Skip to content
The Believer's Library

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

2 Chronicles 18 OICB

Show OICB only
Verse × ×
1 Now Jehoshaphat had great riches and honor, and he allied himself with Ahab by marriage. Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab.
2 Some years later he went down to Ahab in Samaria, where Ahab slaughtered many sheep and oxen for him and for the people who were with him, urging him to attack Ramoth-gilead. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha.
3 Ahab king of Israel asked Jehoshaphat king of Judah, "Will you go with me to Ramoth-gilead?" He answered, "I am as you are, my people as yours; we join you in the war." Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?” Jehoshafat zaghachiri, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị nke m bụkwa ndị gị. Anyị ga-eso gị gaa agha.”
4 But Jehoshaphat said to the king of Israel, "First seek the word of our Father." Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ntụziaka Onyenwe anyị.”
5 So the king of Israel gathered the prophets, 400 men, and asked them, "Will we go to Ramoth-gilead for battle, or hold back?" They said, "Go up, for God will hand it over to the king." Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma dị narị ndị ikom anọ nʼọnụọgụgụ jụọ ha, sị, “Anyị a ga-ebuso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ha zara, “Gaa, nʼihi na Chineke ga-enyefe ha nʼaka eze.”
6 But Jehoshaphat said, "Is there not still a prophet of our Father here whom we can consult?" Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?”
7 Israel's king told Jehoshaphat, "One man remains through whom we can ask our Father, but I hate him—he never prophesies good about me, only bad. He is Micaiah son of Imlah." Jehoshaphat replied, "The king shouldn't say that." Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.”
8 Then the king of Israel summoned an officer and said, "Bring Micaiah son of Imlah quickly." Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.”
9 The king of Israel and Jehoshaphat king of Judah sat each on his throne, dressed in robes, on the threshing floor at the entrance of Samaria's gate, with all the prophets prophesying before them. Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha.
10 Zedekiah son of Chenaanah made iron horns and said, "God says: 'With these you will gore the Arameans until they are destroyed.'" Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ”
11 All the prophets prophesied the same, saying: "Go up to Ramoth-gilead and win; our Father will hand it to the king." Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe ya nʼaka eze.”
12 The messenger sent to summon Micaiah told him, "The prophets' words all favor the king. Let yours match theirs—speak favorably." Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.”
13 But Micaiah said, "As surely as our Father lives, I will say only what my Father says." Ma Maikaya sịrị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.”
14 When he came, the king said, "Micaiah, will we go to battle at Ramoth-gilead, or will I hold back?" He said, "Go up and win; they'll be handed to you." Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?” Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.”
15 But the king said to him, "How many times must I make you swear to tell me only the truth in the name of our Father?" Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”
16 Micaiah said, "I saw all Israel scattered on the mountains, like sheep without a shepherd. And our Father said, 'They have no master; let each return home in peace.'" Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu, ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ”
17 Israel's king said to Jehoshaphat, "Didn't I tell you he'd prophesy nothing good about me, only evil?" Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”
18 Micaiah said, "Then hear the word of our Father: I saw our Father seated on his throne, all heaven's armies standing at his right and left. Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị: Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.
19 And our Father said, 'Who will entice Ahab king of Israel to go up and fall at Ramoth-gilead?' One said this, another that. Ma Onyenwe anyị sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’ “Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ.
20 A spirit came forward, stood before our Father, and said, 'I will entice him.' And our Father asked him, 'How?' Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ “Onyenwe anyị jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’
21 He said, 'I will go out and be a lying spirit in the mouth of all his prophets.' Then our Father said, 'You will lure him and also prevail. Go out and do so.' “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’ “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’
22 So now, our Father has put a lying spirit in the mouth of these prophets of yours, and our Father has declared disaster against you." “Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”
23 Then Zedekiah son of Chenaanah came up, struck Micaiah on the cheek, and said, "Which way did the Spirit of God go from me to speak to you?" Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?”
24 Micaiah said, "You'll see it that day when you go into an inner room to hide." Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
25 The king of Israel said, "Take Micaiah back to Amon the city governor and to Joash the king's son, Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze.
26 and say, 'The king says: Put this man in prison on meager rations of bread and water until I return safely.'" Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ”
27 Micaiah said, "If you ever return safely, our Father has not spoken through me." Then he said, "Listen, all you people!" Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.”
28 So the king of Israel and Jehoshaphat king of Judah went up to Ramoth-gilead. Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead.
29 The king of Israel said to Jehoshaphat, "I will disguise myself and go into battle, but you wear your robes." So the king of Israel disguised himself, and they went into battle. Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.
30 The king of Aram had ordered his chariot captains, "Fight no one, small or great, but only the king of Israel." Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.”
31 When the chariot captains saw Jehoshaphat, they said, "That is Israel's king," and turned to fight him. But Jehoshaphat cried out, and our Father helped him, drawing them away from him. Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na Onyenwe anyị nyeere ya aka. Chineke wezugara ha site nʼebe ọ nọ,
32 When the chariot captains saw he was not Israel's king, they stopped chasing him. nʼihi na mgbe ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụso ya.
33 A man drew his bow at random and struck the king of Israel between the joints of his armor. He told his chariot driver, "Turn around and get me out of the fighting; I'm wounded." Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ ihe ikpuchi obi na uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m nʼihi na emerụọla m ahụ.”
34 The battle raged that day. Israel's king was held up in his chariot facing the Arameans until evening, then died at sunset. Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile. Eze Izrel guzobere onwe ya ka ọ kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu ruo uhuruchi. Ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.
FHB

Scripture from Father’s Heart Bible™. © 2026 Spirit Media Publishing, the imprint of Spirit Media Inc. All rights reserved. In Divine Voice™ Color, the words spoken by our Father show in blue, the words of the Son in red, and the words of the Spirit in purple.

OICB

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide.
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020 · Creative Commons - Attribution-ShareAlike [CC BY-SA]