuru ụgbọ ndị a nʼEziọn Geba.
37 Eliezer son of Dodavahu of Mareshah prophesied against Jehoshaphat: "For allying with Ahaziah, our Father broke your work apart." The ships wrecked and couldn't sail to Tarshish. Elieza nwa Dodavahu, onye Maresha buru amụma megide Jehoshafat, na-asị, “Nʼihi na i kwenyere ka gị na Ahazaya na-azụkọ ahịa, Onyenwe anyị ga-emebi ihe ndị a ị rụrụ.” Ụgbọ mmiri ahụ niile kpuru, ha enwekwaghị ike ijeru Tashish zụọ ahịa.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]