Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 19 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Jehoshaphat king of Judah returned safely to his house in Jerusalem. Mgbe Jehoshafat, eze Juda, laghachiri nʼụlọ ya na Jerusalem nʼudo.
2 Jehu son of Hanani the seer met King Jehoshaphat and asked, "Should you help the wicked and love those who hate our Father? For this, wrath from our Father is on you. Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ Onyenwe anyị asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla gị.
3 Still, good is found in you: you cleared the Asherah poles from the land and set your heart to seek our Father." Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.”
4 Jehoshaphat lived in Jerusalem, then went out again among the people, from Beersheba to Ephraim's hill country, turning them back to our Father, God of their ancestors. Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha.
5 He appointed judges in the land, in all the fortified cities of Judah, city by city. Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda.
6 He told the judges, "See what you do—you judge not for people but for our Father, and he is with you in every case you decide. Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.
7 Now let fear of our Father be on you. Watch and act, for with our Father there is no injustice, no favoritism, no bribery." Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”
8 Also in Jerusalem, Jehoshaphat appointed some Levites, priests, and heads of Israel's ancestral families to render the judgment of our Father and to settle disputes; they returned to Jerusalem. Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke Onyenwe anyị na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem.
9 He commanded them: "Act this way, in fear of our Father, faithfully and wholeheartedly. O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.
10 Whenever your brothers in their cities bring you a dispute—over bloodshed, or over law and commandment, statutes and rulings—warn them, so they don't incur guilt before our Father, bringing wrath on you and your brothers. Do this, and you will not incur guilt. Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie.
11 Now, Amariah the chief priest oversees you in every matter of our Father; Zebadiah son of Ishmael, leader of Judah's tribe, in every matter of the king. The Levites serve as officials before you. Be strong and act—may our Father be with those who do good." “Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]